Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Aịzaya 1:20 - Bible Nso

20 ma ọ buru na unu aju, we nupu isi, mma-agha gērichapu unu: n'ihi na ọnu Jehova ekwuwo.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

20 Ma ọ bụrụ na unu ajụ ma nupu isi, ọ bụ mma agha ka a ga-eji gbuchapụ unu.” Nʼihi na ọnụ Onyenwe anyị ekwula ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Aịzaya 1:20
24 Iomraidhean Croise  

Ma ọ buru na ha adighi-anu ha gāla n'iyì site n'ihe-agha, Kubìe ume nēnweghi ọmuma-ihe.


N'ihi na, ma ọ buru na gi onwe-gi nāju izipu ha, ma i nējigide ha,


Ahuhu gādiri onye nēmebi iwu! ọ gādiri ya njọ: n'ihi na nmeso aka-ya abua mesoro madu ka agēme ya.


Ndikom-i gāda site na mma-agha, idi-ike-gi nile gāda kwa n'agha.


Chọputanu n'akwukwọ Jehova, gua: ọ dighi otù nime ndia fọduru inọ ya, otù eleghi anya ibe-ya ma ọ biagh: n'ihi na ọnum, nke ahu nyere iwu, Mọ-Ya kwa, Ya onwe-ya chikọtara ha.


agēkpughe kwa ebube Jehova, anu-aru nile, bú madu, gāhukọ kwa ya n'otù: n'ihi na ọnu Jehova ekwuwo.


mb͕e ahu ihe Jehova gātọ gi utọ; M'gēme kwa ka i nọkwasi ebe nile di elu nke uwa dika inyinya; M'gēme kwa ka i rie ihe-nketa nke Jekob, bú nna-gi: n'ihi na ọnu Jehova ekwuwo.


M'gāgukọta unu nye mma-agha, unu nile gēruru kwa ala ka ewe b͕ue unu; n'ihi na akpọrọm unu òkù, ma unu azaghm; ekwurum okwu, ma unu anughi; unu we me ihe jọrọ njọ n'anyam abua, ọ bu kwa ihe nke nātọghm utọ ka unu rọputara.


N'ihi na ndi nka ajuwo miri Shailoa nke nāga nwayọ, ma obi-utọ-ha di n'ebe Rezin na nwa Remalaia nọ;


Ma ọ buru na unu egeghm nti ido ubọchi-izu-ike nsọ, na ighara ibū ibu bata n'ọnu-uzọ-ama nile nke Jerusalem n'ubọchi-izu-ike; M'gēsuye kwa ọku n'ọnu-uzọ-ama-ya nile, ọ gērichapu kwa ulo-elu nile nke Jerusalem, agaghi-emenyu kwa ya.


Ndi nka ka i gāsi kwa, Otú a ka Jehova siri: Le, M'nēche n'iru unu uzọ ndu na uzọ ọnwu.


I gāsi kwa ha, Otú a ka Jehova siri: Ọ buru na unu egeghm nti, ijehari n'iwum nke M'tiyeworo n'iru unu,


Dika ndi nēdebe ubi, otú a ka ha nọ nēmegide ya buruburu; n'ihi na Mu ka ọ nupuworo isi n'okpuru, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


Gosinu n'Ijipt, menu ka anuru ya na Migdol, me-kwa-nu ka anuru nime Nof na nime Tahpanhes: sinu, Guzo onwe-gi, dozi-kwa-ra onwe-gi; n'ihi na mma-agha eripiawo buruburu gi.


M'gēme kwa ka mma-agha biakwasi unu, nke nābọ̀ ọ́bọ̀ ọb͕ub͕a-ndum; agāchikọta kwa unu nime obodo nile unu: M'gēzite kwa ajọ ọria nēfe efe n'etiti unu; agēnye kwa unu n'aka ndi-iro.


Unu ka M'gēfesa kwa n'etiti mba nile, M'gāmipu kwa mma-agha chua unu n'azu: ala-unu gābu kwa ebe tọb͕ọrọ n'efu, obodo-unu nile gābu kwa nkpọnkpọ ebe.


Ma ha gēbi, onye ọ bula n'okpuru osisi vine ya na n'okpuru osisi fig ya; ọ dighi kwa onye gēme ka ha ma jijiji: n'ihi na ọnu nke Jehova nke usu nile nke ndi-agha ekwuwo okwu.


Chineke abughi madu, nke O gēkwu okwu-ugha; Ọ bughi kwa nwa madu, nke Ọ gēlogha: Ọ̀ bu na Ya onwe-ya asiwo na Ọ gēme ihe, ma O meghi ya? Ma-ọbu Ò kwuwo okwu, ma O meghi ya ka o guzosie ike?


n'olile-anya nke ndu ebighi-ebi, nke Chineke, Onye nāpughi ikwu okwu-ugha, kwere nkwa ya tutu mb͕e ebighi-ebi erue;


ma ọ buru na unu egeghi nti olu Jehova, kama unu nānupu isi n'okwu-ọnu Jehova, aka Jehova gādi kwa imegide unu, otú ọ di imegide nna-unu-hà.


Ma ọ buru na unu eme ihe ọjọ nāga n'iru, agēkpochapu unu, ma unu onwe-unu ma eze-unu.


Ọzọ kwa, Ebube Israel agaghi-ekwu okwu-ugha, Ọ gaghi-echeghari kwa: n'ihi na Ọ bughi madu nke Ọ gēji cheghari.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan