Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Aịzaya 13:7 - Bible Nso

7 N'ihi nke a-aka nile gākuda, obi ọ bula nke madu gālọ kwa ya miri:

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

7 Nʼihi nke a, aka ndị mmadụ ga-ada mba, obi ga-alọkwa ndị mmadụ mmiri.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Aịzaya 13:7
15 Iomraidhean Croise  

Ka ha b͕aze dika miri nke nērùghariri onwe-ya: Mb͕e o nēdo àkú-ya nile, ka ha di ka anēbipu ọnu-ha.


Mb͕e ahu ka obi lọrọ ndi-isi Edom miri: Ebulu nke Moab, ọma-jijiji nējide ha: Ndi nile bi na Kenean ab͕azewo.


Ibu eboro Ijipt. Le, n'igwe-oji nke nāb͕a ọsọ ka Jehova nānọkwasi dika inyinya, O we bia rue Ijipt: ihe-efu nile nke Ijipt gēme kwa nkpatu n'iru Ya, obi Ijipt gālọ kwa ya miri n'etiti ya.


Ndi bi nime ha we ghọ ndi aka-ha di nkpunkpu, ha turu ujọ, ihere we me ha; ha ghọrọ ihe-ọkukú nke ubi, na akwukwọ ahihia ndu, na ahihia nke elu-ulo, na ubi ọka tutu o tolite.


Umu-gi ndikom atubọwo atubọ, dina ala n'isi èzí nile, dika anigọ mara n'ọnyà; ha bu ndi juputara n'ọnuma Jehova, na ibasi-nba-ike Chineke-gi.


Eze Babilon anuwo ùdé-ha, aka-ya abua we kuda: ihe-nb͕u ejidewo ya, ihe-nb͕ali dika nke nwanyi ime nēme.


Ndi-dike Babilon arapuwo ibu agha, ha nọduru n'ebe nile ha ewusiri ike; idi-ike-ha alasiwo; ha aghọwo ndinyom: ndi-iro-ha esuyewo ọku n'ebe-obibi-ya nile; etijiwo ihe-ntuchi-ya nile.


Tie nkpu, kwasie ákwá ike, nwa nke madu: n'ihi na nke ahu di n'aru ndim, nke ahu di n'aru ndi-isi Israel: ndi arara nye mma-agha ka ha na ndim bu: n'ihi nka tie aka n'apata-ukwu-gi.


Ma ọ gēru, mb͕e ha gāsi gi, N'ìhi gini ka gi onwe-gi nēze ume? na i gāsi, Ọ bu n'ihi akukọ, n'ihi na ọ nābia: obi nile ọ bula gālọ kwa miri, aka nile gākuda, ike gāgwu mọ madu nile ọ bula, ikperè-ukwu nile gāghọ miri miri: le, ọ nābia, o ruwo kwa, ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.


Aka nile gākuda, ikperè nile gābu nání miri miri.


Ònye gēguzo n'iru oké iwe-Ya? ọ̀ bu kwa onye gēguzosi ike n'idi-ọku nke iwe-Ya? awusiwo ọnuma-Ya dika ọku, akwatuwo kwa oké nkume nile site na Ya.


Ọ bu ihe tọb͕ọrọ n'efu, na ihe awusiri dika miri, na ihe ab͕abara ọtọ: obi alọwo kwa miri, isu-ngọngọ nke ikperè abua di kwa, nb͕ali di kwa n'úkwù nile, iru ha nile achagharisiwo kwa.


Òle ebe ebe-obibi ọdum di? ebe-ita-nri ka ọ bu-kwa-ra umu-ọdum, ebe ọdum na nne-ọdum na nwa-ọdum jeghariri, ọ dighi kwa onye nēme ka ha ma jijiji.


Ma mb͕e ayi nuru ya, obi-ayi we lọ ayi miri, ọ dighi kwa mọ guzoro ọzọ nime nwoke ọ bula, n'ihi unu: n'ihi na Jehova, bú Chineke-unu, Ya onwe-ya bu Chineke n'elu-igwe di n'elu, na n'elu uwa di n'okpuru.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan