Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Aịzaya 10:34 - Bible Nso

34 Ọ gēwere kwa ígwè b͕utusia alughi-ulù nile nke oké ọhia, Lebanon gēsite kwa n'aka onye di ike nke-uku da.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

34 Ya onwe ya ga-egbutu ha niile ka e si eji anyụike egbutu osisi dị nʼoke ọhịa. Lebanọn ga-adakwa nʼihu Onye ahụ dị ike dịka osisi dị nʼoke ọhịa si ada.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Aịzaya 10:34
19 Iomraidhean Croise  

Gọzienu Jehova, ndi-mọ-ozi-Ya, Unu ndi-dike di ike, ndi nēme okwu-Ya, N'ige nti olu nke okwu-Ya.


Ọ gēme kwa nsọpuru nke oké ọhia-ya na nke ubi ọma ya ka ọ gwusia, ma nkpuru-obi ma anu-aru: ọ gādi kwa ka ọtita-aru nke onye-ọria.


ọ gādakwasi kwa osisi cedar nile nke Lebanon nke di elu nke ebuliwo-kwa-ra ha elu, ọ gādakwasi kwa osisi oak nile nke Beshan;


Asiria gāda kwa site na mma-agha nke nābughi nke madu di elu: mma-agha nke nābughi nke madu di ala gērichapu kwa ya: ọ gēsi kwa n'iru mma-agha b͕alaga, umu-okorọbia-ya gāghọ kwa usu ndi nēfè òfùfè.


Ala nēru újú, talata: Lebanon nwere iru-ihere, ọ janwuwo ajanwu: Sheron di ka ala ihe nādighi; Beshan na Kamel nārurupu kwa akwukwọ-ha.


I siri n'aka ndi-orù-gi ta Onye-nwe-ayi uta, si, Ọtutu ub͕ọ-alam ka mu onwem jiri rigorue ebe di elu nke ugwu nile, rue akuku ime nile nke Lebanon; m'gēb͕utu kwa osisi cedar ya nile toro ogologo, na osisi fir ya nile arọputara arọputa: m'gābà kwa n'ebe di elu nke nsọtu-ya, oké ọhia nke ubi ọma ya.


Mọ-ozi nke Jehova we pua, tib͕ue n'ọmuma-ulo-ikwū Asiria orú nnù ndikom orú uzọ na uzọ atọ, na nnù ndikom abua na ọgu iri: madu we bilie n'isi-ututu, ma, le, ha nile bu ozu nwuru anwu.


M'gēdo kwa ndi-nbibi nsọ imegide gi, onye ọ bula na ihe-agha-ya: ha gēb͕utu kwa osisi cedar gi nile kachasi nma, me ka ha dakwasi n'ọku.


Ọ dighi kwa otuto Moab di ọzọ; nime Heshbon ka ha chèputara èchìchè ọjọ megide ya, si, Bianu, ka ayi bipu ya ka ọ ghara ibu mba. Gi Madmen, agēme kwa ka i dere du; gi ka mma-agha gējeso.


Le, Asiria bu osisi cedar nime Lebanon nke nwere ngalaba mara nma, na ọtutu alaka nēnye ǹdò, na ogologo di elu; ọ bu kwa n'etiti alaka b͕ara ọhia ka ọnu-ọnu-ya di.


Ma ebe eze huru otù onye nāmuru anya, nke bu kwa onye nsọ, ka o nēsi n'elu-igwe ridata, si, B͕utuenu osisi ahu, mebie ya; ma rapunu ogwe nkpọrọgwu-ya nile n'ala, ọbuná n'ab͕u ekere ya nke ígwè na ọla, n'ahihia ndu nke ọhia; ka igirigi nke elu-igwe de kwa ya, ka òkè-ya di kwa n'etiti anu ọhia, rue mb͕e oge asa gāgabiga n'isi ya;


Otú a ka Jehova siri: Ọ bu ezie na ha zuru okè, ba kwa uba otú a, ọbuná otú a ka agēb͕utu ha, ọ gāgabiga kwa. Ọ bu ezie na ewedawom i n'ala, ma M'agaghi-eweda kwa gi n'ala ọzọ.


na inyeghachi unu, bú ndi anākpab͕u, aru-efè, ayi na unu, nime nkpughe nke Onye-nwe-ayi Jisus site n'elu-igwe, Ya na ndi-mọ-ozi nke ike-Ya,


ebe ndi-mọ-ozi, ọ bu ezie na ha ka ha n'ume na ike, ma ha ekpegideghi ha ikpé nkwulu n'iru Onye-nwe-ayi.


M'we hu mọ-ozi ọzọ di ike, ka ọ nēsi n'elu-igwe ridata, nke eb͕okwasiworo ya igwe-oji dika uwe; eke-na-ogwurugwu ahu di kwa n'isi-ya, iru-ya di kwa ka anyanwu, ukwu-ya abua di kwa ka ide ọku;


Otù mọ-ozi nke di ike we būru nkume, dika oké nkume-igwe-nri, we tubà ya nime oké osimiri, si, Otú a ka agātuda Babilon, bú obodo uku ahu, n'oké ọdida, agaghi-ahu kwa ya ọzọ ma-ọli.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan