Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Aịzaya 13:13 - Bible Nso

13 N'ihi ya ọbuná elu-igwe ka M'gēme ka ha ma jijiji, uwa gēme kwa nkpatu pua n'Ọnọdu-ya, nime nrubiga-ókè nke iwe Jehova nke usu nile nke ndi-agha, na n'ubọchi iwe-Ya di ọku.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

13 Nʼihi na m ga-eme ka eluigwe maa jijiji, meekwa ka e wezuga ụwa site nʼọnọdụ ya, nʼihi oke iwe ga-ewe Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile. Ha ga-emezu nʼụbọchị ahụ ọ ga-ezipụta oke iwe ya dị ọkụ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Aịzaya 13:13
27 Iomraidhean Croise  

Onye nēme ka uwa me nkpatu pua n'ọnọdu-ya, Ogidi-ya nile we ma jijiji.


Ala we me nkpatu ma kwa jijiji, Ntọ-ala nile nke ugwu nile nāma kwa jijiji, Ewe me ka ha me nkpatu, n'ihi na iwe-Ya di ọku.


Iwe-Gi di ọku agabigawo n'isim; Ihe-egwu-Gi nile ekpochapusiwom.


Madu gābà kwa n'ọb͕à nile nke oké nkume nile, na n'olùlù nile nke ájá, ipu n'iru oké egwu Jehova, na ipu n'ima-nma nke nbili-elu-Ya, mb͕e O biliri ime ka uwa ma jijiji nke-uku.


Ibu eboro ọzara nke oké osimiri. Dika oké ifufe nke di nime Negeb nēfebiga, n'ọzara ka o siworo bia, site n'ala di egwu.


Aka-Ya ka O setiworo n'elu oké osimiri, O mewo ka ala-eze di iche iche ma jijiji: Jehova enyewo iwu bayere Kenean, ikpochapu ebe siri ike ya nile.


Le, Jehova nāb͕aba uwa ọtọ, Ọ nēme kwa ka ọ tọb͕ọrọ n'efu, Ọ nēkpùta kwa ya iru, me ka ndi bi nime ya b͕asa.


Ọ gēru kwa, na onye ahu nke nāb͕anari olu oké egwu ahu gādabà n'olùlù ahu; ọzọ, onye ahu nke nārigoputa n'etiti olùlù ahu, agējide ya n'ib͕udu ahu: n'ihi na window nile nke di n'elu ka emegheworo, ntọ-ala nile nke uwa ewe me nkpatu.


Anyajisiwo uwa, emebisiwo uwa, ewezugasiwo uwa n'ọnọdu-ya.


Usu nile nke ihe elu-igwe gēdè kwa, agāpiakọta kwa elu-igwe dika akwukwọ-odide: usu-ha nile gākpọnwu kwa, dika akwukwọ si akpọnwu dapu n'osisi vine, na dika akwukwọ nke nākpọnwu akpọnwu si adapu n'osisi fig.


Rida, we nọdu n'ájá, gi nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke, bú ada Babilon; nọdu n'ala ghara inwe oche-eze, gi ada ndi Kaldea: n'ihi na i gaghi-abu kwa onye ha nākpọ nwanyi di nrò nke di kwa pekepeke.


Welienu anya-unu le elu-igwe, legide-kwa-nu uwa di n'okpuru: n'ihi na elu-igwe gāpu n'anya dika anwuru-ọku, uwa gāka kwa nká dika uwe, ndi bi ya gānwu kwa dika anwu ntà: ma nzọputam gādiru mb͕e ebighi-ebi, agaghi-ebibi kwa ezi omumem.


Nime nrubiga-ókè-iwe nke Jehova nke usu nile nke ndi-agha ka erechapuworo ala: ndi nka we di ka nri ọku; onye ọ bula adighi-enwe ọmiko n'aru nwa-nne-ya.


Otú a ka Jehova siri: Le, M'gaje ikpọte ifufe nke nēbibi ebibi megide Babilon, na n'ebe ndi bi na Leb-kamai nọ.


Ọ̀ bughi unu ihe, unu nile ndi nāgabiga n'uzọ? Legidenu, hu ma ọ di ihe-nb͕u dika ihe-nb͕um di, bú nke anēme mu, Onye Jehova mekpaworo aru n'ubọchi iwe-Ya di ọku.


Jehova gēsi kwa na Zaion bib͕ọ, me ka olu-Ya si na Jerusalem da; elu-igwe na uwa gēme kwa nkpatu: ma Jehova gāburu ndi-Ya ebe-nb͕abà, Ọ gābu-kwa-ra umu Israel ebe siri ike.


Ma ngwa ngwa, mb͕e nkpab͕u mb͕e ahu gasiri, anyanwu gāb͕a ọchichiri, ọnwa agaghi-enye kwa ìhè-ya, kpakpando nile gāda kwa site n'elu-igwe, agēme kwa ka ike nile nke elu-igwe me nkpatu:


Elu-igwe na uwa gāgabiga, ma okwu nile nkem agaghi-agabiga ma-ọli.


Ma ubọchi Onye-nwe-ayi gābia dika onye-ori; nke ọ bu nime ya ka elu-igwe gēji oké ùzù gabiga, ihe nile di n'elu-igwe gāb͕a kwa ọku we la n'iyì, uwa na ọlu nile aluru nime ya gērechapu kwa.


M'we hu oké oche-eze di ọcha, na Onye nānọkwasi ya, Onye uwa na elu-igwe b͕apuru n'iru Ya; ahughi kwa ebe ọ bula nye ha.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan