Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Abụ Ọma 7:8 - Bible Nso

8 Jehova nēkpe ndi nile di iche iche ikpe: Kpem ikpe, Jehova, dika ezi omumem si di, na dika izu-okèm si di nke di nimem.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

8 Ka Onyenwe anyị kpee ụmụ mmadụ niile ikpe. Kpee m ikpe, O Onyenwe anyị, dịka ezi omume m si dị, na dịka izuoke m si dị, gị Onye kachasị ihe niile elu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Abụ Ọma 7:8
23 Iomraidhean Croise  

Ya buru Gi ihe-árú ime dika ihe a si di, ime ka onye ezi omume so onye nēmebi iwu nwua, o we buru na dika ndi ezi omume si di, otú a ka ndi nēmebi iwu di; ya buru Gi ihe-árú: Onye-ikpé uwa nile, Ọ̀ gaghi-eme ihe ekpere n'ikpe?


Chineke nke Abraham, na Chineke nke Nehoa, bú Chineke nke nna-ha, kpe ikpe n'etiti ayi. Jekob we were Oké Egwù nke nna-ya Aisak ṅua iyi.


Chineke-ayi, Ì gaghi-ekpe ha ikpe? n'ihi na ike adighi nime ayi n'iru ìgwè madu a bara uba nke nābia imegide ayi; ayi onwe-ayi amaghi kwa ihe ayi gēme: kama ọ bu Gi ka anya-ayi nādikwasi.


Jehova nọ n'ulo uku Ya di nsọ, Jehova, n'elu-igwe ka oche-eze-Ya di; Anya-Ya nāhu, mbubere-anya-Ya nānwa, umu madu.


Ka izu-okè na izi-ezi chezim, N'ihi na elewom anya Gi.


Kpem ikpe, Jehova, n'ihi na mu onwem ejewo ije n'izu-okèm: Ọ bu kwa na Jehova ka m'tukwasiworo obi, ukwum adighi-ab͕uchapu.


Ma mu onwem, n'izu-okèm ka m'gēje ije: B͕aputam, me-kwa-ram amara.


Ma mu onwem, n'izu-okèm ka I jideworom, We me ka m'guzosie ike n'iru Gi rue mb͕e ebighi-ebi.


Kpem ikpe, Chineke, kpe kwa ọnum n'ikpe, me ka m'pua n'aka mba nādighi-eme ebere: Me ka m'si n'aka nwoke bu onye-aghughọ na onye ajọ omume b͕apu.


O we nāzù ha dika izu-okè nke obi-ya si di; Were kwa ihe-nghọta nile nke ọbu-aka-ya abua nēdu ha.


Chineke nēguzo Onwe-ya nime nzukọ Chineke; N'etiti chi nile ka Ọ nēkpe ikpe.


Ya onwe-ya gēkpe uwa dum madu bi ikpe n'ezi omume, Ọ gēkpe ndi nile di n'uwa ikpe n'izi-ezi.


N'iru Jehova, n'ihi na Ọ biawo; N'ihi na Ọ biawo ikpe uwa ikpe: Ọ gēji ezi omume kpe elu-uwa dum madu bi ikpe, Ọ gēji kwa ikwesi-ntukwasi-obi-Ya kpe ndi nile di iche iche ikpe.


N'iru Jehova, n'ihi na Ọ biawo ikpe uwa ikpe: Ọ gēwere ezi omume kpe elu-uwa dum madu bi ikpe, Ọ gēwere kwa izi-ezi kpe ndi nile di iche iche.


Ọ di nma, bú ob͕eye nke nēje ije n'izu-okè-ya, Kari onye eb͕ub͕ere-ọnu-ya b͕agọrọ ab͕agọ n'okwu, onye bu kwa onye-nzuzu.


ebe O debeworo otù ubọchi, nke Ọ gēkpe elu-uwa dum madu bi ikpé n'ezi omume nime ya site n'aka otù Nwoke Ọ kara àkà; O nye-kwa-ra madu nile ihe ha gēji kwere nka, ebe Ọ mere ka O si na ndi nwuru anwu bilie.


N'ihi na inya-isi-ayi bu nka, àmà nke akọ-na-uche-ayi, na ọ bu n'idi-nsọ na idi-ọcha nke Chineke, ọ bughi n'amam-ihe nke anu-aru, kama ọ bu n'amara Chineke, ka ayi biri obi n'uwa, ma ọ bu n'ebe unu nọ ka ayi bikariri obi-ayi nke-uku.


Unu onwe-unu bu ndi-àmà, Chineke bu kwa onye-àmà, otú ahuru ayi na ayi bu ndi di ọcha n'obi na ndi ezi omume na ndi nādighi ita uta n'ebe unu nọ, bú ndi kwere ekwe:


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan