Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Aịzaya 12:3 - Bible Nso

3 Unu gēji kwa obi-utọ seputa miri n'isi-iyi nile nke nzọputa.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

3 Ị ga-eji ọṅụ dọrọ mmiri site nʼolulu mmiri nke nzọpụta.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Aịzaya 12:3
16 Iomraidhean Croise  

N'ihi na n'ebe I nọ ka isi-iyi ndu di: N'ìhè-Gi ka ayi nāhu ìhè.


Ma ndi nābù abù ma ndi nēte egwú, ha nile gāsi, Isi-iyim nile di na Gi.


Dika osisi apple n'etiti osisi oké ọhia, Otú a ka onye ihe-ya nātọm utọ di n'etiti umu-ndikom. Ǹdò-ya ka m'chọsiworo ike, m'we nọdu ala, Nkpuru-ya tọ-kwa-ra okpo-ọnum utọ.


M'gākwaghe osimiri n'elu ugwu di iche iche ọhia nādighi, na isi-iyi n'etiti ndagwurugwu di iche iche: M'gēme ka ọzara ghọ ọdọ-miri juputara na miri, me kwa ka ala ọkpọ-nku ghọ ebe miri nāsuputa.


Agu agaghi-agu ha, akpiri agaghi-akpọ kwa ha nku; miri na anyanwu agaghi-amab͕u kwa ha: n'ihi na Onye nwere obi-ebere n'aru ha gēdu ha, ọ bu kwa n'akuku isi-iyi nile juputara na miri ka O gēdu ha nwayọ.


N'ihi na ihe ọjọ abua ka ndim meworo; Mu ka ha rapuworo, bú isi-iyi nke miri nēnye ndu, ka ha we gwuwara onwe-ha olùlù-miri di iche iche, bú olùlù-miri tipúru etipú, nke nānagideghi miri.


Ọ gēru kwa, na anu nile ọ bula nke nwere nkpuru-obi di ndu gādi ndu, bú nke nēnuputa enuputa, n'ebe ọ bula osimiri abua ndia gērute; azù nke bara uba nke-uku gādi kwa: n'ihi na miri ndia eruwo n'ebe ahu, ewe gwọ miri nke oké osimiri ahu, ihe nile ọ bula gādi kwa ndu n'ebe osimiri ahu gērute.


N'ubọchi ahu isi-iyi gādi nke ghere oghe nye ulo Devid, nye kwa ndi bi na Jerusalem, bayere nmehie baye-kwa-ra ọrurú.


N'ihi na site na njuputa-Ya ka ayi onwe-ayi nile natara, ọbuná amara nēsochi amara.


O we gosim osimiri nke miri nke ndu, nēnwu dika crystal, ka ọ nēsi n'oche-eze Chineke na nke Nwa-aturu ahu puta,


Mọ Nsọ na nwanyi ahu anālu ọhu nāsi kwa, Bia. Onye nānu, ya si kwa, Bia. Onye akpiri nākpọ kwa nku, ya bia: onye nāchọ, ya nara miri nke ndu ahu n'efù.


n'ihi na Nwa-aturu ahu Nke nọ n'etiti oche-eze ahu gāzù ha dika aturu, Ọ gēduru kwa ha ga n'isi-iyi nke miri nke ndu: Chineke gēhichapu kwa anya-miri nile ọ bula n'anya-ha.


Hana we kpe ekpere, si: Ọ nātọ obi m utọ n'ime Jehova, Mpim adiwo elu n'ime Jehova: Ọnum asawo mbara n'elu ndi-irom, N'ihi na aṅuriwom ọṅu na nzọputa-Gi.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan