N'ihi na Jehova nke usu nile nke ndi-agha nwere otù ubọchi nke gādakwasi ihe ọ bula di npako nke di kwa elu, ọ gādakwasi kwa ihe ọ bula ebuliworo elu; ewe me ya ka ọ di ala:
ka osisi nile nke miri we ghara idi elu n'ogologo-ha, ghara kwa itiye ọnu-ọnu-ha rue etiti alaka b͕ara ọhia, ka ndi-ha ndi di ike we ghara iguzo n'idi-elu-ha, bú ndi nile nāṅu miri: n'ihi na ha nile ka ewereworo nye ọnwu, ijeru ala di n'okpuru uwa, n'etiti umu nke madu, ijekuru ndi nārida n'olùlù.
Emerem ka mba nile me nkpatu site n'olu nke ọdida-ya, mb͕e M'mere ka ọ ridarue ala-mọ, ya na ndi nārida n'olùlù: ewe kasie osisi nile nke Iden obi n'ala di n'okpuru uwa, bú osisi arọputara arọputa kachasi kwa nma na Lebanon, ndi nile nke nāṅu miri.
ndi etiyere ílì nile ha na nsọtu nile nke olùlù, nkpọkọta ndi-ya di ílì-ya buruburu: ha nile bu ndi eb͕uru eb͕u, ndi daworo site na mma-agha, bú ndi mere ka ujọ di n'ala ndi di ndu.
Nganga nke obi-gi arafuwo gi, gi onye bi na nb͕awa nile nke nkume di elu, ebe di elu ka ebe-obibi-ya bu; onye nāsi n'obi-ya, Ònye gēme ka m'ridarue ala?
Gi onwe-gi kwa, Kapanaum, àgēweli gi rue elu-igwe? i gārida rue Hedis: n'ihi na asi na alururi ọlu nile di ike na Sọdọm nke aluru nime gi, ọ gānọgidewori rue ta.
Ewe jide anu-ọhia ahu, ya na onye-amuma ugha ahu nke nēme ihe-iriba-ama ahu n'iru ya, bú nke o ji duhie ndi natarari akàrà nke anu-ọhia ahu, na ndi nākpọ isi ala nye ihe-oyiyi-ya: ewe tubà ha abua na ndu nime ọdọ ọku ahu nke ji brimstone nēre: