Aịzaya 1:26 - Bible Nso26 M'gēme kwa ka ndi-ikpe-gi laghachi dika na mbu, M'gēme kwa ka ndi nādu gi ọdu laghachi dika na nmalite: emesia agākpọ gi Obodo ezi omume, obodo nke kwesiri ntukwasi-obi. Faic an caibideilBaịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a26 Emesịa, aga m enye unu ndị na-ekpe ikpe ziri ezi. Ndị na-adụ unu ọdụ ga-abụkwa ndị nwere uche dịka ndị unu nwere na mbụ. Ọzọ, a ga-akpọ obodo unu Obodo Ezi Omume, Obodo kwesiri Ntụkwasị Obi.” Faic an caibideil |
agānu kwa ọzọ olu nke obi-utọ na olu ọṅù, na olu nke nwoke nālu nwunye ọhu na olu nke nwanyi anālu ọhu, na olu nke ndi nāsi, Kelenu Jehova nke usu nile nke ndi-agha, n'ihi na Jehova di nma, n'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di: na olu nke ndi nēwebata ekele n'ulo Jehova. N'ihi na M'gēme ka ndi ala nka adọtara n'agha lata dika na mbu; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.