Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Aịzaya 13:18 - Bible Nso

18 Uta-ha nātupia kwa umu-okorọbia; ha adighi-enwe kwa obi-ebere n'aru nkpuru nke afọ; anya-ha adighi-emekwara umu ebere.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

18 Ha ga-eji ụta ha gbatusịa ụmụ okorobịa; ha agaghị emekwara ụmụntakịrị ebere, maọbụ gosi ụmụ na-etopụta etopụta obi ebere.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Aịzaya 13:18
18 Iomraidhean Croise  

Hazael we si, Gini mere onye-nwem nākwa ákwá? Ọ si, N'ihi na amawom ihe ọjọ nke i gēme umu Israel: i gēsu ebe nile ha ewusiri ike ọku, i gēwere kwa mma-agha b͕ue umu-okorobia-ha, i gātupia kwa umu-ha nāṅu ara, i gāb͕awa ndinyom-ha di ime afọ.


O we me ka eze Kaldea rigokwasi ha, o we were mma-agha b͕ue umu-okorọbia-ha n'ulo ebe nsọ ha, o nweghi kwa ọmiko n'aru nwa-okorọbia, ma ọbu n'aru nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke, ma-ọbu n'aru okenye, ma-ọbu n'aru onye kara nká: ha nile ka O nyere n'aka-ya.


Le, ihe-nketa nke nēsi n'aka Jehova bia ka umu bu: Ugwọ-ọlu Ọ nākwu ka nkpuru nke afọ bu.


Agātupia kwa umu-ha nāṅu ara n'anya-ha; agāpunara ha ulo-ha, merua ndinyom-ha.


ma ihe abua ndia gābiakute gi n'otù ntabi-anya n'otù ubọchi, bú ọb͕ub͕a-aka-umu na ọnọdu nwanyi di-ya nwuru: dika izu-okè-ha si di ka ha biakwasiworo gi, n'ọtutu mb͕asi-gi, na n'inwebiga-ume-ókè nke ọlu dibia-nrafu nile i nālu.


ndi àkú-ha nile di nkọ, uta-ha nile ka azọrọ ukwu ikwe ha; aguwo ukwu inyinya-ha nile dika ọmu, na wheel-ha nile dika oké ifufe:


N'ihi nka were umu-ha nye oké unwu, rara kwa ha nye n'aka mma-agha; ka ndinyom-ha ghọ kwa ndi b͕ara aka nwa na ndi di-ha nwuru; ka ndikom-ha ghọ kwa ndi ọnwu b͕uru, ka umu-okorọbia-ha ghọ ndi etib͕uru na mma-agha n'agha.


Àkpà-àkú-ha di ka ílì ghere oghe, ha nile bu ndi-dike.


N'ihi nka ka umu-okorọbia-ya gāda n'amá-ya nile, agēme kwa ka ndi-agha-ya nile dere du n'ubọchi ahu; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


Uta na ube ka ha nējide; mba di irè ka ha bu, ha adighi-enwe obi-ebere; olu-ha nēbib͕ọ dika oké osimiri, ọ bu kwa inyinya ka ha nānọkwasi; edoro mba ahu n'usoro, dika onye nēbu agha, imegide gi, ada Babilon.


ọ bu kwa gi ka M'gēji tipia nwoke na nwanyi; ọ bu kwa gi ka M'gēji tipia agadi-nwoke na nwa-okoro; ọ bu kwa gi ka M'gēji tipia nwa-okorọbia na nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke;


Uta na ube ka ha nējide; mba di irè ka ọ bu, ha adighi-enwe obi-ebere; olu-ha nēbib͕o dika okè osimiri, ọ bu kwa inyinya ka ha nānọkwasi; edoro mba ahu n'usoro, dika onye nēbu agha, imegide gi, ada Zaion.


Ma Mu onwem kwa, anyam agaghi-enwe ebere, M'gaghi-enwe kwa ọmiko, uzọ-ha ka M'gētiyekwasi n'isi-ha.


Ma le, anu ọzọ, nke mere ha abua, nke yiri bear, ma n'otù akuku ka emere ya ka o bilie, ọgiriga atọ di kwa n'ọnu-ya n'etiti ezé-ya: ọ bu kwa otú a ka ha nāsi ya, Bilie, rie ọtutu anu.


Sameria gāhu ahuhu ikpe-ọmuma-ya; n'ihi na ọ nupuwo isi n'okpuru Chineke-ya: site na mma-agha ka ha gāda; agātupia umu-ntakiri-ha, agāb͕awa kwa ndinyom-ha di ime afọ.


Onye-nchusa arigotawo n'iru-gi: chebe ebe ewusiri ike, che uzọ nche, me ka úkwù-gi sie ike, b͕a ike ume nke-uku.


Ọbuná obodo ahu ka emere ka ọ je biri n'ala ọzọ, ọ lara na ndọta-n'agha: atupia-kwa-ra umu-ya nāṅu ara n'isi èzí nile: ọ bu kwa ndi di nsọpuru ya ka ha fekwasiri nzà, eke-kwa-ra ndi uku ya nkpọrọ.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan