Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Abụ Ọma 9:2 - Bible Nso

2 M'gāṅuri ọṅu, obim gātọkwam utọ, nime Gi: M'gābùku aha-Gi abù ọma, Gi Onye kachasi ihe nile elu;

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

2 Obi ga-atọ m ụtọ; obi m ga-ejupụta nʼọṅụ nʼihi gị, aga m abụrụ gị abụ otuto, gị Onye kachasị ihe niile elu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Abụ Ọma 9:2
18 Iomraidhean Croise  

M'gēji obim nile kele Gi: N'iru chi nile ka m'agābùku Gi abù ọma.


Ime ka ege nti olu ekele, Na ikọ akukọ bayere oké ọlu-Gi nile.


Ma ub͕u a agēbuli isim elu n'elu ndi-irom dim buruburu; M'ga-achukwa àjà nke iti-nkpu n'ulo-ikwū-Ya; M'gābù abù, m'gābùku kwa Jehova abù ọma.


Jehova bu ikem na ọtam; Ya ka obim tukwasiworo obi, eyewo-kwa-ram aka: Obim we nāwuli elu n'ọṅù; M'gēsite kwa n'abùm kele Ya.


M'gābiaru kwa ebe-ichu-àjà nke Chineke, Rue Chineke aru, bú ọṅù nke otite-egwú-ọṅùm: M'gēkele kwa Gi n'ubọ-akwara, Chineke, bú Chinekem.


Ma ka ndi nile ndi nābabà nime Gi ṅuria, Ka ha tie nkpu ọṅù rue mb͕e ebighi-ebi, n'ihi na I nēkpuchi ha ǹdò: Ọzọ, ka obi nke ndi nāhu aha-Gi n'anya tọ ha utọ nime Gi.


M'gēkele Jehova dika ezi omume-Ya si di: M'gābùku kwa aha Jehova, bu Onye kachasi ihe nile elu, abù ọma.


Ka ha we mara na Gi onwe-gi, Onye aha-Gi bu Jehova, nání Gi, Bu Onye kachasi ihe nile elu n'elu uwa nile.


M'gēji obim nile kele Gi, Onye-nwe-ayi, Chineke; M'gāsọpuru kwa aha-Gi rue mb͕e ebighi-ebi.


Ọ bu ezi ihe ikele Jehova ekele, Na ibùku aha-Gi abù ọma, Gi Onye kachasi ihe nile elu:


N'ihi na I mewo ka m'ṅuria site n'ọlu-Gi, Jehova: Ọ bu n'ọlu nile nke aka-Gi ka m'gēti nkpu ọṅù.


Kọsanu akukọ ebube-Ya n'etiti mba nile, Akukọ oké ọlu-Ya nile n'etiti ndi nile di iche iche.


Ṅurianu na Jehova, unu ndi ezi omume; Kele-kwa-nu ihe-ncheta-Ya di nsọ.


N'ihi na Gi onwe-gi, Jehova, bú Onye kachasi ihe nile elu n'elu uwa nile: Emewo ka I di elu nke-uku n'elu chi nile.


Gi onwe-gi, eze, Chineke Nke kachasi ihe nile elu nyere Nebukadneza, bú nna-gi, ala-eze a na idi-uku na ebube na ima-nma:


Nāṅurinu ọṅu n'Onye-nwe-ayi mb͕e nile: m'gāsi ọzọ, Nāṅurinu ọṅu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan