Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Aịzaya 10:3 - Bible Nso

3 Ọ̀ bu kwa gini ka unu gēme n'ubọchi nleta, na n'ila-n'iyì nke gēsi n'ebe di anya bia? Ònye ka unu gāb͕akuru ka o we yere unu aka? ọ̀ bu kwa ole ebe unu gārapu nsọpuru-unu?

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

3 Gịnị ka unu ga-eme nʼụbọchị m ga-abịa ileta unu? Gịnị ka unu ga-eme nʼụbọchị m ga-eweta ịla nʼiyi, nke ga-esi nʼebe dị anya bịara unu? Onye ka unu ga-agbakwuru maka enyemaka? Ọ bụ ebe ka unu ga-ahapụ akụ unu niile?

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Aịzaya 10:3
40 Iomraidhean Croise  

Ọ we nu okwu nile nke umu-ndikom Leban, si, Jekob achiriwo ihe nile nna-ayi nwere; o sitekwara n'ihe nna-ayi nwere kpata àkù a nile.


Ha we jeso ha rue Jọdan: ma, le, uzọ nile juputara n'uwe na ihe, nke ndi Siria tufuru n'ime-ngwa-ngwa-ha. Ndi-ozi we lata, gosi eze.


Gini ka m'gēme kwa mb͕e Chineke nēbili? Mb͕e Ọ nēleta kwa, gini ka m'gāzaghachi Ya?


Àkù adighi-aba urù n'ubọchi nke nrubiga-ókè nke iwe: Ma ezi omume nānaputa n'ọnwu.


kwasienu ákwá ike; n'ihi na ubọchi Jehova di nso; dika nbibi nke sitere n'aka Onye puru ime ihe nile ka ọ gābia.


Ọ gēru kwa, n'ubọchi ahu, na agēme ka nsọpuru Jekob ghara inwe ike, ima-abuba nke anu-aru-ya gāta kwa ata.


Onye bi n'akuku oké osimiri nka gāsi kwa n'ubọchi ahu, Le, otú a ka ihe-ntukwasi-obi-ayi di, ebe ayi b͕alagaworo ka ewe yere ayi aka inaputa ayi n'aka eze Asiria: òle ebe kwa ka ayi onwe-ayi gēwepuga onwe-ayi?


Ndi nwuru anwu adighi-adi ndu; ndi nādighi ndu adighi-ebili: n'ihi nka ka I letaworo ha we kpochapu ha, me ka ncheta nile nke diri ha la n'iyì.


N'ihi na, le, Jehova nēsi n'ọnọdu-Ya aputa iji ajọ omume nke ndi bi n'uwa leta ha: ọzọ, ala gēkpughe ọbara-ya, ọ gaghi-ekpuchi kwa ndi-ya eb͕uru eb͕u ọzọ.


N'ihi na ihe-ndina di nkpunkpu kari nke madu gēsetipusi onwe-ya n'elu ya; ákwà-nkpuchi di kwa warara kari nke madu gāfuchi onwe-ya.


Jehova nke usu nile nke ndi-agha gēji éb͕è-elu-igwe, ji kwa ala-ọma-jijiji, na oké olu, na oké ifufe na ikuku uku, na ire-ọku nke -ọku nērichapu erichapu, leta ya.


Kama unu siri, É-è, n'ihi na inyinya ka ayi gānọkwasi b͕alaga; n'ihi nka unu gāb͕alaga: unu si-kwa-ra, Anu di ngwa ka ayi gānọkwasi; n'ihi nka ka ndi nāchu unu gādi ngwa.


Ha nile gēme ihere otù ndi nādighi-abara ha urù, ndi nābughi ihe iye aka, nābughi kwa ihe iba urù, kama ha bu ihe-ihere, ọzọ kwa, ha bu ihe-ita-uta.


Ma Ijipt, nání otù nku-ume na ihe-efu ka iye-aka-ha bu: n'ihi nka ka M'kpọworo ala nka Rehab, ndi ahu bu nkwusi.


Ndi-nmehie nātu oké egwu nime Zaion; ọma-jijiji ejidewo ndi emeruru emeru. Ònye n'etiti ayi gānọ dika ọbìa n'ebe ọku nērichapu erichapu di? ònye n'etiti ayi gānọ dika ọbìa n'ebe ọku nēre ere ebighi-ebi di?


Aisaia, bú onye-amuma, we biakute eze, bú Hezekaia, si ya, Gini ka ndikom ndia siri gi? òle ebe ka ha si kwa biakute gi? Hezekaia we si, Ọ bu n'ala di anya ka ha si biakutem, ọbuná na Babilon.


N'ihi nka ala-mọ emewo ka ọchichọ-nkpuru-obi-ya sa mbara, ọ saghebigawo kwa ọnu-ya ókè: ima-nma Jerusalem, na ìgwè-ya, na nkpọtu-ya, na onye nāṅuri ọṅu-agha n'etiti ya, gārida kwa nime ya.


O we weliere mba ndi sitere n'ebe di anya ọkọlọtọ, kpọkọta ya òkù site na nsọtu uwa: ma, le, ọ nēme ngwa bia ọsọsọ:


M'gēdo kwa ndi-nbibi nsọ imegide gi, onye ọ bula na ihe-agha-ya: ha gēb͕utu kwa osisi cedar gi nile kachasi nma, me ka ha dakwasi n'ọku.


Ma gi onwe-gi, mb͕e ebibiworo gi, gini ka i gēme? Mb͕e i geyi uwe uhie, mb͕e i gēke ihe-ichọ-nma ọla-edo, mb͕e i gēji ihe-ichọ-nma me ka anya-gi abua sa mbara, n'efu ka i nēme onwe-gi ka i ma nma; ndi-iko-gi ajuwo gi, ndu-gi ka ha nāchọ.


ndi-amuma ebuwo amuma ugha, ndi-nchu-àjà nāzọda kwa ndim site n'aka-ha; ndim ahuwo kwa ihe di otú a n'anya: ma gini ka unu gēme n'ikpe-azu-ya?


M'gaghi-eleta ha n'ihi ihe ndia? ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta: nkpuru-obim, ọ̀ gaghi-abọ̀ mba nke di otú a ọ́bọ̀?


Efraim we hu ọria-ya, Juda hu-kwa-ra ọnyá-ya, Efraim we je Asiria, zigara eze, bú Jereb: ma onye ahu apughi igwọ unu, ọ gaghi-eme kwa ka ọnyá si n'aru-unu la.


Gini ka unu gēme n'ubọchi nke mb͕e ákàrà, na n'ubọchi ememe Jehova?


Ubọchi nile nke nleta abiawo, ubọchi nkwughachi abiawo; Israel gāma ya: onye b͕agọrọ ab͕agọ n'uche-ya ka onye-amuma bu, onye-ara ka onye nwere Mọ Chineke bu, n'ihi iba-uba nke ajọ omume-gi, na n'ihi na ihe bara uba ka ikpọ-asì ahu bu.


Dika agāsi na otù onye nāb͕apu n'iru ọdum, anu-ọhia bear we zute ya; o we ba n'ulo-ya dabere aka-ya na mb͕idi, agwọ we ta ya.


Onye nke ha nke kachasi nma di ka uke: onye ziri ezi jọrọ njọ kari ogige ogwu: ubọchi ndi-nche-gi, bú nleta-gi, abiawo; ub͕u a ka mb͕e ib͕a ha ghari gādi.


Ọla-ọcha-ha ma-ọbu ọla-edo-ha agaghi-enwe ike inaputa ha anaputa n'ubọchi nrubiga-ókè nke iwe Jehova; ma agēji ọku nke ekworo-Ya ripia ala-ha nile: n'ihi na ngwusi, nke bu nání obi-ọlulọ-miri, ka Ọ gēme ka ndi nile bi n'ala nka gwusia.


tuda kwa gi n'ala, na umu-gi bi nime gi; ha agaghi-arapu kwa nime gi otù nkume n'elu nkume-ibe-ya; n'ihi na i maghi oge nleta-gi.


Jehova gēsi n'ebe di anya bulie otù mba imegide gi, site na nsọtu uwa, dika ugo si efe; bú mba nke i nānughi asusu-ya;


nēbinu obi-unu nke-ọma n'etiti ndi mba ọzọ; ka ha we site n'ọlu ọma nile unu, nke ha nēle anya, nye Chineke otuto n'ubọchi nleta ahu nime ihe ahu ha nēkwutọ unu nime ya dika ndi nēme ihe ọjọ.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan