Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Aịzaya 12:5 - Bible Nso

5 Bùkuenu Jehova abù ọma; n'ihi na ihe-ọkaka ka O meworo: emewo ka amara nka n'uwa nile.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

5 Bụkuonụ Onyenwe anyị abụ, nʼihi na o meela oke ihe dị ebube. Meekwanụ ka ụwa niile mara ihe ọ rụrụ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Aịzaya 12:5
16 Iomraidhean Croise  

Bùkuenu Ya abù, bùkuenu Ya abù ọma; Tugharinu uche n'oké ọlu-Ya nile.


Ihe agọziri agọzi ka aha nsọpuru Ya bu kwa rue mb͕e ebighi-ebi; Ka uwa nile juputa kwa na nsọpuru-Ya. Amen, na Amen.


Bùkuenu Jehova abù ọhu; N'ihi na Ọ luwo oké ọlu di iche iche; Aka-nri-Ya na ogwe-aka-Ya di nsọ enyewo Ya nzọputa.


Mb͕e ahu Moses na umu Israel nābukuru Jehova abù a, ha kwue, si, Ka m'bukue Jehova abù, n'ihi na O biliwo elu nke-uku: Inyinya na onye o nēbu, Ọ tubàwo ha n'oké osimiri.


Miriam we za ha, si, Unu bukue Jehova abù, n'ihi na O biliwo elu nke-uku; Inyinya na onye o nēbu, Ọ tubàwo ha n'oké osimiri.


Ndi ahu gēbuli olu-ha, ha gēti nkpu ọṅù; n'ihi nbili-elu Jehova ha gēsi n'oké osimiri tisie nkpu ike.


Rigo n'elu ugwu di elu, gi nwanyi nēzisa ozi ọma, bú Zaion; welie olu-gi n'ike, gi nwanyi nēzisa ozi ọma, bú Jerusalem; welie ya, atula egwu; si obodo nile nke Juda, Le, Chineke-unu!


Bùkuenu Jehova abù ọhu, kwusanu otuto-Ya site na nsọtu uwa; unu ndi nārida n'oké osimiri, na ùjú-ya, agwe-etiti nile, na ndi bi ha.


Ka ọzara na obodo-ya nile welie olu-ha, obodo ntà nile Kida bi: ka ndi bi na Sela tie nkpu ọṅù, ka ha si n'elu ugwu nile tisie nkpu ike.


Tienu nkpu ọṅù, unu elu-igwe, n'ihi na Jehova emewo ya; tienu nkpu, unu ebe nile di ala nke uwa; unu ugwu, tibenu nkpu ọṅù, gi oké ọhia, na osisi ọ bula di nime ya: n'ihi na Jehova ab͕aputawo Jekob, ọ bu kwa n'Israel ka Ọ gēme Onwe-ya ka Ọ ma nma.


N'ihi na uwa gējuputa n'ọmuma ebube Jehova, dika miri si ekpuchi oké osimiri.


N'ihi na site n'ọwuwa anyanwu we rue ọdida-ya aham di uku n'etiti mba nile; ọ bu kwa n'ebe nile ọ bula ka anēweta nso aham ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ na onyinye-inata-iru-ọma di ọcha: n'ihi na aham di uku n'etiti mba nile, ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri.


Ha nābù kwa abù nke Moses, bú orù nke Chineke, na abù nke Nwa-aturu Chineke, si, Ọlu-Gi nile di uku di kwa ebube, Onye-nwe-ayi Chineke, Onye puru ime ihe nile; uzọ-Gi nile ziri ezi, buru kwa ezi-okwu, Gi Eze nke mba nile.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan