Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Abụ Ọma 92:3 - Bible Nso

3 Nēji ubọ nke akwara iri, nēji kwa une; Nēji higgaion n'elu ubọ-akwara.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

3 jiri ihe iti egwu ụbọ akwara na une bụọrọ gị abụ dị ụtọ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Abụ Ọma 92:3
17 Iomraidhean Croise  

Devid na Israel nile nēwere ike-ha nile gba egwú n'iru Chineke, were kwa abù, were kwa ubọ-akwara, na une, na egwú-otiti, na ájà, na opì.


Devid we si ndi-isi ndi Livai ka ha me umu-nne-ha, bú ndi-ọbù-abù, ka ha guzo chiri ihe abù, bú une, na ubọ-akwara, na ájà, nēme ka anu udà-ha, iweli olu n'elu n'ihi ọṅù.


na iguzo kwa-ututu ikele na ito Jehova, otú a kwa n'anyasi;


Ndia nile nọ n'aka nna-ha n'ibù abù n'ulo Jehova, chiri ájà, na une, na ubọ-akwara, iji fè òfùfè nke ulo Chineke; ha nọ n'aka eze, bú Esaf, na Jedutun, na Himan.


Ha we chiri une, na ubọ-akwara, na opì, biarue Jerusalem rue ulo Jehova.


otù uzọ n'uzọ atọ gānọ kwa n'ulo eze, otù uzọ n'uzọ atọ kwa n'ọnu-uzọ-ama nke ntọ-ala: ndi Juda nile gānọ kwa n'ogige ulo Jehova nile.


O we guzo ndi Livai n'ulo Jehova, ndi chiri ájà, na une, na ubọ-akwara, dika ihe ahu si di nke Devid, na Gad, bú onye-ọhu-uzọ nke eze, na Netan, bú onye-amuma, nyere n'iwu: n'ihi na o sitere n'aka Jehova, bú ihe ahu enyere n'iwu, site n'aka ndi-amuma-Ya.


Ma n'ira mb͕idi Jerusalem nye Chineke ha chọputara ndi Livai n'ebe-ha nile, ime ka ha biarue Jerusalem, ime ememe nke ira mb͕idi Jerusalem nye Chineke, ọbuná n'iṅuri-ọṅu, na n'ikele-ekele, na n'ibù-abù, n'ájà na une na n'ubọ-akwara.


Ka ha to aha-Ya n'ite-egwú: Ka ha chiri egwú-otiti na ubọakwara bùkue Ya abù ọma.


Werenu ubọ-akwara kele Jehova: Werenu une nke akwara iri bùkue Ya abù ọma.


Ka m'si Chineke, bú nkumem di elu, N'ìhi gini ka I chezọworom? N'ìhi gini ka m'nējeghari nēyi uwe-nkpe nime nmeb͕u onye-iro?


Teta, nsọpurum; teta, une na ubọ-akwara: M'gākpọte chi-ọbubọ.


Ndi-abù buru uzọ ga, ndi-ubọ-akwara soro n'azu, N'etiti umu-ab͕ọghọ ndi nēti egwú-otiti.


Jehova emewo ka amara Ya onwe-ya, ezi ikpe ka O kpeworo: N'ọlu nke ọbu-aka-ya abua ka amaworo onye nēmebi iwu dika n'ọnyà. Higgaion. Selah


Emesia i gābiaru ugwu ntà Chineke, ebe ebe-nguzo-ndi-agha ndi Filistia di: ọ gēru kwa, mb͕e i biara n'ebe ahu rue obodo ahu, na i gēzute usu ndi-amuma ndi si n'ebe di elu ahu nārida; une na egwú-otiti na ọja na ubọ-akwara di kwa n'iru ha; ndi ahu ganēbu kwa amuma:


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan