Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Aịzaya 10:2 - Bible Nso

2 iwezuga ndi nēnweghi ike n'ezi ikpé, na inapu ikpé ziri ezi nke ndi ewedara n'ala nke ndim, ka ndinyom di-ha nwuru we buru ihe ha kwatara n'agha, ka ha we luta kwa ihe umu-nb͕ei n'agha!

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

2 iji napụ ndị ogbenye ihe ruru ha nakwa ịnapụ ndị m a na-emegbu emegbu ikpe ziri ezi, na-emekwa ka ụmụ nwanyị di ha nwụrụ bụrụ anụ oriri ha na izunara ụmụ na-enweghị nne na nna ihe ha nwere.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Aịzaya 10:2
24 Iomraidhean Croise  

Ọ buru na eb͕ochiem ndi nēnweghi ike n'ihe nātọ ha utọ, Ọ buru kwa na emem ka anya nwayi di-ya nwuru dala n'isi;


Ha nēb͕u nwanyi di-ya nwuru, na ọbìa, Ha nēb͕u kwa umu-nb͕ei n'ọchu.


Ewezugala ikpé nke ob͕eye-gi n'ise-okwu-ya.


Anapula onye nēnweghi ike ihe n'ike, n'ihi na onye nēnweghi ike ka ọ bu, Azọpia-kwa-la onye ewedara n'ala n'ọnu-uzọ-ama:


Ọb͕ọ di, mma-agha ka ezé nile ha bu, ọ bu kwa mma ka ikiri-ezé-ha bu, Irichapu ndi ewedara n'ala n'uwa, na irichapu ndi-ob͕eye n'etiti madu.


mutanu ime ezi ihe; chọnu ikpé ziri ezi, menu ka onye nēme ihe-ike gazi agazi, kpenu nwa-nb͕ei ikpe ziri ezi, kpenu ọnu nwayi di-ya nwuru.


Ndi-isi-gi nēwezuga onwe-ha n'ebe M'nọ, ha bu kwa ndi ejikọtara ha na ndi-ori; onye ọ bula nime ha nāhu iri-ngo n'anya, nāb͕aso kwa ihe-nkwughachi: ọ dighi nwa-nb͕ei ha nēkpe ikpe ziri ezi, okwu-ikpe nke nwanyi di-ya nwuru adighi-abiakute kwa ha.


bú ndi nēme ka madu mehie site n'okwu-ha, ndi nēsi-kwa-ra onye nāba nba n'ọnu-uzọ-ama ọnyà, we were ihe tọb͕ọrọ n'efu wezuga onye ezi omume.


Jehova gēso ndi-okenye nke ndi-Ya na ndi-isi-ha ba n'ikpé, si, Ma unu onwe-unu, unu eripiawo ubi-vine; ihe unu napuworo onye ewedara n'ala n'ike di n'ulo-unu nile:


gini mere unu ji azọpia ndim, gwepia kwa iru onye ewedara n'ala? ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha, puta.


N'ihi na onye-nzuzu gēkwu ihe-nzuzu, obi-ya gēme kwa ajọ ihe, ime ihe emeruru emeru, na ikwu okwu njehie megide Jehova, ime ka nkpuru-obi nke onye agu nāgu b͕ara aka, na ime ka ihe-ọṅuṅu nke onye akpiri nakpọ nku kọ ukọ.


ndi nāgu onye nēmebi iwu n'onye ezi omume n'ihi iri-ngo, ha nēwezuga kwa ezi omume nke onye ezi omume n'aru ya!


N'ihi na ubi-vine nke Jehova nke usu nile nke ndi-agha bu ulo Israel, ndi Juda bu kwa ihe-ọkukú nātọ Ya utọ nke-uku: O we le anya ikpe ziri ezi, ma, le, nwusi-ọbara; O lere anya ezi omume, ma, le, iti-nkpu.


E, ezi-okwu aghọwo ihe anāhughi; ọzọ, onye nēsi n'ihe ọjọ wezuga onwe-ya nēme onwe-ya ihe-nkwata: Jehova we hu ya, ọ jọ njọ n'anya-Ya na ikpé ziri ezi adighi.


ọ buru na unu adighi-emeb͕u ọbìa, na nwa-nb͕ei, na nwanyi di-ya nwuru, ọ buru kwa na unu adighi-awusi ọbara nēmeghi ihe ọjọ n'ebe a, ọ buru kwa na unu adighi-ejeso chi ọzọ di iche iche ime onwe-unu ihe ọjọ:


Iwezuga ikpé ọ bula n'iru Onye kachasi ihe nile elu,


Nna na nne ka ha lelìworo nime gi; ọbìa ka ha jiworo nmeb͕u emeso n'etiti gi: nwa-nb͕ei na nwanyi di-ya nwuru ka ha meworo ihe-ike nime gi.


Otú a ka Jehova siri: N'ihi njehie atọ nke Israel, e, n'ihi anọ, ka M'nāgaghi-eme ka ahuhu-ya laghachi azu; n'ihi na ha reworo onye ezi omume n'ọla-ọcha, re kwa ob͕eye n'ihi akpukpọ-ukwu abua:


ha bu ndi nēghekpọso ájá ala n'isi ndi nēnweghi ike, ọ bu kwa uzọ ndi di ume-ala n'obi ka ha nēwezuga: ọzọ, nwoke na nna-ya nējekuru otù nwa-ab͕ọghọ ahu, ka ha we me ka aha nsọm ghara idi nsọ:


Dika agāsi na otù onye nāb͕apu n'iru ọdum, anu-ọhia bear we zute ya; o we ba n'ulo-ya dabere aka-ya na mb͕idi, agwọ we ta ya.


M'we si, Biko, nurunu, unu ndi-isi Jekob, na unu ndi-ikpe ulo Israel: ọ̀ bughi ihe diri unu, bú imara ikpé?


M'gābiakute unu nso ikpe ikpé; M'gābu kwa onye-àmà di ngwa megide ndi-mḅasi, na imegide ndi nākwa iko, na imegide ndi nāṅu iyi ugha, na imegide ndi nēmeḅu onye egoro ọlu n'ugwọ lu-ya na nwan yi di-ya nwuru na nwa-nḅei, ndi nēwezuga kwa ọbìa n'ihe-ya, ndi nādighi-atu agwu m, ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri.


Ma ahuhu gādiri unu, ndi-ode-akwukwọ na ndi-Farisi, ndi-iru-abua; n'ihi na unu nēmechi uzọ ala-eze elu-igwe n'iru madu: n'ihi na unu onwe-unu abataghi, unu adighi-ekwe kwa ndi nābata ka ha bata.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan