Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Aịzaya 14:14 - Bible Nso

14 m'gārigo n'elu ebe nile di elu nke igwe-oji; m'gēyi Onye kachasi ihe nile elu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

14 Aga m arịgo nʼebe kachasị elu nke eluigwe, mee onwe m ka m dịrị ka Onye kachasị ihe niile elu.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Aịzaya 14:14
12 Iomraidhean Croise  

n'ihi na Chineke mara na n'ubọchi unu gēri nkpuru sitere na ya, mb͕e ahu ka agēmeghe anya-unu, unu ewe di ka Chineke, nāma ezi ihe na ihe ọjọ.


Ọ buru na nbuli-ya arigorue elu-igwe, Isi-ya ewe metu igwe-oji;


Ibu eboro ọzara nke oké osimiri. Dika oké ifufe nke di nime Negeb nēfebiga, n'ọzara ka o siworo bia, site n'ala di egwu.


Rida, we nọdu n'ájá, gi nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke, bú ada Babilon; nọdu n'ala ghara inwe oche-eze, gi ada ndi Kaldea: n'ihi na i gaghi-abu kwa onye ha nākpọ nwanyi di nrò nke di kwa pekepeke.


Ma ub͕u a nuru nka, gi nwanyi nēme ka o si tọ gi utọ, gi onye nānọ na ntukwasi-obi, nke nāsi n'obi-gi, Mu onwem nọ, ọ dighi kwa otù efu ọzọ di ma ewezuga nání mu onwem; m'gaghi-anọ dika nwanyi di-ya nwuru, m'gaghi-ama kwa ọb͕ub͕a-aka-umu:


Otú a ka Jehova siri: Le, M'gaje ikpọte ifufe nke nēbibi ebibi megide Babilon, na n'ebe ndi bi na Leb-kamai nọ.


Nwa nke madu, si onye-ndú Taia, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: N'ihi na obi-gi adiwo elu, i we si, Chi ka m'bu, n'ọnọdu Chineke ka m'nānọkwasi, n'etiti oké osimiri nile; ma gi onwe-gi bu madu, i bughi Chineke, i we do obi-gi ka obi Chineke:


N'ihi nka ka Onye-nwe-ayi Jehova ji si otú a: N'ihi na i di elu n'ogologo, na n'ihi na o tiyewo ọnu-ọnu-ya n'etiti alaka b͕ara ọhia, na n'ihi na obi-ya di elu n'idi-elu-ya;


Eze ahu gēme kwa ka o si tọ ya; ọ gēbuli kwa onwe-ya, me onwe-ya uku n'elu chi nile ọ bula, ọ bu kwa Chineke nke chi nile ka ọ gēkwu oké okwu di iche iche megide: ọ gāga-kwa-ra ya nke-ọma rue mb͕e oké iwe gāgwusi; n'ihi na ihe akara àkà gēme.


Ma ọ gaghi-atughari uche na chi nile nke nna-ya-hà, ma-ọbu n'ihe ahu ndinyom nāchọsi ike, ọ bu kwa na chi nile ọ bula ka ọ nāgaghi-atughari uche: n'ihi na n'elu ihe nile ka ọ gēme onwe-ya uku.


onye nēmegide nēweli kwa onwe-ya elu imegide ihe nile anākpọ Chineke ma-ọbu nke bu ihe anāsọpuru dika Chineke; ya mere ọ nānọdu n'ulo nsọ nke Chineke, nēgosi onwe-ya si na ya bu Chineke.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan