Jihu we si Bidka, bú onye-isi-agha-ya, Bulie ya, tubà n'òkè ubi Nebot, bú onye Jezreel: n'ihi na cheta na mu na gi nānọkwasi n'elu inyinya, ayi abua, nēso Ehab, bú nna-ya, mb͕e Jehova boro ya ibu a;
Ibu eboro Ijipt. Le, n'igwe-oji nke nāb͕a ọsọ ka Jehova nānọkwasi dika inyinya, O we bia rue Ijipt: ihe-efu nile nke Ijipt gēme kwa nkpatu n'iru Ya, obi Ijipt gālọ kwa ya miri n'etiti ya.
na mb͕e ahu Jehova kwuru okwu site n'aka Aisaia nwa Emoz, si, Je, tọpu ákwà-nkpe n'úkwù-gi, yipu kwa akpukpọ-ukwu-gi n'ukwu-gi. O we me otú a, b͕ara ọtọ nējeghari n'ukwu efu.
N'ubọchi ahu (ọ bu ihe si n'ọnu nke Jehova nke usu nile nke ndi-agha puta) ka ǹtú nke akpọgideworo n'ebe kwesiri ntukwasi-obi gāpu n'ọnọdu-ya; ewe b͕utue ya, o we da, ewe bipu ibu di n'elu ya; n'ihi na Jehova ekwuwo ya.
Otú a ka Jehova siri, bú onye-nb͕aputa-unu na Onye Nsọ nke Israel: n'ihi unu ka M'ga-eziga ozi na Babilon, M'gēme kwa ka ha rida dika ndi-ọ̀só, ha nile, ọbuná ndi Kaldea, n'ugbọ nile nke iti-nkpu-ọṅù-ha.
Jehova we me ka m'hu, ma, le, nkata fig abua adọbara n'iru ulo uku nke Jehova; mb͕e Nebukadreza, bú eze Babilon, mesiri ka Jekonaia nwa Jehoiakim, bú eze Juda, na ndi-isi Juda, na ndi-ọ̀kà, na ndi-uzú, si na Jerusalem je biri n'ala ọzọ, we me ka ha biarue Babilon.
Ndi-amuma ndi burum uzọ, ndi buru kwa gi uzọ, site na mb͕e ebighi-ebi gara aga, ha we bue amuma megide ọtutu ala, megide kwa ala-eze uku di iche iche, bayere agha, baye-kwa-ra ihe ọjọ, baye-kwa-ra ajọ ọria nēfe efe.
Ihere emewo ayi, n'ihi na ayi anuwo ita-uta; ọnọdu-ihere etiyere ayi nime ya ekpuchiwo ayi n'iru: n'ihi na ndi ala ọzọ abàwo imegide ebe nsọ nile nke ulo Jehova.
Mb͕e ahu ib͕u-maramara nke iru eze b͕anwere, èchìchè-ya nile nēme kwa ka ọ ma jijij; nkwonkwo úkwù-ya nātọpusi kwa, ikperè-ya abua nākukọrita kwa onwe-ha.