Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Abụ Ọma 81:3 - Bible Nso

3 Fùanu opì-ike n'ọnwa ọhu, N'ọnwa ndọzu, n'ubọchi ememe-ayi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

3 Fụọnụ opi ike nʼoge ọnwa ọhụrụ, na mgbe ọnwa gbapụtara nʼuju ya, nʼụbọchị mmemme anyị;

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Abụ Ọma 81:3
23 Iomraidhean Croise  

Ọ si, Gini mere gi onwe-gi nējekuru ya ta? ọ bughi ọnwa ọhu, ọ bughi kwa ubọchi-izu-ike. Ọ si, Udo.


Devid we si ndi-isi ndi Livai ka ha me umu-nne-ha, bú ndi-ọbù-abù, ka ha guzo chiri ihe abù, bú une, na ubọ-akwara, na ájà, nēme ka anu udà-ha, iweli olu n'elu n'ihi ọṅù.


Na ndi-ọbù-abù, bú Himan, na Esaf, na Itan, chiri ájà ọla ime ka anu udà-ha;


Shebania, na Joshafat, na Netanel, na Amasai, na Zekaraia, na Benaia, na Elieza, bú ndi-nchu-àjà, nāfù opì n'iru ib͕e Chineke: Obed-edom na Jehia bu ndi-ọnu-uzọ-ama diri ib͕e ahu.


ha na Himan na Jedutun, ndi chiri opì na ájà inye ndi nēme ka anu udà-ha, chiri kwa ihe abù Chineke: na umu Jedutun, inọ n'ọnu-uzọ-ama.


Benaia na Jehaziel, bú ndi-nchu-àjà, nāchiri kwa opì mb͕e nile, n'iru ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Chineke.


Devid na ndi-isi usu-ndi-agha we kewaputara òfùfè ufọdu nime umu Esaf, na nke Himan, na nke Jedutun, ndi nēwere ubọ-akwara, na une, na ájà, bu amuma: ọnu-ọgugu-ha, bú ndikom nēje ozi dika òfùfè-ha si di, we di:


Ma, le, Chineke nọyere ayi, dika onye-isi-ayi, Ya na ndi-nchu-àjà-Ya, ndi chiri opì ahu, bú nke eji fù ka ha we dasie udà ike, ifù ha ka ha we dasie uda ike megide unu. Umu Israel, unu ebusola Jehova, bú Chineke nke nna-unu-hà, agha; n'ihi na ọ gaghi-agara unu nke-ọma.


Juda we le anya n'azu, ma, le, anēbuso ha agha n'iru na azu: ha we tikue Jehova nkpu, ndi-nchu-àjà nāfù kwa opì.


Le, mu onwem nēwuru aha Jehova, bú Chinekem, ulo, idoro Ya nsọ, isure n'iru Ya ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ eji uda utọ di iche iche me, na idebe n'ebe ahu achicha anēdo n'usoro mb͕e nile, na isure àjà-nsure-ọku n'ututu na n'anyasi, na n'ubọchi-izu-ike nile, na n'ọnwa ọhu nile, na mb͕e nile akara àkà nke Jehova, bú Chineke-ayi. Rue mb͕e ebighi-ebi ka nka dikwasi Israel.


ọzọ, ndi Livai, bú ndi-ọbù-abù, ọbuná ha nile, bú Esaf na Himan, na Jedutun, na umu-ha ndikom, na umu-nne-ha, nēguzo kwa n'akuku ọwuwa-anyanwu nke ebe-ichu-àjà ahu, yiri ezi ákwà ọcha, chiri kwa ájà na une na ubọ-akwara, ọgu ndi-nchu-àjà isi ndi nāfù opi so-kwa-ra ha:)


ọbuná dika ihe ubọchi si di n'ubọchi-ya, n'isure àjà-nsure-ọku dika ihe Moses nyere n'iwu si di, n'ubọchi-izu-ike nile, na n'ọnwa ọhu nile, na na mb͕e nile akara àkà, ub͕ò atọ n'arọ, bú n'ememe achicha ekoghi-eko, na n'ememe nke izù asa nke ubọchi asa, na n'ememe ulo-ntu.


Ka ha to aha-Ya n'ite-egwú: Ka ha chiri egwú-otiti na ubọakwara bùkue Ya abù ọma.


Werenu ubọ-akwara kele Jehova: Werenu une nke akwara iri bùkue Ya abù ọma.


Chirinu opì na olu opì-ike Tisie nkpu ọṅù ike n'iru Eze, bù Jehova.


Ọ napuwo kwa ulo-ntu-Ya n'ike, dika agāsi na ọ bu nke ubi ab͕ara ogige; O bibiwo mb͕e-Ya akara àkà: Jehova emewo ka echezọ mb͕e akara àkà na ubọchi-izu-ike nime Zaion, O we ju eze na onye-nchu-àjà n'ọmuma nke iwe-Ya.


Le, n'elu ugwu ka ukwu nke onye n'ezisa ozi ọma di, bú onye nēme ka anuru okwu udo! Me ememe-gi nile, gi Juda, Kwughachi nkwa nile i kwere: n'ihi na onye jọb͕uru onwe-ya agaghi-agabiga kwa nime gi ọzọ; ebipusiwo ya.


mb͕e unu gēme kwa àjà-ọku ichuru Jehova, bú àjà-nsure-ọku, ma-ọbu àjà ọzọ, imezu nkwa, ma-ọbu n'onyinye-afọ-ofufo, ma-ọbu na mb͕e nile unu akara àkà, ime ihe ísì utọ isurere Jehova, sitere n'ìgwè ehi, ma-ọbu n'ìgwè ewu na aturu:


Ọzọ, na nmalite ọnwa-unu nile unu gēweta nso àjà-nsure-ọku isurere Jehova; umu-oke-ehi abua, na otù ebulu, na umu-aturu asa nke b͕ara otù arọ, nke zuru okè;


Ubọchi asa ka i gēmere Jehova, bú Chineke-gi, ememe n'ebe ahu nke Jehova gārọputa: n'ihi na Jehova, bú Chineke-gi, gāgọzi gi n'ihe-ọmume-gi nile, na n'omume nile nke aka-gi, i gābu kwa onye nāṅuri nání ọṅu.


Ya mere, unu ekwela ka onye ọ bula kpo unu n'oriri, ma-ọbu n'ọṅuṅu, ma-ọbu n'okwu ubọchi ememe ma-ọbu nke ọnwa ọhu ma-ọbu nke ubọchi-izu-ike:


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan