Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Aịzaya 14:18 - Bible Nso

18 Eze nile nke mba nile, ọbuná ha nile, edinawo n'ala nime nsọpuru, onye ọ bula n'ulo-ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

18 Ndị eze mba niile dị iche iche na-edina na nsọpụrụ nʼime ili ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Aịzaya 14:18
11 Iomraidhean Croise  

Ha we je ilì ya: ma ha achọtaghi ihe ọ bula di n'aru-ya ma-ọbughi okpokoro-isi-ya, na ukwu-ya abua, na ọbu-aka-ya abua.


Ha we lìe ya n'obodo Devid n'etiti ndi-eze, n'ihi na o mere ezi ihe n'Israel, na n'ebe Chineke na ulo-Ya di.


Ma mb͕e ha siri n'ebe ọ nọ la, (n'ihi na ha rapuru ya n'ọtutu ọria,) ndi-orù-ya kekọtara onwe-ha imegide ya n'ihi ọbara umu Jehoiada, bú onye-nchu-àjà, b͕ue ya n'elu ihe-ndina-ya, o we nwua: ha we lìe ya n'obodo Devid, ma ha elìghi ya n'ílì ndi-eze.


Mu na ndi-eze na ndi-ndum-ọdu nke uwa, Ndi nēwuru onwe-ha nkpọnkpọ ebe;


N'ihi na amawom na ọ bu ọnwu ka I gēmem ka m'chigharikuru, Ru kwa ulo nzute nke diri ihe nile di ndu.


ọzọ, ha gātu egwu ihe di elu, ihe-ujọ di iche iche gādi kwa n'uzọ; osisi almond gāb͕ọwa kwa okoko-ya, ukpala gāghọ kwa ibu, ọchichọ gāgwu kwa: n'ihi na madu nāla n'ulo ebighi-ebi ya, ndi nēti aka n'obi ewe jegharia n'amá buruburu:


Ọ buru na nwoke amuta ọgu umu ise, di kwa ndu ọtutu arọ, ubọchi nke arọ-ya ewe ba uba, ma afọ adighi-eju nkpuru-obi-ya n'ezi ihe, ọzọ kwa, ọ dighi olìlì diri ya; asiwom, na nwa amukworo amukwo di nma kari ya:


nke mere elu-uwa dum madu bi ka ọ di ka ọzara, nke kwada-kwa-ra obodo-ya nile; nke nātọpughi ndi-nkpọrọ-ya ka ha la?


Ma gi onwe-gi, esiwo n'ílì-gi tupu gi dika alaka nke bu ihe-árú, yiri ndi eb͕uru eb͕u dika uwe, bú ndi ejiworo mma-agha dupú, ndi nāridaru nkume nke olùlù; dika ozu azọrọ ukwu.


Gini ka i nwere n'ebe a? ma-ọbu ònye ka i nwere n'ebe a, na i gwuwaworo ílì nye onwe-gi n'ebe a? ọ nēgwuwa ílì-ya n'elu, ọ nākàra onwe-ya ebe-obibi nime nkume di elu!


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan