Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Aịzaya 11:11 - Bible Nso

11 Ọ gēru kwa, n'ubọchi ahu, na Onye-nwe-ayi gēseti kwa aka-Ya ọzọ nke ub͕ò abua inweta ndi-Ya fọduru, bú ndi gāfọdu, site n'Asiria, site kwa n'Ijipt, site kwa na Patros, site kwa na Kush, site kwa n'Ilam, site kwa na Shaina, site kwa na Hemat, site kwa n'agwe-etiti nile nke oké osimiri.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

11 Nʼụbọchị ahụ, Onyenwe anyị ga-esetikwa aka nke ugboro abụọ inwetaghachiri onwe ya ndị ya fọdụrụ site na Asịrịa, sitekwa na ndịda Ijipt, sitekwa na Mgbago Ijipt, sitekwa na Kush, sitekwa na Elam, sitekwa na Babilọn, bụ Shaịna, sitekwa na Hamat na obodo niile dị nʼala niile osimiri gbara gburugburu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Aịzaya 11:11
69 Iomraidhean Croise  

Nmalite ala-eze-ya bu Bebel, na Erek, na Akad, na Kalne, n'ala Shaina.


Umu-ndikom Shem; Ilam, na Ashua, na Apakshad, na Lud, na Eram.


O rue, mb͕e ha buliri ije n'Iru-anyanwu, na ha chọtara ala di lari n'ala Shaina; ha we biri n'ebe ahu.


O rue, n'ubọchi nke Amrafel, bú eze Shaina, na nke Ariok, bú eze Elasa, na nke Kedoalaoma, bú eze Ilam, na nke Taidal, bú eze Goyim,


Aha osimiri nke-abua bu Gaihon: nke ahu bu nke nāga ala Etiopia nile buruburu.


Eze Asiria we me ka madu si na Babilon, si kwa na Kuta, si Kwa n'Ava, si kwa na Hemat na Sefavaim, bia, o me ka ha biri n'obodo nile nke Sameria n'ọnọdu umu Israel: ha we nweta Sameria, biri n'obodo-ya nile.


Eze, bú Ahasuerọs, we me ka ala ahu na ala nile nke di oké osimiri buruburu tua utu.


Onye-nwe-ayi siri, M'gēme ka ha si na Beshan lata, M'gēme ka ha si n'ebe nile di omimi nke oké osimiri lata:


Ọ buru na Jehova nke usu nile nke ndi-agha emeghi madu ole-na-ole nke fọduru ka ha fọduru ayi, ayi gādiwori ka Sọdọm, ayi gēyiwori Gọmọra.


Ọ gēru kwa, n'ubọchi ahu, na ndi Israel fọduru, ha na ndi ulo Jekob ndi bapuru ab͕apu, agaghi-adabere kwa ọzọ n'aru onye nētib͕u ha; kama ha gādabere Jehova, bú Onye Nsọ nke Israel, n'ezi-okwu.


Kalno, ọ̀ dighi ka Kakemish? ma-ọbu Hemat, ọ̀ dighi ka Apad? ma-ọbu Sameria, ọ̀ dighi ka Damaskọs?


Uzọ atuliri atuli gādi-kwa-ra ndi-Ya fọduru, bú ndi gāfọdu, site n'Asiria; dika o si diri Israel n'ubọchi o siri n'ala Ijipt rigoputa.


Jehova gēme kwa ka Ijipt mara Ya, ndi Ijipt ewe mara Jehova n'ubọchi ahu; ha gēji kwa àjà na onyinye-inata-iru-ọma fè Ya, ha gēkwe kwa Jehova nkwa, kwughachi kwa ya.


Jehova gēti kwa Ijipt ihe, nēti, nāgwọ kwa; ha gālaghachikute kwa Jehova, O we kwe ka ha riọta ihe ha nāriọ, Ọ gēme kwa ka aru di ha nma.


Ọhù siri ike ka egosiworom; onye-nghọb͕u nāghọb͕u, onye nāpunara madu ihe nāpunara madu ihe. Rigo, gi Ilam; nọchigide n'agha, gi Midia; ize-ume-ya nile ka M'meworo ka ọ kwusi.


Ilam bu-kwa-ra àkpà-àkú, ya na usu madu, bú ndi-inyinya; Kia kpughepu-kwa-ra ọta.


N'ihi nka sọpurunu Jehova n'ala ìhè nile, sọpurunu aha Jehova, bú Chineke Israel, n'ala nile nke di oké osimiri buruburu.


Ndi b͕apuru ab͕apu nke ulo Juda ndi fọduru gāb͕agide kwa nkpọrọgwu n'ala n'okpuru ọzọ, mi kwa nkpuru n'elu.


Bùkuenu Jehova abù ọhu, kwusanu otuto-Ya site na nsọtu uwa; unu ndi nārida n'oké osimiri, na ùjú-ya, agwe-etiti nile, na ndi bi ha.


Ka ha nye Jehova nsọpuru, gosi kwa otuto-Ya n'agwe-etiti nile.


Ọ gaghi-enwu inyoghi-inyoghi, agaghi-apia kwa ya apia n'obi, rue mb͕e o gēdowori ikpé n'uwa; ọ bu kwa iwu-ya ka agwe-etiti nile gēchere.


Otú a ka Jehova siri, Ihe putara na ndọb͕u Ijipt nādọb͕u onwe-ya n'ọlu, na ọzuzu-ahia nke Etiopia, na ndi Saba, ndi toro ogologo, gāgabigakute gi, ndi i nwere ka ha gābu kwa; gi ka ha gēso n'azu; na nkpọrọ ka ha gāgabiga: ọ bu kwa gi ka ha gākpọ isi ala nye, gi ka ha gēkpere, si, N'ezie nime gi ka Chineke nọ; ọ dighi kwa onye ọzọ di, ọ dighi otù Chineke efu di ma-ọli.


Le, ndia gēsi n'ebe di anya bia: le kwa, ndia gēsi n'Ugwu na n'Ọdida-anyanwu; ndia gēsi kwa n'ala Sainim.


M'gēdo kwa ihe-iriba-ama n'etiti ha, si kwa n'etiti ha ziga ndi b͕aputara ab͕aputa ka ha jekuru mba nile, bú Tashish, na Pul, na Lud, ndi nādọ uta, jekuru Tubal na Jevan, jekuru agwe-etiti nile di anya, ndi nānughi ihe bayerem, ndi nāhughi kwa ebubem: ha gēgosi ebubem n'etiti mba nile.


na eze nile nke Zimri, na eze nile nke Ilam, na eze nile nke Midia;


Nurunu okwu Jehova, unu mba nile, gosi-kwa-nu ya n'agwe-etiti nile di n'ebe di anya; si-kwa-nu, Onye nēfesa Israel gāchikọta ya, debe kwa ya, dika onye-ọzùzù-aturu si emere ìgwè aturu-ya.


Okwu ahu nke ruru Jeremaia nti bayere ndi-Ju nile ndi bi n'ala Ijipt, ndi bi na Migdol, na nime Tahpanhes, na nime Nof, na n'ala Patros, si,


Nke diri Damaskọs. Ihere emewo Hemat na Apad; n'ihi na akukọ ọjọ ka ha nuworo, ha ab͕azewo: n'oké osimiri ka ncheb͕u di; ọ pughi inọ jū.


Osisi oak nke si na Beshan aputa ka ha jiworo me umara-gi nile; oche-umara-gi ka ha jiworo ọdu, ekwukọyere n'osisi igbe nke si n'agwe-etiti Kitim aputa, me.


M'gēme kwa ka ndi Ijipt adọtara n'agha laghachi, M'gēme kwa ka ha laghachi n'ala Patros, n'ala nputa-n'uwa-ha; ha ewe nọ n'ebe ahu, buru ala-eze di ala.


M'gēme kwa ka Patros tọb͕ọrọ n'efu, M'gētiye kwa ọku nime Zoan, me kwa ihe nile ekpere ikpe nime No.


N'ebe ahu ka Ilam na ìgwè ndi-ya nile ndi nọ ílì-ya buruburu di: ha nile bu ndi eb͕uru eb͕u, ndi daworo site na mma-agha, ndi ridara n'ebighi-úgwù rue ala di n'okpuru uwa, bú ndi mere ka ujọ-ha di n'ala ndi di ndu, we būru ihere-ha, ha na ndi nārida n'olùlù.


Mb͕e ọtutu ubọchi gasiri agēleta gi: n'ikpe-azu nke arọ ndia ka i gābà n'ala nke emeworo ka o si na mma-agha lata, nke achikọputaworo n'ọtutu ndi di iche iche, n'elu ugwu nile nke Israel, nke ghọworo nkpọnkpọ ebe mb͕e nile: ma emewo ala ahu ka o si n'etiti ndi di iche iche puta, ha gēbi kwa na ntukwasi-obi, ha nile.


Onye-nwe-ayi we were Jehoiakim, bú eze Juda, na ihe ufọdu nke ulo Chineke, nye n'aka-ya; o we chiri ha bia n'ala Shaina n'ulo chi-ya: ọ bu kwa ihe ndia ka ọ chibatara n'ulo àkù nke chi-ya.


Ọ gēchighari kwa iru-ya le agwe-etiti nile, were ọtutu: ma otù ọchi-agha gēme ka ita-uta-ya kwusiri ya; e, ọ gēme kwa ka ita-uta-ya laghachikute ya.


M'we hu n'ọhù ahu; o we rue, mb͕e m'nāhu, na mu onwem nọ na Shushan, bú ulo uku eze nke di n'Ilam, bú ala anāchi achi; m'we hu n'ọhù ahu, ma le, mu onwem nọ n'akuku osimiri Ulai.


Agāchikọta kwa umu Juda na umu Israel, ha gēdo-kwa-ra onwe-ha otù onye-isi, si n'ala-ha rigopu, n'ihi na ihe uku ka ubọchi Jezreel bu.


Jehova ka ha gējeso, dika ọdum ka Ọ gāb͕ọ uja; N'ihi na Ya onwe-ya gāb͕ọ uja, umu gesi kwa n'Ọdida-anyanwu bia nāma jijiji.


Ha gēsi n'Ijipt bia nāma jijiji dika nnunu, si kwa n'ala Asiria dika nduru: M'gēme kwa ka ha biri n'ulo nile ha: ọ bu ihe si n'ọnu Jehovaa puta.


N'ubọchi ahu ọ bu kwa gi ka agābiakute, site n'Asiria na obodo nile nke Ijipt, site kwa n'Ijipt we rue Osimiri, site kwa n'oké osimiri rue oké osimiri, site kwa n'ugwu rue ugwu.


Onye di egwu ka Jehova gābu n'imegide ha: n'ihi na Ọ gēme ka chi nile nke uwa ta aru; madu gākpọ kwa isi ala nye Ya, onye ọ bula site n'ọnọdu-ya, bú agwe-etiti nile nke mba nile.


O we sim, Iwuru ya ulo n'ala Shaina: mb͕e edozisiri ya, agādọba ya n'ebe ahu n'ihe-ndọkwasi-ya.


Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri: Le, M'gaje izọputa ndim n'ala Ọwuwa-anyanwu, na n'ala Ọdida-anyanwu:


na Hemat nke nwe-kwa-ra ókè-ala-ya: Taia na Zaidon, n'ihi na ọ mara ihe nke-uku.


N'ihi na asi na nchupu-ha bu ime ka uwa na Chineke di n'otù, gini ka nkpọbata-ha gābu, ma-ọbughi ndu sitere na ndi nwuru anwu?


otú a agāzọputa kwa Israel nile: dika edeworo ya n'akwukwọ nsọ, si, Onye-ndọputa ahu gēsi na Zaion puta; Ọ gēchighari asọpurughi-Chineke nile ka ọ pua na Jekob:


Ma mb͕e ọ bula o gēchigharikute Onye-nwe-ayi, ewepu ihe-nkpudo ahu.


Ma ha onwe-ha bu ndi-Gi na ihe-nketa-Gi, ndi I were ike uku Gi na ogwe-aka-Gi eseteri eseti me ka ha puta.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan