Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Aịzaya 10:14 - Bible Nso

14 akam achọtawo kwa àkù ndi nile di che iche dika akwu; na dika madu si achikọta àkwá arapuru arapu, otú a uwa nile ka mu onwem chikọtaworo: ma ọ dighi nke nēmeghari nkù, ma-ọbu nke nāsaghe ọnu, ma-ọbu nke nēbe ebe.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

14 Dịka mmadụ si agbatị aka nʼime akwụ nnụnụ, otu a ka m chịkọtara akụnụba mba dị iche iche, dịka mmadụ si achịkọta akwa ahapụrụ ahapụ, otu a ka m chịkọtara mba ụwa niile; Ọ dịghị onye megharịrị otu nku, maọbụ saghee ọnụ ya ime mkpọtụ!’ ”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Aịzaya 10:14
14 Iomraidhean Croise  

Ùnu amaghi ihe m'mere ndi nile nke ala ọzọ nile, mu onwem na nnam-hà? chi mba nile nke ala ọzọ nile, hà puru inaputa ala-ha n'akam ma-ọli?


Ọ buru na aṅuriam ọṅu n'ihi na àkùm riri nne, Na n'ihi na akam achọtawo àkú uku;


N'iru ntipia ka obi madu di elu, Ọ bu kwa n'iru nsọpuru ka obi ume-ala nāga.


nke were ntib͕u nēwezugaghi onwe-ya etib͕u ndi nile di iche iche nime nrubiga-ókè nke iwe, nke were nzogbu anēb͕ochighi azọb͕u mba nile n'iwe.


Mu onwem egwuwo olùlù-miri, ṅua miri, m'gēwere kwa ọbu-ukwu nke nzọli-ukwum me ka osimiri Nail nile nke Ijipt tasia.


Ahuhu gādiri ndi nātukwasi ulo n'ulo, ndi nēme ka ubi rue ubi nso, rue mb͕e ọnọdu adighi kwa ọzọ, ewe me ka nání unu biri n'etiti ala!


Idi-egwu-gi, nganga nke obi-gi arafuwo gi, gi onye bi na nb͕awa nile nke nkume ahu di elu, onye nējide ebe di elu nke ugwu ntà: n'ihi na asi na i me akwu-gi ka ọ di elu dika nke ugo, M'gēme ka i si n'ebe ahu ridata; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


Unu we were ọnu-unu me onwe-unu ka unu di uku imegidem, me ka okwu-unu ba uba imegidem: Mu onwem anuwo.


Ọ buru na i felie elu dika ugo, ọ buru kwa na ọ bu n'etiti kpakpando ka edoworo akwu-gi, n'ebe ahu ka M'gēme ka i si rida; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


Lutanu ọla-ọcha n'agha lutanu ọla-edo n'agha: ọ dighi kwa ọgwugwu diri àkù edoziri edozi, bú ebube nke sitere n'ihe nile anāchọsi ike.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan