1 Chineke, edebela ọnu-Gi du: Ab͕ala nkiti, anọ-kwa-la jū, Chineke.
1 O! Chineke agbachikwala nkịtị. Biko, Chineke, ahapụkwala ikwu okwu, anọkwala jụụ.
Gi, Jehova, ka m'nākpọku; Oké nkumem, echila nti n'ebe m'nọ: Ka I we ghara ib͕am nkiti, M'we yie ndi nārida n'olùlù.
I huwo ya, Jehova; ab͕ala nkiti: Onye-nwe-ayi, anọlam n'ebe di anya.
Teta, n'ìhi gini ka I nāraru ura, Onye-nwe-ayi? Teta n'ura, ajula ayi aju rue mb͕e ebighi-ebi.
Chineke Nke kachasi chi nile, bú Jehova, ekwuwo, We kpọ uwa site n'ọwuwa anyanwu rue ọdida-ya.
Ka Chineke-ayi bia, Ya ab͕a-kwa-la nkiti: Ọku nēripia n'iru Ya, Buruburu Ya ka ifufe nēfesi kwa ike nke-uku.
Edebewom ọnum du site na mb͕e ebighi-ebi gara aga; anamab͕a nkiti, jisie onwem ike: dika nwanyi ime neme, otú a ka M'gāsu, udè, ku ume ngwa ngwa, Kusie ume ike n'otù.