Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Aịzaya 1:15 - Bible Nso

15 Ọzọ, mb͕e unu nāb͕asa ọbu-aka-unu abua, M'gēzonari unu anyam abua: ọbuná mb͕e unu nēkpe ọtutu ekpere, M'gaghi-adi nānu: aka-unu juputara n'ọbara.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

15 Mgbe unu na-agbasa aka unu nʼekpere, agaghị m aṅa unu ntị; ọ bụladị mgbe unu na-ekpe ọtụtụ ekpere, agaghị m aṅa ntị.” Nʼihi na aka unu jupụtara nʼọbara!

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Aịzaya 1:15
36 Iomraidhean Croise  

Solomon we guzo n'iru ebe-ichu-àjà Jehova n'iru nkpọkọta nile nke Israel, we b͕asa ọbu-aka-ya abua n'ebe elu-igwe di:


O rue, mb͕e Solomon kpebìri ekpere a nile na aririọ-amara a nile nye Jehova, na o siri n'iru ebe-ichu-àjà Jehova bilie, site n'ib͕u ikperè-ya abua n'ala, site kwa n'ime ka aka-ya abua b͕asa n'ebe elu-igwe di.


Ma na mb͕e onyinye-inata-iru-ọma nke anyasi, esirim n'iweda onwem n'ala bilie, ọbuná na ndọwa na uwe-nwudam; m'we ruru ala n'ikperèm b͕asara Jehova, bú Chinekem, ọbu-akam abua;


Ihe-egwu nēru ya aru dika miri; Oké ifufe ezupuwo ya n'abali.


N'ezie Chineke agaghi-anu ihe-efu, Onye puru ime ihe nile agaghi-ekiri kwa ya.


Chilienu aka-unu elu n'idi-nsọ, Gọzi kwa Jehova.


Ge nti n'ekperem, Chineke; Ezonari-kwa-la Onwe-gi n'aririọ-amaram.


Ọ buru na ọ bu ajọ ihe ka m'leworo anya nime obim, Onye-nwe-ayi agaghi-anu olum:


Moses we si ya, Mb͕e m'si n'obodo pua, M'gāb͕asara Jehova ọbu-akam abua; éb͕è-elu-igwe nile gākwusi, ákú-miri-ígwé agaghi-adi kwa ọzọ; ka i we mara na Jehova nwe uwa.


Mb͕e ahu ka ha gākpọkum, ma m'gaghi-aza; Ha gāchọsim ike, ma ha agaghi-achọtam:


Anya di elu, na ire okwu-ugha, Na aka nāwusi ọbara nēmeghi ihe ọjọ;


mb͕e Onye-nwe-ayi gāsachapuwori inyi umu-ndinyom Zaion, ṅachapu kwa ọbara Jerusalem n'etiti ya, site na Mọ nke ikpé, na site na Mọ nke nkpochapu.


N'ezie Gi onwe-gi bu Chineke Nke nēzobe Onwe-gi, Gi Chineke Israel, bú Onye-nzọputa.


Le, ọ bu n'ihi ise-okwu na ilu-ọ̀gù ka unu nēbu ọnu, ya na iwere ọkpọ nke nmebi-iwu tib͕ue: unu adighi-ebu ọnu dika ta ime ka anuru olu-unu n'elu.


Ọ̀ bughi ikèsara onye agu nāgu nri-gi, ka i me kwa ndi ewedara n'ala ndi nāwaghari awaghari ka ha bata n'ulo-gi? mb͕e i huru onye b͕a ọtọ, ka i kpuchie ya: ka i ghara kwa izonari onye-aru-gi onwe-gi?


Ọ dighi kwa onye nākpọku aha-Gi, nke nākpọte onwe-ya ijide Gi: n'ihi na I zonariwo ayi iru-Gi, we me ka ayi b͕aze site n'aka ajọ omume nile nke ayi.


M'gēchere kwa Jehova, Nke nēzonari ulo Jekob iru-Ya, m'gēle kwa anya Ya.


N'ihi nka ka Jehova ji si otú a, Le, M'gaje ime ka ihe ọjọ, nke ha nāpughi isi nime ya puta, biakute ha; ha gētikukwam, ma M'gaghi-ege ha nti.


M'gbe ha nēbu ọnu, M'gaghi-nānu iti-nkpu-ha; ọzọ, mb͕e ha nēsure àjà-nsure-ọku na onyinye-inata-iru-ọma, ihe-ha agaghi-nātọm utọ: kama mma-agha na oké unwu n'ajọ oria na-efe efe ka M'gaje iji me ka ha gwusia.


N'ihi na olu dika nke nwanyi ime nēme ka m'nuworo, ihe-nb͕u dika nwanyi nāmu nwa mbu ya, bú olu nke ada Zaion, o nēku ike ike, ọ nāb͕asa ọbu-aka-ya abua, si, Ahuhu dirim nọ̄! n'ihi na nkpuru-obim nāda #mbà n'iru ndi-ob͕u-madu.


Unu emewo ka ndi-unu eb͕uru eb͕u n'obodo a ba uba, unu emejuwo kwa èzí nile ya na ndi eb͕uru eb͕u.


Nwa nke madu, ndikom ndia emewo ka arusi nile ha ba n'obi-ha, ọ bu kwa ihe-isu-ngọngọ nke ajọ omume-ha ka ha tiyere na ncherita-iru ha: #M'gēkwe ka ha juam ase ma-ọli?


Mba nile gāma kwa na ọ bu n'ihi ajọ omume-ha ka emere ka ulo Israel je biri n'ala ọzọ; n'ihi na ha mekpuru emekpu megidem, M'we zonari ha irum: M'we nye ha n'aka ndi nākpab͕u ha, ha we site na mma-agha, ha nile.


Ha gāchiri ìgwè ewu na aturu-ha na ìgwè ehi-ha je ichọ Jehova; ma ha agaghi-achọta Ya: O seputawo Onwe-ya n'aru ha.


Mb͕e ahu ka ha gētiku Jehova nkpu, ma Ọ gaghi-aza ha: Ọ gēzonari kwa ha iru-Ya na mb͕e ahu, dika ha meworo ka omume nile ha jọ njọ.


O rue na, dika Ọ kpọrọ òkù, ma ha anughi; otú a ka ha gākpọ òkù, ma M'gaghi-anu; otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri;


Ma ahuhu gādiri unu, ndi-ode-akwukwọ na ndi-Farisi, ndi-iru-abua; n'ihi na unu nēmechi uzọ ala-eze elu-igwe n'iru madu: n'ihi na unu onwe-unu abataghi, unu adighi-ekwe kwa ndi nābata ka ha bata.


Ma mb͕e unu nēkpe ekpere, unu ekwula okwu-nkwukwasi efù, dika ndi mba ọzọ nēme: n'ihi na ha nēchè na agānu olu-ha n'ọtutu okwu ha nēkwu.


Ayi matara na Chineke adighi-anu olu ndi-nmehie: kama ọ buru na onye ọ bula bu onye nēbi isi ala nye Chineke, nēme kwa ihe Ọ nāchọ, onye ahu ka Ọ nānu.


Ya mere ezuberem ka ndikom nēkpe ekpere n'ebe nile ọ bula, nāchili aka di ọcha elu, nēweghi iwe, nārughi kwa uka.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan