Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Aịzaya 10:32 - Bible Nso

32 Ubọchi nke ta ọ bu nime Nob ka o gēguzo: ọ nēfeghari aka-ya n'ebe ugwu ada Zaion di, bú ugwu ntà Jerusalem.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

32 Ndị iro akwụsịla nʼobodo Nob taa; ha na-atụ ugwu Zayọn na Jerusalem aka, na-ekwere ya nʼisi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Aịzaya 10:32
21 Iomraidhean Croise  

Mb͕e ihe ndia na ezi-okwu a gasiri, Senakerib, bú eze Asiria, biara, ba nime Juda, we ma ulo-ikwū-ya imegide obodo nile ewusiri ike, si na o gētipú ha nye onwe-ya.


Hezekaia we hu na Senakerib abiawo, che iru ibuso Jerusalem agha,


na Anatot, na Nob, na Anania;


Ma ada Zaion fọduru dika ulo-ntu n'ubi-vine, dika ulo-ọnọdu-abali n'ubi cucumbei, dika obodo nke ndi-iro-ya nēche nche.


N'ihi nka otú a ka Onye-nwe-ayi, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha, siri, Gi ndim nke bi na Zaion, atula egwu Asiria: ọ bu ezie na o ji ndele tie gi, weli kwa nkpa-n'aka-ya megide gi, otú Ijipt mere.


Madmena awaghariwo; ndi bi na Gibim gēme ka ndi-ha laghachi n'ulo ọsọsọ.


Jehova gēwezuga ire oké osimiri nke Ijipt ka ebibie ya; Ọ gēji kwa okpom-ọku nke ifufe-Ya feghari aka-Ya n'elu Osimiri, tiputa ya iyi asa, me ka madu zọ ya ukwu n'akpukpọ-ukwu.


Bulienu ọkọlọtọ n'elu ugwu nke osisi nādighi, welierenu ha olu, fenu aka, ka ha we ba n'ọnu-uzọ nile nke ndi amara aha-ha.


Sinu na Sela n'uzọ ọzara zigara onye nāchi ala umu-aturu, rue ugwu ada Zaion.


N'ubọchi ahu Ijipt gādi ka ndinyom: ọ gāma kwa jijiji tu kwa egwu n'ihi nfeghari aka nke Jehova nke usu nile nke ndi-agha, nke Ya onwe-ya nēfeghari n'elu ya.


O gēru kwa n'ikpe-azu nke ubọchi ndia, na ugwu nke ulo Jehova ganēguzosi ike n'elu ugwu nile, agēbuli kwa ya elu kari ugwu ntà nile; mba nile gērùbà nime ya dika osimiri.


M'gākpab͕u kwa Eriel, ize-ume na isu-ude gādi kwa: o we dirim ka Eriel.


Nka bu okwu nke Jehova kwuworo bayere ya: Nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke, bú ada Zaion elelìwo gi anya, chìnye gi ihere n'iru; ada Jerusalem efufewo isi n'azu gi.


ọ gēruru kwa ba na Juda; ọ gēruchi, gabiga kwa; ọbuná n'olu ka ọ gēru; nsetipu nkù-ya abua gābu kwa ihe juputara obosara ala-gi, Immanuel.


Uta na ube ka ha nējide; mba di irè ka ọ bu, ha adighi-enwe obi-ebere; olu-ha nēbib͕o dika okè osimiri, ọ bu kwa inyinya ka ha nānọkwasi; edoro mba ahu n'usoro, dika onye nēbu agha, imegide gi, ada Zaion.


N'ihi na ihe nādighi ngwọta ka ntiputa-ọnyá nile bu: n'ihi na ọ biaruwo Juda; o rutewo ọnu-uzọ-ama ndim, rue Jerusalem.


N'ihi na, le, M'gaje ifeghari akam n'aru ha, ha gābu-kwa-ra ndi nēfè ha ihe-nkwata: unu ewe mara na Jehova nke usu nile nke ndi-agha ezitewom.


Devid we biarue Nob biakute Ahimelek, bú onye-nchu-àjà: Ahimelek we ma jijiji izute Devid, si ya Gini mere nání gi onwe-gi biara, ma ọ dighi nwoke gi na ya yikọrọ?


Devid we si Ahimelek, bú onye-nchu-àjà, Eze enyewom ihe n'iwu, sim, Ka nwoke ọ bula ghara ima ihe ọ bula bayere ihe ahu nke mu onwem nēziga gi ozi-ya, na nke m'nyeworo gi n'iwu: emewokwam ka umu-okorọbiam mara na ha gēje n'ebe di otú a otú a.


O were kwa ọnu mma-agha tib͕ue Nob, bú obodo ndi-nchu-àjà, were ọnu mma-agha tib͕ue ma nwoke ma nwayi, ma nwatakiri ma nwa nāṅu ara, na ehi na inyinya-ibu na aturu.


Doeg onye Edom we za, (n'ihi na ya onwe-ya nēguzo n'akuku ndi-orù Sọl), si, Ahurum nwa Jesi ka ọ nābiaru Nob, biakute Ahimelek nwa Ahaitub.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan