Aịzaya 11:11 - Bible Nso11 Ọ gēru kwa, n'ubọchi ahu, na Onye-nwe-ayi gēseti kwa aka-Ya ọzọ nke ub͕ò abua inweta ndi-Ya fọduru, bú ndi gāfọdu, site n'Asiria, site kwa n'Ijipt, site kwa na Patros, site kwa na Kush, site kwa n'Ilam, site kwa na Shaina, site kwa na Hemat, site kwa n'agwe-etiti nile nke oké osimiri. Faic an caibideilBaịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a11 Nʼụbọchị ahụ, Onyenwe anyị ga-esetikwa aka nke ugboro abụọ inwetaghachiri onwe ya ndị ya fọdụrụ site na Asịrịa, sitekwa na ndịda Ijipt, sitekwa na Mgbago Ijipt, sitekwa na Kush, sitekwa na Elam, sitekwa na Babilọn, bụ Shaịna, sitekwa na Hamat na obodo niile dị nʼala niile osimiri gbara gburugburu. Faic an caibideil |
Otú a ka Jehova siri, Ihe putara na ndọb͕u Ijipt nādọb͕u onwe-ya n'ọlu, na ọzuzu-ahia nke Etiopia, na ndi Saba, ndi toro ogologo, gāgabigakute gi, ndi i nwere ka ha gābu kwa; gi ka ha gēso n'azu; na nkpọrọ ka ha gāgabiga: ọ bu kwa gi ka ha gākpọ isi ala nye, gi ka ha gēkpere, si, N'ezie nime gi ka Chineke nọ; ọ dighi kwa onye ọzọ di, ọ dighi otù Chineke efu di ma-ọli.
Mb͕e ọtutu ubọchi gasiri agēleta gi: n'ikpe-azu nke arọ ndia ka i gābà n'ala nke emeworo ka o si na mma-agha lata, nke achikọputaworo n'ọtutu ndi di iche iche, n'elu ugwu nile nke Israel, nke ghọworo nkpọnkpọ ebe mb͕e nile: ma emewo ala ahu ka o si n'etiti ndi di iche iche puta, ha gēbi kwa na ntukwasi-obi, ha nile.