Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Aịzaya 1:21 - Bible Nso

21 Ò si-kwa-ra aṅa ghọ nwanyi nākwa iko, bú obodo ahu kwesiri ntukwasi-obi? obodo ahu nke juputara n'ikpé ziri ezi! ezi omume nānọri ọnọdu-abali nime ya, ma ub͕u a ndi-ob͕u-madu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

21 Lee ka obodo ahụ kwesiri ntụkwasị obi aghọọla onye akwụna! Ọ bụ nke jupụtararị nʼikpe ziri ezi; ezi omume na-anọbu nʼime ya, ma ugbu a, ọ bụzi ndị ogbu mmadụ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Aịzaya 1:21
31 Iomraidhean Croise  

Devid we buru eze Israel nile; Devid we nēmere ndi-ya nile ihe ekpere n'ikpe na ezi omume.


O nye ha iwu, si, Otú a ka unu gēme n'egwu Jehova, na n'ikwesi-ntukwasi-obi, na n'obi zuru okè.


Ndi-isi ndi-Ju we biri na Jerusalem: ndi-Ju fọduru fe-kwa-ra nzà, ime ka otù onye nime madu iri bata ibi na Jerusalem, bú obodo nsọ, ka uzọ iteghete ndi fọduru biri kwa n'obodo ọzọ.


Otù osimiri di, miri-iyi-ya nile nēme ka obodo Chineke ṅuria ọṅu, Bú ebe nsọ nke ebe-obibi nile nke Onye kachasi ihe nile elu.


Onye uku ka Jehova bu, Ọ bu kwa onye anēto nke-uku, N'obodo Chineke-ayi, bú ugwu nsọ Ya.


Dika ayi nuworo, otú a ka ayi huworo N'obodo Jehova nke usu nile nke ndi-agha, n'obodo Chineke-ayi: Chineke gēme ka o guzosie ike rue mb͕e ebighi-ebi. Selah


Ọla-ọcha-gi aghọwo afuru-uzu; ihe-ọṅuṅu ọma gi, agwawo ya miri nke-uku.


Asi na emere onye nēmebi iwu amara, ọ gaghi-amuta ezi omume; n'ala nke izi-ezi nile ọ gēme ajọ omume, ma ọ gaghi-ahu idi-elu nke Jehova.


N'ihi na ha akpọwo onwe-ha ndi sitere n'obodo nsọ, ọ bu kwa Chineke Israel ka ha dabereworo; Jehova usu nile nke ndi-agha bu aha-Ya.


N'ihi na ubi-vine nke Jehova nke usu nile nke ndi-agha bu ulo Israel, ndi Juda bu kwa ihe-ọkukú nātọ Ya utọ nke-uku: O we le anya ikpe ziri ezi, ma, le, nwusi-ọbara; O lere anya ezi omume, ma, le, iti-nkpu.


Emewo kwa ka ikpe ziri ezi laghachi azu, ezi omume nēguzo kwa n'ebe di anya: n'ihi na ezi-okwu asuwo ngọngọ n'amá, izi-ezi apughi kwa ibata.


E, ezi-okwu aghọwo ihe anāhughi; ọzọ, onye nēsi n'ihe ọjọ wezuga onwe-ya nēme onwe-ya ihe-nkwata: Jehova we hu ya, ọ jọ njọ n'anya-Ya na ikpé ziri ezi adighi.


N'ihi na ejiwo ọbara meru aka-unu, ejiwo kwa ajọ omume meru nkpisi-aka-unu; eb͕ub͕ere-ọnu-unu ekwuwo okwu-ugha, ire-unu nātamu ajọ ihe.


Ọ si, Le, ọ buru na nwoke achupu nwunye-ya, nwayi ahu ewe si n'ebe ọ nọ la, we ghọ nwunye nke nwoke ọzọ, di mbu ya, ọ̀ gālu kwa ya ọzọ? àgaghi-emeru ala ahu emeru nke-uku? Ma gi onwe-gi akwawo iko, gi na ọtutu ndi-iko: ì si na i gālaghachikutem? ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


Efraim ji okwu-ugha ab͕am buruburu, ọ bu kwa aghughọ ka ulo Israel ji: Juda nọ kwa nālupu alupu n'aka Chineke, bú n'aka Onye kachasi nsọ Nke kwesiri ntukwasi-obi.


N'ihi na nne-ha akwawo iko: nwanyi nke turu ime ha emewo ihe-ihere: n'ihi na ọ siri, Ka m'jeso ndi nāhum n'anya, ndi nēnyem nrim na mirim na aji-anum na flax nkem na manum na ihe-ọṅuṅum.


N'ihi nka ka iwu nēsinwu, ikpe ziri ezi adighi-aputa kwa rue mb͕e ebighi-ebi: n'ihi na onye nēmebi iwu nāb͕a onye ezi omume buruburu; n'ihi nka ka ikpé nāputa buru ihe b͕agọrọ ab͕agọ.


Otú a ka Jehova siri: Alaghachiwom na Zaion, M'gēbi kwa n'etiti Jerusalem: agākpọ kwa Jerusalem Obodo ezi-okwu; agākpọ kwa ugwu nke Jehova nke usu nile ndi-agha Ugwu nsọ.


Jerusalem, Jerusalem, nke nēb͕u ndi-amuma, nke nēwere kwa nkume atu ndi eziteworo ya! ọ̀tutu mb͕e ole ka M'chọrọ ichikọ umu-gi, ọbuná dika nnekwu-ọkuku nāchikọ umu nke aka ya n'okpuru nkù-ya abua, ma unu achọghi!


Onye nime ndi-amuma ka nna-unu-hà nēsob͕ughi? ha we b͕ue ndi buru uzọ kwusa okwu bayere ọbibia nke Onye ezi omume ahu; Onye unu onwe-unu ghọrọ ub͕u a ndi rara Ya nye na ndi b͕uru Ya:


kama unu abiaruwo ugwu Zaion, na obodo nke Chineke di ndu, bú Jerusalem nke di n'elu-igwe, na ọtutu ndi anāpughi iguta ọnu,


Ma obí nke di n'èzí ulo nsọ ahu, rapu ya n'èzí, atù-kwa-la; n'ihi na ewerowo ya nye ndi mba ọzọ: ha gāzọda kwa obodo nsọ ahu ọgu ọnwa abua na abua.


Ozu-ha we di n'amá nke obodo uku ahu, bú nke anākpọ Sọdọm na Ijipt n'uzọ nke Mọ Nsọ, ebe akpọgide-kwa-ra Onye-nwe-ha n'obe.


Otù mọ-ozi n'etiti ndi-mọ-ozi asa ahu ndi nwere ọkwa asa ahu we bia, we kpayerem uka, si, Biari, m'gēgosi gi ikpé nke oké nwanyi ahu nākwa iko onye nānọkwasi n'ọtutu miri;


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan