Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Aịzaya 10:26 - Bible Nso

26 Jehova nke usu nile nke ndi-agha gēfeghari kwa utali n'elu ya, dika ntib͕u Midian n'oké nkume Oreb: nkpa-n'aka-Ya gādi kwa n'elu oké osimiri, Ọ gēweli kwa ya otú O mere n'Ijipt.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

26 Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, ga-eji ụtarị tie ha ihe dịka o sịrị tie ndị Midia ihe na nkume Oreb. Ọ ga-eweli mkpanaka ya nʼelu oke osimiri, ọ ga-eweli ya dịka o mere nʼIjipt.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Aịzaya 10:26
21 Iomraidhean Croise  

O rue, n'abali ahu, na mọ-ozi nke Jehova puru, tib͕ue n'ọmuma-ulo-ikwū Asiria orú nnù ndikom orú uzọ na uzọ atọ na nnù ndikom abua na ọgu iri: madu we bilie n'isi-ututu, ma, le, ha nile bu ozu nwuru anwu.


Kpọte Onwe-gi, kpetara ikpe m, Chinekem na Onye-nwem, tetara okwu-ikpem.


Me ndi-ha amara aha-ha ka ha di ka Oreb, na dika Zeeb; Me kwa ka ndi-isi-ha nile di ka Zeba na dika Zalmuna:


Gi onwe-gi weli kwa nkpa-n'aka-gi elu, setipu aka-gi n'elu oké osimiri, kewa ya: umu Israel gābà kwa n'etiti oké osimiri n'ala-akọrọ.


N'ihi nka otú a ka Onye-nwe-ayi, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha, siri, Gi ndim nke bi na Zaion, atula egwu Asiria: ọ bu ezie na o ji ndele tie gi, weli kwa nkpa-n'aka-ya megide gi, otú Ijipt mere.


Uzọ atuliri atuli gādi-kwa-ra ndi-Ya fọduru, bú ndi gāfọdu, site n'Asiria; dika o si diri Israel n'ubọchi o siri n'ala Ijipt rigoputa.


Jehova gēme kwa ka anu ebube nke olu-Ya, Ọ gēme kwa ka ahu ndakwasi nke ogwe-aka-Ya, n'ọnuma nke iwe-Ya, na ire-ọku nke ọku nērichapu erichapu, na ntupia, na oké miri-ozuzo, na ákú-miri-ígwé.


N'ihi na agēsite n'olu Jehova nyajisia Asiria, Ọ gēji ndele tib͕ue ya.


Ngabiga ọ bula nke nkpa-n'aka akara àkà, nke Jehova gēme ka ọ dakwasi ya, gādi kwa n'egwú-otiti na n'ubọ-akwara: ọ bu kwa n'agha di iche iche nke nfeghari ka Ọ gēbuso ha agha.


I mewo ka mba ahu ba uba, I mewo ka ọṅù diri ya uku: ha aṅuriwo n'iru Gi dika ọṅù nke di n'owuwe-ihe-ubi, dika madu si eteghari egwú ọṅù mb͕e ha nēkasa ihe akwatara n'agha.


N'ihi na yoke nke ibu-ya, na nkpa-n'aka nke ubu-ya, bú ndele nke onye nāchi ya n'ihe-ike, I nyajiwo ha, dika n'ubọchi nke Midian.


Mba nile we we iwe, iwe-Gi we bia, ya na oge ikpe ndi nwuru anwu ikpé, na inye ndi-orù-Gi, bú ndi-amuma, na ndi nsọ, na ndi nātu egwu aha-Gi, ndi ntà na ndi uku, ugwọ-ọlu-ha; na imebi ndi ahu nēmebi uwa.


Mma-agha di nkọ nēsi kwa n'ọnu-Ya puta, ka O we were ya tib͕ue mba nile: Ya onwe-ya gēwere kwa nkpa-n'aka nke ígwè zùa ha dika aturu: Ya onwe-ya nāzọ kwa ebe-nzọcha-nkpuru-vine nke manya nke ọnuma nke iwe Chineke Onye puru ime ihe nile.


Ha we nwude ndi-isi abua nke Midian, bú Oreb na Zeeb; ha we b͕ue Oreb n'oke nkume Oreb, b͕u kwa Zeeb n'ebe-nzọcha-nkpuru-vine nke Zeeb, we chua Midian: ha we wetara Gideon isi Oreb na Zeeb n'ofè Jọdan.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan