Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Abụ Ọma 83:2 - Bible Nso

2 N'ihi na, le, ndi-iro-Gi nāb͕a aghara: Ọzọ, ndi nākpọ Gi asì ebuliwo isi-ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

2 Lee na ndị iro gị nọ na-ebigbọ, ndị kpọrọ gị asị na-eweli isi ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Abụ Ọma 83:2
22 Iomraidhean Croise  

N'ihi na i nākpali onwe-gi imegidem, na n'ihi na npako-gi arigowo ba na ntim abua, M'gētiye kwa nb͕a-aka-imim n'imi-gi, na bridle nkem n'eb͕ub͕ere-ọnu-gi abua, me ka i laghachi n'uzọ ahu nke i siri bia.


Chineke nke otutom, ab͕ala nkiti;


Echezọla olu ndi nākpab͕u Gi: Nkpọtu nke ndi nēbili imegide Gi nāla elu mb͕e nile.


Ndi nākpab͕u Gi ab͕ọwo uja n'etiti ebe-nzute-Gi; Ha edowo ihe-iriba-ama nile ha ibu ihe-iriba-ama,


Ndi nākpọ Jehova asi gērube isi aghughọ n'okpuru Ya: Ma mb͕e-ha gādiru mb͕e ebighi-ebi.


Osimiri eweliwo olu-ha, Jehova, Osimiri eweliwo olu-ha; Osimiri nēweli ebili-miri nile ha elu.


Ahuhu! ọ bu ùzù ọtutu ndi, dika ùzù nke oké osimiri ka ha nātu ùzù; ọ bu kwa nkpọtu nke mba di iche iche, dika nkpọtu nke ọtutu miri ka ha nākpọtu.


Ònye ka i taworo uta, kwulu kwa? Ònye ka i mewo-kwa-ra olu-gi ka ọ di elu, weli kwa anya-gi abua imegide Ya? ọ bu imegide Onye Nsọ nke Israel.


N'ihi na i nākpali onwe-gi imegidem, na n'ihi na npako-gi arigowo ba na ntim abua, M'gētiye kwa nb͕a-aka-imim n'imi-gi, na bridle nkem n'eb͕ub͕ere-ọnu-gi abua, me ka i laghachi n'uzọ ahu nke i siri bia.


Ha gēbuso kwa gi agha; ma ha agaghi-enwe ike imegide gi: n'ihi na gi ka M'nọyere, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), inaputa gi.


Ma mb͕e Pailat huru na okwu-ya abaghi n'ihe ọ bula, kama na ùzù nāputa, o were miri, kwọ aka-ya abua n'iru ìgwè madu ahu, si, Ikpé ọbara Onye ezi omume a amaghm: unu onwe-unu le nke ahu.


Ìgwè ndi ahu we guzo ọtọ n'otù imegide ha: ndi-ikpé we dọwapu uwe-ha, nye kwa iwu ka apia ha utari.


Ma ndi-Ju, ebe ha nēkwo ekworo, ha kuru ajọ ndikom ufọdu nime ndi nēguzo n'efu n'ọma-ahia ka ha so ha, ha we kpọkọta ìgwè madu, me ka obodo ahu tua ùzù; ha we biakwasi ulo Jeson, chọ uzọ ikuputa ha n'iru ọra madu.


Obodo ahu dum we me uṅara, ndi-Ju we b͕akọta: ha we jide Pọl, dọkpupu ya n'ulo uku Chineke: ngwa ngwa ewe mechie ọnu-uzọ nile.


Ha nānu kwa olu-ya rue okwu a; ha we welie olu-ha elu, si, Wepu onye di otú a n'uwa: n'ihi na o kwesighi ka ọ di ndu.


Mb͕e oké esem-okwu putara, onye-isi-ọchi-agha, ebe ọ nātu egwu na ha gādọkasi Pọl ma eleghi anya, o we gwa ndi-agha ka ha rida napu ya n'ike n'etiti ha, kuta ya n'ulo ndi-agha.


Ewe me ka Midian ruru ala n'iru umu Israel, ha ewelighi kwa isi-ha ọzọ. Ala we di jū ọgu arọ abua n'ub͕ochi Gideon.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan