Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Aịzaya 1:5 - Bible Nso

5 N'ìhi gini ka aganēti unu ihe rue ub͕u a, na unu nēwezuga onwe-unu kari? isi nile ọ bula nāria ọria, aru adighi kwa obi nile ọ bula ike.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

5 Gịnị mere a ga-eji nọgide na-eti unu ihe? Gịnị mere unu ji nọgide na nnupu isi? Lee ọnya juru unu isi, leekwa na ọrịa na-arịa obi unu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Aịzaya 1:5
25 Iomraidhean Croise  

Ọ we ziga kwa onye-isi ọgu ndi-agha abua na iri nke-atọ, ya na ọgu ndi-agha abua na iri ya. Onye-isi nke-atọ nke ọgu ndi-agha abua na iri we rigo, bia b͕ue ikperè-ya n'ala n'iru Elaija, riọ ya amara, si ya, Onye nke Chineke, biko, ka ndum, na ndu ọgu ndi-orù-gi abua na iri ndia, di oké ọnu-ahia n'anya-gi.


Ma na mb͕e nkpab͕u ahu akpab͕uru ya, o mekpuru emekpu kari imegide Jehova, bú eze Ehaz nka.


ndi-eze-ayi, na ndi-isi-ayi, na ndi-nchu-àjà-ayi, na nna-ayi-hà, ha emeghi kwa iwu-Gi, ha aṅaghi kwa nti n'ihe nile I nyere n'iwu na n'àmà-Gi nile, nke I b͕ara megide ha.


Ndi-isi-gi nēwezuga onwe-ha n'ebe M'nọ, ha bu kwa ndi ejikọtara ha na ndi-ori; onye ọ bula nime ha nāhu iri-ngo n'anya, nāb͕aso kwa ihe-nkwughachi: ọ dighi nwa-nb͕ei ha nēkpe ikpe ziri ezi, okwu-ikpe nke nwanyi di-ya nwuru adighi-abiakute kwa ha.


Laghachikutenu Onye ahu Nke umu Israel siri n'aka-Ya wezuga onwe-ha nke-uku.


Onye-obibi-ya agaghi-asi, Anamaria ọria: agēbupu ajọ omume nke ndi bi nime ya.


Ma ndi nka alaghachikuteghi Onye nētib͕u ha, ọ bughi kwa Jehova nke usu nile nke ndi-agha ka ha chọworo.


Manase gēmegide Efraim, Efraim gēmegide kwa Manase: ndi ahu abua gēmegide Juda. N'ihe a nile iwe-Ya alaghachighi azu, kama rue ub͕u a ka aka-Ya nēseti eseti.


Onye Etiopia, ọ̀ gāb͕anwe akpukpọ-aru-ya? ma-ọbu agu, ọ̀ gāb͕anwe agwa-ya? ọ buru otú a unu onwe-unu puru kwa ime ezi ihe, bú ndi emere ka unu muta ime ihe ọjọ.


Obi di aghughọ kari ihe nile, ihe nādighi ngwọta ka ọ bu kwa: ònye gāmara ya?


N'efu ka M'tib͕uworo umu-unu; ọ dighi ọdidọ-aka-na-nti ha natara: mma-agha-unu erichapuwo ndi-amuma-unu, dika ọdum nke nēbibi ebibi.


Ndikom ahu nile ndi mara na ndinyom-ha nēsurere chi ọzọ di iche iche ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, na ndinyom nile ndi nēguzo n'ebe ahu, ọ bu nkpọkọta di uku, ọbuná ndi Israel nile ndi bi n'ala Ijipt, nime Patros, ha we za Jeremaia, si,


Jehova, ànya-Gi abua adighi n'ebe ikwesi-ntukwasi-obi di? I tiwo ha ihe, ma o wutaghi ha; I mewo ka ha gwusia, ma ha ajuwo inara idọ-aka-na-nti: ha emewo ka iru-ha di ike nkume; ha ajuwo ilata.


ndi-amuma ebuwo amuma ugha, ndi-nchu-àjà nāzọda kwa ndim site n'aka-ha; ndim ahuwo kwa ihe di otú a n'anya: ma gini ka unu gēme n'ikpe-azu-ya?


ka M'jekuru ndi uku, gwa ha okwu; n'ihi na ndi ahu mara uzọ Jehova, na ikpé nke Chineke-ha. Ma ndi ahu ab͕ajiwo yoke n'otù, tijie ab͕u nile.


Ha we kwe ire-ha, dika uta-ha, ib͕a okwu-ugha dika àkú; ma ọ bughi n'ebe ikwesi-ntukwasi-obi di ka ha diworo ike n'ala: n'ihi na ha esiwo n'ihe ọjọ pukuru ihe ọjọ, ma Mu ka ha nāmaghi; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


N'ihi nka ka aru nādighi obi-ayi nma; N'ihi ihe ndia ka anya-ayi b͕aworo ọchichiri.


N'iru-árú-gi ka ajọ nzube di: n'ihi na emewom ka i di ọcha ma i dighi ọcha, i gaghi-esi kwa n'iru-árú-gi di ọcha ọzọ, rue mb͕e M'gēmewori ka ọnumam zuru ike n'aru gi.


Nke furu efu ka M'gāchọ, ọ bu kwa nke achufuru achufu ka M'gēwelata, ọkpukpu ab͕ajiri ab͕aji ka M'gēkezi kwa, nke aru-ya nādighi ike ka M'gēme kwa ka ọ di ike: ma nke mara abuba na nke di ike ka M'gēkpochapu; M'gāzù ha n'ikpé ziri ezi.


Unu emeghi ka ndi aru-ha nādighi ike di ike, unu agwọghi kwa nke nāria ọria, unu ekezighi kwa ọkpukpu b͕ajiri ab͕aji, unu eweghachighi kwa nke achufuru achufu, unu achọghi kwa nke furu efu; kama n'ike na nkpab͕u ka unu zọdaworo ha.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan