Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Abụ Ọma 8:2 - Bible Nso

2 I siwo n'ọnu umu-ntakiri na umu nāṅu ara tọ ntọ-ala ike, N'ihi ndi-nkpab͕u-Gi, Ime ka onye-iro na onye nābọ̀ ọ́bọ̀ kwusi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

2 Site nʼotuto ụmụntakịrị na ụmụ na-aṅụ ara, ị tọọla ntọala siri ike megide ndị iro gị, ka e si otu a mechie ọnụ onye iro na onye ahụ na-abọ ọbọ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Abụ Ọma 8:2
21 Iomraidhean Croise  

Ka ha too aha Jehova; N'ihi na emewo ka aha-Ya di elu, nání ya: Ebube-Ya di n'elu uwa na elu-igwe.


Manu jijiji, emehie-kwa-la: Sinu otú a n'obi-unu n'elu ihe-ndina-unu, we dere du. Selah


N'ihi olu ita-uta na onye-nkwulu; N'ihi onye-iro na onye nābọ̀ ọ́bọ̀.


Ranu aka, mara kwa na Mu onwem bu Chineke: Agēbulim n'etiti mba nile, agēbulim n'uwa.


Ub͕u ka ha doziworo nzọ-ukwum nile; Nkpuru-obim erudawo n'ala: Ha egwuwo olùlù n'irum; Ha adabàwo n'etiti ya. Selah


Ma imegide umu Israel nile nkita agaghi-araghari ire-ya, imegide madu ma-ọbu anumanu: ka unu we mara na Jehova nākpa ókè n'etiti ndi Ijipt na Israel.


Oké ujọ na oké egwù nādakwasi ha; N'idi-uku nke ogwe-aka-Gi ha nọ jū dika nkume; Rue mb͕e ndi-Gi gāgabiga, Jehova, Rue mb͕e ndi nke I nwetara gāgabiga.


ma ndi nēle anya Jehova gāb͕anwe ike-ha; ha gēfego elu na nkù dika ugo; ha gāb͕a ọsọ, ike agaghi-agwu kwa ha; ha gēje ije, ghara ida #mbà.


Otù we kpọ ibe-ya òkù, si, Nsọ, nsọ, nsọ, ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha di: ùjú uwa nile bu ebube-Ya.


Onye ahu Nke nēme ka nbibi b͕ukwasi onye di ike dika àmùmà, nbibi ewe biakwasi ebe ewusiri ike.


Ma Jehova nọ n'ulo uku Ya di nsọ: dere du n'iru Ya, gi uwa nile.


N'oge ahu Jisus zara, si, Ekelem I, Nna, Onye-nwe elu-igwe na uwa, na I zonariri ndi-amam-ihe na ndi nwere nghọta ihe ndia, I were kwa ha kpughere umu ọhu:


ha si Ya, Ì nānu okwu umuntakiri ndia nēkwu? Jisus we si ha, E: Ọ̀ dighi mb͕e ọ bula unu guru, I si n'ọnu umu ọhu na umu nāṅu ara me ka ọjija zue okè?


N'oge hour ahu tọrọ Ya utọ nke-uku nime Mọ Nsọ, O we si, Ekelem Gi, Nna, Onye-nwe elu-igwe na uwa, na I zonariri ndi-amam-ihe na ndi nwere nghọta ihe ndia, I were kwa ha kpughere umu ọhu: e, Nna; ekelem Gi na ọ di ezi nma otú a n'iru Gi.


Kama ọ bu ihe-nzuzu nke uwa ka Chineke rọputara, ka O we me ka ihere me ndi mara ihe; ọ bu kwa ihe nādighi ike nke uwa ka Chineke rọputara, ka O we me ka ihere me ihe di ike;


Ukwu ndi-ebere-Ya ka Ọ nēdebe, Ma agēme ka ndi nēmebi iwu-Ya debe ọnu-ha dū n'ọchichiri; N'ihi na ọ bughi ike ka madu gēji kari n'ike.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan