Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Abụ Ọma 71:3 - Bible Nso

3 Ghọrọm oké nkume nke ebe-obibi, nke m'gābà nime ya mb͕e nile I nyewo iwu izọputam; N'ihi na nkumem di elu na ebem ewusiri ike ka I bu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

3 Ghọọrọ m oke nkume nke ebe mgbaba, ebe m nwere ike ịgbaba mgbe ọbụla; nye iwu maka nzọpụta m, nʼihi na ị bụ oke nkume m na ebe m e wusiri ike.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Abụ Ọma 71:3
17 Iomraidhean Croise  

Eberem, na ebem ewusiri ike, Na ulo-elum, na onye m'nwere ime ka m'b͕apu; Na ọtam, na onye m'b͕abàworo nime ya; Onye nāzọda ndim n'okpurum.


Jehova bu nkumem di elu, na ebem ewusiri ike, na onye nēme ka mb͕apu; Ọ bu Chinekem, na oké nkumem, anamab͕abà nime Ya; Ọ bu ọtam, na mpi nke nzọputam, na ulo-elum.


Onye anēto eto ka Ọ bu, anamakpọku Jehova: Ewe zọputam n'aka ndi-irom.


N'ehihie Jehova gēnye ebere-Ya iwu, N'abali kwa ka abù-Ya gādi n'onum, Bú ekpere m'nēkpere Chineke nke ndum.


Gi onwe-gi bu Ezem, Chineke: Nye nzọputa nile nke Jekob iwu.


Chineke-gi enyewo ike-gi iwu: Di ike, Chineke, Gi Onye luworo ayi ọlu.


Ọzọ, Mu onwem gēme ya ọkparam, Onye kachasi ihe nile elu n'ebe ndi-eze nke uwa nọ.


Onye-nwe-ayi, ebe-obibi ka Gi onwe-gi buworo ayi N'ọb͕ọ nile.


N'ihi na gi onwe-gi asiwo, Jehova bu ebe-nb͕abàm; N'ihi na ọ bu Onye kachasi ihe nile elu ka i meworo ebe-obibi-gi;


Ulo-elu di ike ka aha Jehova bu: Nime ya ka onye ezi omume nāb͕abà, o we nọ n'elu.


onye ahu gēbi n'ebe di elu: ebe ewusiri ike nke nkume di elu ka ulo-elu-ya gābu: anēnye ya nri-ya; miri-ya kwesiri ntukwasi-obi.


b͕usisianu okenye na okorọbia na nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke na umu-ntakiri na ndinyom: ma unu abiarula nso onye ọ bula nke akàrà ahu di ya n'iru; ma n'ebe nsọm ka unu gēsi malite. Ha we malite n'etiti ndi-okenye ndi nọ n'iru ulo ahu.


Ebe-obibi-gi ka Chineke nke di site na mb͕e ochie bu, N'okpuru ka ogwe-aka mb͕e ebighi-ebi di kwa: Ọ chupu-kwa-ra onye-iro n'iru gi, We si, Kpochapu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan