Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Aịzaya 13:5 - Bible Nso

5 Ha nēsi n'ala di anya abia, na nsọtu elu-igwe, bú Jehova na ihe-agha nile nke oké iwe-Ya, emebi ala nka nile.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

5 Ha si nʼobodo dị iche iche, nke dị anya na nke dị na nsọtụ ụwa na-abịa. Ha bu ngwa agha na-egosi oke iwe Onyenwe anyị na-abịa imebi ala ahụ niile.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Aịzaya 13:5
19 Iomraidhean Croise  

Ndi-dike esiwo aṅa da! Ihe-agha esiwo aṅa la n'iyì!


Ahuhu gādiri Asiria, bú ndele nke iwem, nkpa-n'aka ka ọ bu kwa n'aka-ha, bú oké iwem!


Le, M'nākpọte ndi Midia imegide ha, ndi nādighi-agu ọla ọcha n'ihe, ọla-edo kwa, ọ dighi-atọ ha utọ.


Le, Jehova nāb͕aba uwa ọtọ, Ọ nēme kwa ka ọ tọb͕ọrọ n'efu, Ọ nēkpùta kwa ya iru, me ka ndi bi nime ya b͕asa.


Bia, ndim, bata n'ime-ulo-gí nile, mechibido uzọ-gi nile n'azu-gi: zobe onwe-gi nání otù ntabi-anya ntà, rue mb͕e oké iwe gāgabiga.


Le, aha Jehova nēsi n'ebe di anya bia, nēre ọku n'iwe-Ya, nēwere kwa oké anwuru-ọku nākwugo akwugo: eb͕ub͕ere-ọnu-Ya juputara n'oké iwe, ire-Ya di kwa ọku nērichapu erichapu:


N'ihi na iwe ka Jehova nēwesa mba nile, O wezugawo ha ka ebibie ha, O were ha nye ka eb͕ue ha.


Chikọtanu onwe-unu, unu nile, nuru kwa; ònye n'etiti ha gosiworo ihe ndia? Onye ahu Jehova huworo n'anya gēme ihe nātọ Ya utọ na Babilon, ọ bu kwa ogwe-aka-ya gādakwasi ndi Kaldea.


O we weliere mba ndi sitere n'ebe di anya ọkọlọtọ, kpọkọta ya òkù site na nsọtu uwa: ma, le, ọ nēme ngwa bia ọsọsọ:


Unu gāhu kwa ya, o we tọ obi-unu utọ, ọkpukpu nile unu gējuputa na ndu dika ahihia ndu: agāma kwa aka Jehova n'ebe ndi-orù-Ya nọ, Ọ gēwesa kwa ndi-iro-Ya iwe.


O gēru kwa, n'ubọchi ahu, na Jehova gākpọkọta ijiji nke di na nsọtu osimiri Nail nile nke Ijipt òkù, kpọ kwa aṅu nke di n'ala Asiria.


Jehova emeghewo ulo-àkù-Ya, chiputa ihe-agha nile nke oké iwe-Ya: n'ihi na ozi di nke Onye-nwe-ayi, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha, nēje n'ala ndi Kaldea.


N'ihi na otù mba esiwo n'Ugwu rigoputa imegide ya, mba ahu gēme ka ala-ya ghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu, ọ dighi kwa onye ganēbi nime ya: ma madu ma anumanu, ha awaghariwo, la.


N'ihi na, le, Mu onwem gaje ikpọte me ka nkpọkọta mba uku di iche iche si n'ala Ugwu rigoputa imegide Babilon: ha gēdo kwa onwe-ha n'usoro megide ya; agēsi n'ebe ahu were ya: àkú nke usu ahu gādi ka nke dike nke bu ọ̀kà-uta; ọ gaghi-alaghachi azu n'efu.


Muchanu àkú nile; jidesienu ọta nile ike: Jehova akpọtewo mọ nke ndi-eze Midia; n'ihi na imegide Babilon ka nzube-Ya di, ibibi ya: n'ihi na ibọ̀-ọ́bọ̀ Jehova ka ọ bu, bú ibọ̀-ọ́bọ̀ nke ulo uku Ya.


Le, ọ bu olu ntiku nke ada ndim site n'ala di anya nke-uku: Jehova, Ọ̀ nọghi na Zaion? Eze-ya, Ọ̀ nọghi nime ya? Gini mere ha ji were arusi nile ha apiri api, were kwa ihe-efu nile nke onye ala ọzọ, kpasuem iwe?


M'we wukwasi ha ajọ iwem dika miri; ọku nke nrubiga-ókè nke iwem ka M'jiworo me ka ha gwusia: uzọ-ha ka M'tiyekwasiworo n'isi-ha; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.


Ọ gēwere kwa opì uku zipu ndi-mọ-ozi-Ya, ha gēme kwa ka ndi nke Ya arọputara si n'ifufe anọ zukọ, site n'otù nsọtu elu-igwe rue nsọtu-ya ọzọ.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan