Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Aịzaya 1:23 - Bible Nso

23 Ndi-isi-gi nēwezuga onwe-ha n'ebe M'nọ, ha bu kwa ndi ejikọtara ha na ndi-ori; onye ọ bula nime ha nāhu iri-ngo n'anya, nāb͕aso kwa ihe-nkwughachi: ọ dighi nwa-nb͕ei ha nēkpe ikpe ziri ezi, okwu-ikpe nke nwanyi di-ya nwuru adighi-abiakute kwa ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

23 Ndị ndu gị niile bụ ndị nnupu isi, ndị bụkwa ndị enyi ndị ohi, onye ọbụla nʼime ha hụrụ iri ngarị nʼanya, na-agbasokwa onyinye. Ha adịghị echebe ndị na-enweghị nna ikpe gbasara ndị inyom di ha nwụrụ adịghị abịa nʼihu ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Aịzaya 1:23
47 Iomraidhean Croise  

Ndi-isi nile nke ndi-nchu-àjà, na ndi Juda, mekpu-kwa-ra ihe-nmekpu ri nne, dika ihe-árú nile nke mba ọzọ si di; ha we merua ulo Jehova nke O doro nsọ nime Jerusalem.


Anara-kwa-la ihe-iri-ngo: n'ihi na ihe-iri-ngo nēme ka ndi nāhu uzọ kpu ìsì, ọ nēme kwa ka okwu ndi ezi omume b͕agọ ab͕agọ.


Ihe-iri-ngo ka onye nēmebi iwu nēweputa n'uwe-obi-ya, Iwezuga uzọ nile nke ikpé.


Onye ya na onye-ori nēkekọ ihe nākpọ nkpuru-obi ya onwe-ya asì: Ọb͕ub͕a-iyi ka ọ nānu, ma ọ dighi-egosi ihe ọ bula.


mutanu ime ezi ihe; chọnu ikpé ziri ezi, menu ka onye nēme ihe-ike gazi agazi, kpenu nwa-nb͕ei ikpe ziri ezi, kpenu ọnu nwayi di-ya nwuru.


Biko bianu, ka ayi rurita uka, bú ihe Jehova nāsi: ọ buru na nmehie-unu adi ka uwe uhie, ọ bu dika snow ka ha gādi ọcha; ọ buru na ha acha uhie uhie dika ogho uhie, ọ bu dika aji ọcha ka ha gādi.


Ọla-ọcha-gi aghọwo afuru-uzu; ihe-ọṅuṅu ọma gi, agwawo ya miri nke-uku.


N'ihi nka nurunu okwu Jehova, unu ndi nākwa emò, ndi nāchi ndi nka bi na Jerusalem:


Jehova gēso ndi-okenye nke ndi-Ya na ndi-isi-ha ba n'ikpé, si, Ma unu onwe-unu, unu eripiawo ubi-vine; ihe unu napuworo onye ewedara n'ala n'ike di n'ulo-unu nile:


Ahuhu gādiri umu nēwezuga onwe-ha, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta, ndi nēme ihe ezubeworo, ma o siteghi n'akam; ndi ji ihe-nkpuchi ekpuchi ihe, ma ọ bughi nke Mọm, ka ha we were nmehie tukwasi na nmehie:


Ọ bu onye nējeghari n'ezi omume nile, nke nēkwu kwa okwu nile ziri ezi; nke nāju urù nmeb͕u nile, nke nētichapu ọbu-aka-ya abua n'ijide ihe-iri-ngo, nke nākwuchi nti-ya abua ka ọ ghara inu okwu bayere iwusi ọbara, nke nātachi kwa anya-ya abua ka ọ ghara ilekwasi ihe ọjọ anya;


ndi nāgu onye nēmebi iwu n'onye ezi omume n'ihi iri-ngo, ha nēwezuga kwa ezi omume nke onye ezi omume n'aru ya!


Ab͕asawom akam abua ogologo ubọchi nile nye otù ndi nke nēwezuga onwe-ha, ndi nēje ije n'uzọ nādighi nma, nēso èchìchè nile nke aka ha;


Ma anya-gi abua na obi-gi adighi n'ihe ọ bula ma-ọbughi nání n'urù nēzighi ezi gi, na n'iwusi ọbara nēmeghi ihe ọjọ, na n'imeb͕u emeb͕u, na n'izọpia-azọpia, ime ya.


n'ihi ihe ọjọ ahu nile nke umu Israel na nke umu Juda, nke ha meworo ikpasum iwe, ha onwe-ha, na ndi-eze-ha, na ndi-isi-ha, na ndi-nchu-àjà-ha, na ndi-amuma-ha, na ndi Juda, na ndi bi na Jerusalem.


Dika ndi nēdebe ubi, otú a ka ha nọ nēmegide ya buruburu; n'ihi na Mu ka ọ nupuworo isi n'okpuru, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


ka M'jekuru ndi uku, gwa ha okwu; n'ihi na ndi ahu mara uzọ Jehova, na ikpé nke Chineke-ha. Ma ndi ahu ab͕ajiwo yoke n'otù, tijie ab͕u nile.


N'ihi ya ọdum nke sitere n'oké ọhia gētib͕u ha, anu-ọhia wolf nke ala ihe nādighi gēbibi ha, agu ganēche obodo nile ha anya, agādọb͕u onye ọ bula nke nāpu nime ha: n'ihi na njehie-ha di ọtutu, ndaghachi-azu nile nke ha di kwa ike.


Nwa nke madu, n'etiti ulo nnupu-isi ahu ka i bi, bú ndi nwere anya ihu uzọ, ma ha ahughi, ndi nwere nti inu ihe, ma ha anughi; n'ihi na ulo nnupu-isi ka ha bu.


Ndi-isi-ya n'etiti ya di ka anu-ọhia ọdum nādọb͕u anu-ndọb͕u; iwusi ọbara, ime ka nkpuru-obi madu la n'iyì, ka ha we rita urù nēzighi ezi.


Iṅubiga-manya-ókè-ha ewezugawo onwe-ya: ha akwachiwo iko nti; ndi bu ọta-ha ahuwo ihere n'anya nke-uku.


Ndi-isi Juda adiwo ka ndi nēwezuga ókè-ala: n'aru ha ka M'gāwukwasi nrubiga-ókè nke iwem dika miri.


Ihe ọjọ nile ha di nime Gilgal: n'ihi na n'ebe ahu ka M'kpọrọ ha asì: n'ihi ihe ọjọ nke omume nile ha ka M'gāchupu ha n'ulom: M'gaghi-ahu kwa ha n'anya ọzọ; ndi-isi-ha nile bu ndi nēwezuga onwe-ha.


N'ihi na amawom na ihe bara uba ka njehie-unu bu, na ihe di ike ka nmehie nile unu bu; unu ndi nākpab͕u onye ezi omume, ndi nānara ihe-nb͕aputa, ma ọ bu umu-ob͕eye di n'ọnu-uzọ-ama-unu ka unu nēwezuga n'ikpe-ha.


Ndi-isi-ya nēkpe ikpe n'ihi iri-ngo, ndi-nchu-àjà-ya nēzí ihe n'ihi ugwọ, ndi-amuma-ya nāju ase n'ihi ego: ma na Jehova ka ha nādabere, si, Jehova, Ọ̀ nọghi n'etiti ayi? ihe ọjọ agaghi-abiakwasi ayi.


Biko, nurunu nka, unu ndi-isi ulo Jekob, na unu ndi-ikpe ulo Israel, ndi nākpọ ikpé ziri ezi ihe-árú, ọ bu kwa izi-ezi nile ka ha nēme ka ọ b͕agọrọ ab͕agọ.


N'ihi na ndi-ọgaranya-ya juputara n'ihe-ike, ndi bi nime ya ekwuwo kwa okwu-ugha, ire-ha di kwa aghughọ n'ọnu-ha.


Ọ bu n'elu ihe ọjọ ka ọbu-aka-ha abua di ime ya nke-ọma; onye-isi nāriọ, onye-ikpe ewe jikere n'ihi ugwọ; onye uku kwa, onye nēkwu ihe-ila-n'iyì nke nkpuru-obi-ya ka ọ bu: ha we tukọta ya dika udọ̀.


unu emeb͕u-kwa-la nwanyi di-ya nwuru, na nwa-nb͕ei, na ọbìa, na onye ewedara n'ala; unu echè-kwa-la ihe ọjọ n'obi-unu, onye ọ bula megide nwa-nne-ya.


M'gābiakute unu nso ikpe ikpé; M'gābu kwa onye-àmà di ngwa megide ndi-mḅasi, na imegide ndi nākwa iko, na imegide ndi nāṅu iyi ugha, na imegide ndi nēmeḅu onye egoro ọlu n'ugwọ lu-ya na nwan yi di-ya nwuru na nwa-nḅei, ndi nēwezuga kwa ọbìa n'ihe-ya, ndi nādighi-atu agwu m, ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri.


Ndi-okenye Moab na ndi-okenye Midian we je, ihe nile iji ju ase di kwa n'aka-ha; ha we biakute Belam, gwa ya okwu nile nke Belak.


Ọ si ha, Edewo ya n'akwukwọ nsọ, si, Agākpọ ulom ulo ekpere: ma unu onwe-unu nēme ya ọb͕à ndi nāpunara madu ihe.


O we zí ihe, si ha, Èdeghi ya n'akwukwọ nsọ, si, Agākpọ ulom ulo ekpere mba nile? ma unu onwe-unu emewo ya ọb͕à ndi nāpunara madu ihe.


nāsi ha, Edewo ya n'akwukwọ nsọ, si, Ulom gābu kwa ulo ekpere: ma unu onwe-unu mere ya ọb͕à ndi nāpunara madu ihe.


O we malite isi n'akwukwọ Moses, si kwa n'akwukwọ ndi-amuma nile, me ka ha mata isi okwu bayere Onwe-ya n'ihe nile edeworo n'akwukwọ nsọ.


Ewezugala ikpé; amatala iru madu n'ikpé: anara-kwa-la ihe-iri-ngo; n'ihi na ihe-iri-ngo nēme ka anya ndi mara ihe kpu ìsì, ọ nēme kwa ka okwu nile nke ndi ezi omume b͕agọ ab͕agọ.


Okpukpe-Chineke nke di ọcha nke anēmerughi kwa emeru n'iru Chineke-ayi, bú Nna-ayi, bu nka, ileta umu-nb͕ei na ndinyom di-ha nwuru nime nkpab͕u-ha, na idebe onwe-ya nēnweghi ntupọ site n'uwa.


Ma umu-ya ndikom ejeghi kwa ije n'uzọ-ya nile, ha we wezuga onwe-ha soro urù nēzighi ezi, ha we nara ihe-iri-ngo, wezuga ikpé.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan