Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Aịzaya 1:18 - Bible Nso

18 Biko bianu, ka ayi rurita uka, bú ihe Jehova nāsi: ọ buru na nmehie-unu adi ka uwe uhie, ọ bu dika snow ka ha gādi ọcha; ọ buru na ha acha uhie uhie dika ogho uhie, ọ bu dika aji ọcha ka ha gādi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

18 “Bịanụ ka anyị kparịtaa ụka,” bụ ihe Onyenwe anyị na-asị. “A sịkwarị na mmehie unu dị ka uwe uhie, ha ga-adị ọcha dịka akụmmiri igwe, a sịkwa na ha dị uhie uhie dịka ogho uhie, ha ga-adịkwa ka ajị anụ ọcha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Aịzaya 1:18
23 Iomraidhean Croise  

Ọ dighi odozi-okwu di n'etiti ayi, Nke gātukwasi ayi abua aka-ya.


I gēwere hyssop wepu nmehiem, m'gādi kwa ọcha: I gāsucham dika ákwà, m'gādi kwa ọcha kari snow.


Zopu iru-Gi na nmehiem nile, Hichapu kwa ajọ omumem nile.


Ndi-isi-gi nēwezuga onwe-ha n'ebe M'nọ, ha bu kwa ndi ejikọtara ha na ndi-ori; onye ọ bula nime ha nāhu iri-ngo n'anya, nāb͕aso kwa ihe-nkwughachi: ọ dighi nwa-nb͕ei ha nēkpe ikpe ziri ezi, okwu-ikpe nke nwanyi di-ya nwuru adighi-abiakute kwa ha.


Jehova nēguzo Onwe-ya ikpe ọnu-Ya, Ọ nēguzo kwa ikpe ndi nile di iche iche.


B͕anu nkiti gem nti, unu agwe-etiti; ka ndi nile di iche iche b͕anwe kwa ike-ha: ka ha biarue nso; ka ha kwue okwu: ka ayi biarue onwe-ayi nso ikpe ikpe.


Wetanu okwu-ikpe-unu nso, ka Jehova nāsi; butenu ihe nile unu dabere nso, ka Eze Jekob nāsi.


Ehichapuwom njehie-gi nile, dika oké igwe-oji, hichapu kwa nmehie-gi nile, dika igwe-oji: Iaghachikutem; n'ihi na ab͕aputawom i.


Onye nāgum n'onye ezi omume di nso: ọdi onye mu na ya gēkpe? ka ayi guzo ọtọ n'otù: ònye bu onye ahu nwere okwu-ikpe ikwugidem? ya biakutem nso.


onye nēmebi iwu, ya rapu uzọ-ya, onye nēme ajọ ihe, ya rapu èchìchè-ya nile: ya laghachikute kwa Jehova, Ọ gēnwe kwa obi-ebere n'aru ya; ya laghachikute kwa Chineke-ayi, n'ihi na Ọ gāb͕aghara ya nmehie-ya n'uba.


otú a ka Jehova siri, Àjọ omume gini ka nna-unu-hà huworo n'arum, na ha esiwo n'ebe M'nọ je n'ebe di anya, we jeso ihe-efu, we ghọ ihe-efu?


Ma mb͕e onye nēmebi iwu si na nmebi-iwu-ya nke o meworo chigharia, me ihe ekpere n'ikpe na ezi omume, ya onwe-ya gēme ka nkpuru-obi-ya di ndu.


Nmehie-ya nile nke o mehieworo agaghi-echeta ha megide ya: ihe ekpere n'ikpe na ezi omume ka o meworo; ọ ghaghi idi ndu.


Unu ugwu, nurunu okwu ikpe Jehova; nu-kwa-nu, unu ntọ-ala uwa nke nādigide mb͕e nile: n'ihi na Jehova na ndi-Ya nēkperita ikpe, ọ bu kwa Israel ka Ọ gāruso uka.


Pọl dika ọ nēme mb͕e dum, we bakuru ha, ogologo ubọchi-izu-ike atọ ọ nāgwa kwa ha okwu site n'ihe edeworo n'akwukwọ nsọ,


O nēkwu kwa okwu n'ulo-nzukọ ubọchi-izu-ike nile n'otù n'otù, we nēme ka ndi-Ju na ndi-Grik kweye.


Mb͕e ọ nēkwu okwu bayere ezi omume, na imerū ihe okè, na ikpé ahu nke gaje ibia, Filiks we tua egwu, o we za, si, Ga nke gi n'oge a; mb͕e m'nwere oge m'gākpọ kwa gi.


Iwu we b͕ebà, ka ndahie ahu we rie nne; ma n'ebe nmehie riri nne, n'ebe ahu ka amara babigara ókè nke-uku kari:


M'we si ya, Onye-nwem, gi onwe-gi matara. O we sim, Ndia bu ndi nēsi n'oké nkpab͕u ahu puta, ha sa-kwa-ra uwe-nwuda-ha, me kwa ka ha di ọcha nime ọbara Nwa-aturu ahu.


Ma ub͕u a, guzonu onwe-unu, ka mu na unu we kpe ikpe n'iru Jehova bayere ezi omume nile nke Jehova, nke O mere unu na nna-unu-hà.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan