Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Aịzaya 13:19 - Bible Nso

19 Babilon, bú ihe mara nma nke ala-eze nile, ima-nma nke npako ndi Kaldea, ọ gādi ka mb͕e Chineke kwaturu Sọdọm na Gọmọra.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

19 Babilọn, bụ ọla mma nke alaeze niile, ịma mma na ebube ndị Kaldịa, mgbe Chineke ga-akwatu ya ọ ga-adị ka Sọdọm na Gọmọra.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Aịzaya 13:19
23 Iomraidhean Croise  

Jehova we me ka brimstone na ọku si n'elu-igwe zokwasi Sọdọm na Gọmọra dika miri site n'ebe Jehova nọ;


O we kwatue obodo ndia, na Buruburu-ala ahu nile, na ndi nile bi n'obodo ahu nile, na ihe-opupú nke ala.


Ibu eboro Babilon, nke Aisaia nwa Emoz huru.


ma, le, ub͕u a ka usu madu nābia, ndi-inyinya nēje abua abua. O we za, si, Ọ dawo, Babilon adawo; ọzọ, arusi nile apiri api nke chi-ya nile ka etipiaruworo ala.


Nọdu du, ba n'ọchichiri, gi ada ndi Kaldea: n'ihi na i gāghi-abu onye ha nākpọ, Nwanyi-nwe ala-eze di iche iche.


Chikọtanu onwe-unu, unu nile, nuru kwa; ònye n'etiti ha gosiworo ihe ndia? Onye ahu Jehova huworo n'anya gēme ihe nātọ Ya utọ na Babilon, ọ bu kwa ogwe-aka-ya gādakwasi ndi Kaldea.


O gēru kwa, mb͕e ọgu arọ na iri ruzuru, na M'gēwere ajọ omume ha leta eze Babilon, leta kwa mba ahu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), leta kwa ala Kaldea; M'gēme kwa ya ka ọ ghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu mb͕e ebighi-ebi.


Dika nkwatu nke Sọdọm na Gọmọra na ab͕ata nile ha, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), ọ dighi onye ọ bula gēbi n'ebe ahu, nwa madu ọ bula agaghi-anọ kwa dika ọbìa nime ya.


Dika mb͕e Chineke kwaturu Sọdọm na Gọmọra na ab͕ata nile ha, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta); otú a ọ dighi onye ọ bula gēbi n'ebe ahu, nwa madu ọ bula agaghi-anọ kwa dika ọbìa nime ya.


Ha agaghi-eweputa nime gi otù nkume ido na nkuku-ulo, ma-ọbu otù nkume itọ ntọ-ala; n'ihi na ebe nke tọb͕ọrọ n'efu mb͕e ebighi-ebi ka i gābu; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


Ala ahu we nāma jijiji, nāb͕ali kwa: n'ihi na èchìchè nile nke Jehova megide Babilon eguzosiwo ike, ime ka ala Babilon ghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu, ghara inwe onye-obibi.


Le, ka esiworo were Shishak! le, ka esiworo jide otuto uwa nile! le, ka Babilon siworo ghọ ihe-iju-anya n'etiti mba nile!


si, Jehova, Gi onwe-gi ekwuwo okwu bayere ebe a ibipu ya, ka ihe ọ bula we ghara ibi nime ya, ma ọ bu madu ma-ọbu anumanu, n'ihi na ebe tọb͕ọrọ n'efu mb͕e ebighi-ebi ka ọ gābu.


Eze zara, si, Ọ̀ bughi nka bu Babilon uku a, nke mu onwem wuworo ibu ulo ala-eze, site n'ike nke àkùm na n'ihi ebube nke ima-nmam?


Akwatuwom ufọdu n'etiti unu, dika mb͕e Chineke kwaturu Sọdọm na Gọmọra, unu we di ka ọlọkọ-ọku alọputara n'orire-ọku: ma unu alaghachikuteghm; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


N'ihi nka, Mu onwem nādi ndu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, puta), n'ezie Moab gādi ka Sọdọm, umu Amon gādi kwa ka Gọmọra, ihe-onwunwe nke akuba, na olùlù-nnú, na ebe tọb͕ọrọ n'efu rue mb͕e ebighi-ebi: ndim fọduru gāluta ihe-ha n'agha, ndi mbam fọduru gēketa kwa ha.


Ọzọ, dika Aisaia buru uzọ kwue, Ọ buru na Onye-nwe usu nile nke ndi-agha arapughi ayi otù nkpuru, Ayi gādiwori ka Sọdọm, agēmewori ayi ka ayi yie Gọmọra.


mb͕e ha nāhu kwa na ala-ya nile bu brimstone, na nnú, na orire-ọku, na adighi-agha ya nkpuru, na ọ dighi-eme kwa ka ihe pue, na ọ dighi kwa ihe-ọkukú ọ bula nētolite nime ya, dika nkwatu Sọdọm na Gọmọra na Adma na Zeboim, nke Jehova kwaturu n'iwe-Ya na n'ọnuma-Ya:


Ndi-ahia nke uwa nākwa-kwa-ra ya ákwá, nēru-kwa-ra ya újú, n'ihi na ọ dighi onye ọ bula nāzu ihe-ahia-ha ọzọ, bú nke ha nēweta n'ub͕ọ-ha;


Ha we kpokwasi ájá n'isi-ha, ti kwa nkpu, nākwa ákwá, nēru kwa újú, si, Ahuhu, ahuhu, obodo uku ahu, nke ndi nile ndi nwere ub͕ọ-ha n'oké osimiri buru ọgaranya nime ya site n'ibi-obi-ya di oké ọnu-ahia! n'ihi na n'otù oge hour ka emere ka ọ tọb͕ọ n'efu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan