Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Abụ Ọma 70:2 - Bible Nso

2 Ka ihere me ha, ka ha nwe kwa iru-ihere, Bú ndi nāchọ nkpuru-obim: Ka ha laghachi azu, ka etiye kwa ha n'ọnọdu-ihere, Bú ndi ihe ọjọ dakwasirim nātọ utọ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

2 Ka ndị niile na-achọ ịnapụ m ndụ m, bụrụ ndị a ga-etinye nʼọnọdụ ihere na ọgbaaghara. Ka ndị ọ na-amasị ịhụ ịla nʼiyi m laghachi azụ nʼihere.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Abụ Ọma 70:2
13 Iomraidhean Croise  

Ndi nēmegidem gēyiri ọnọdu-ihere dika uwe, Ha gēwere kwa ihere-ha kpuchie onwe-ha dika uwe-nwuda.


Jehova, akpọkuwom I; biakutem ọsọsọ: Ṅa nti olum, mb͕e m'kpọkuru Gi.


Ọtutu oke-ehi dim buruburu: Oke-ehi di ike nke Beshan ab͕awom buruburu.


Naputa nkpuru-obim na mma-agha; Naputa nkpuru-obi m'nwere nání ya náka nkita.


Ka ihere me ha, ka ha nile nwe kwa iru-ihere n'otù, bú ndi na-aṅuri ọǹu n'ihe ọjọ nādakwasim: Ka ha yiri ihere na ọnọdu-ihere dika uwe, bú ndi nēme onwe-ha ka ha di uku imegidem.


Ka ihere me ha, ka etiye kwa ha n'ọnọdu-ihere, bú ndi nāchọsi nkpuru-obim ike: Ka ha b͕aghachi azu nwe iru-ihere, bú ndi nēchè ihe ọjọ ha gēmem.


Ka ihere me ha, ka ha nile nwe kwa iru-ihere n'otù, Bú ndi nāchọ nkpuru-obim ikpochapu ya: Ka ha laghachi azu, ka etiye kwa ha n'ọnọdu-ihere, Bú ndi ihe ọjọ dakwasirim nātọ utọ.


Ihere gēme ndi-irom nile, ha gāma kwa jijiji nke-uku: Ha gālaghachi azu, ihere gēme ha na mberede.


Chineke, anọlam ebe di anya: Chinekem, bia ọsọsọ iyerem aka.


Ka ihere me ha, ka eme kwa ka ha gwusia, bú ndi nēmegide nkpuru-obim; Ka ewere ita-uta na ọnọdu-ihere kpuchie ndi nāchọ imem ihe ọjọ.


Okwu Jehova gābu-kwa-ra ha ihe enyere n'iwu tukwasi ihe enyere n'iwu, ihe enyere n'iwu tukwasi ihe enyere n'iwu; usoro tukwasi usoro, usoro tukwasi usoro; nwantī ebe a, nwantī ebe ahu; ka ha we je, su ngọngọ da n'azu, ewe tijie ha, ha ama n'ọnyà, ejide ha.


Le, ihere gēme ndi ahu nile ndi iwe-ha di ọku n'aru gi, agētiye ha n'ọnọdu-ihere: ha gādi ka ihe nābughi ihe, we la n'iyì, bú ndi nāluso gi ọ̀gù.


Ya mere mb͕e Ọ siri ha, Mu onwem bu Ya, ha la azu, we da n'ala.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan