Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Abụ Ọma 7:1 - Bible Nso

1 Jehova, bú Chinekem, na Gi ka m'b͕abàworo: Zọputam n'aka ndi nile nēsob͕um, naputakwam n'aka-ha:

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

1 Onyenwe anyị Chineke m, nʼime gị ka m gbabara; zọpụta m, ma napụta m site nʼaka ndị niile na-achụ m ọsọ,

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Abụ Ọma 7:1
29 Iomraidhean Croise  

Na Jehova ka m'b͕abàworo: Ùnu si aṅa si nkpuru-obim, Felaganu n'ugwu-unu dika nnunu?


Legide anya, zam, Jehova, Chinekem: Nye anyam abua ìhè, ka m'we ghara iraru ura ọnwu;


Ma ọ bu ebere-Gi ka mu onwem tukwasiworo obi; Ka obim tegharia egwú ọṅù na nzọputa-Gi:


Jehova bu nkumem di elu, na ebem ewusiri ike, na onye nēme ka mb͕apu; Ọ bu Chinekem, na oké nkumem, anamab͕abà nime Ya; Ọ bu ọtam, na mpi nke nzọputam, na ulo-elum.


N'ihi na Gi onwe-gi gāmuye oriọnam: Jehova, bú Chinekem, nēme kwa ka ọchichirim nwue enwu.


Chinekem, na Gi ka m'tukwasiworo obi, Ekwela ka ihere mem; Ekwela ka obi ndi-irom tọ ha utọ n'arum.


Kpem ikpe, Jehova, n'ihi na mu onwem ejewo ije n'izu-okèm: Ọ bu kwa na Jehova ka m'tukwasiworo obi, ukwum adighi-ab͕uchapu.


Bilie, Jehova; zọputam, Chinekem: N'ihi na I tiwo ndi-irom nile ihe na ǹtì; I tipiawo ezé ndi nēmebi iwu.


Ka nsọpurum we bùkue Gi abù ọma, ghara idere du. Jehova, bú Chinekem rue mb͕e ebighi-ebi ka m'gēkele Gi.


Jehova, bú Chinekem, Etikurum, I, I we me ka m'diri ndu.


N'aka-Gi ka mb͕em nile di: Naputam n'aka ndi-irom, na n'aka ndi nēsob͕um.


Ọtutu ihe-nb͕u gādiri onye nēmebi iwu: Ma onye nātukwasi obi na Jehova, ebere gādi ya buruburu.


M'gābiaru kwa ebe-ichu-àjà nke Chineke, Rue Chineke aru, bú ọṅù nke otite-egwú-ọṅùm: M'gēkele kwa Gi n'ubọ-akwara, Chineke, bú Chinekem.


Onye ahu gākpọm, si, Nnam ka I bu, Chinekem, na oké nkume nke nzọputam.


Onye n'etiti unu bu onye nātu egwu Jehova, nēge nti n'olu orù-Ya? onye nke jeworo ije n'ọchichiri, nke ọ dighi onwunwu-ọku o nwere, ya tukwasi obi n'aha Jehova, dabere Chineke-ya.


Gi mara, Jehova: chetam, letakwam, we bọ̀rọm ndi nēsob͕um ọ́bọ̀; ewepulam n'eweghi-iwe-ọsọsọ nke Gi: mara na eburuwom ita-uta n'ihi Gi.


Ma Jehova nọyerem dika dike nke nēme ka ama jijiji: n'ihi nka ndi nēsob͕um gāsu ngọngọ, ha agaghi-enwe kwa ike: ihere gēme ha nke-uku, n'ihi na ha enweghi uche, agaghi-echezọ ọnọdu-ihere di mb͕e ebighi-ebi nke etiyere ha.


Anuchasiwom ka Efraim nēgosi onwe-ya ebere o nwere n'aru onwe-ya otú a, si, I dọwom aka na nti, ewe dọm aka na nti, dika nwa-ehi nke anēmeghi ka ọ muta ọlu-ya: chighariam, m'we chigharia onwem; n'ihi na Gi onwe-gi bu Jehova, bú Chinekem.


M'we kpere Jehova, bú Chinekem, kwuputa, si, Biko, Onye-nwe-ayi, bú Chineke ahu Nke di uku di kwa egwu, Onye nēdebere ndi nāhu Ya n'anya, ndi nēdebe kwa ihe nile O nyere n'iwu, ọb͕ub͕a-ndu-Ya na ebere-Ya;


Ekpere nke Habakuk, bú onye-amuma, n'elu Shigionoth.


Unu gēsi kwa na ndagwurugwu ugwum nile b͕alaga; n'ihi na ndagwurugwu ugwu ahu gēru Eze: e, unu gāb͕alaga, dika unu siri n'iru ala-ọma-jijiji b͕alaga n'ubọchi Uzaia, bú eze Juda: Jehova, bú Chinekem, gābia kwa, ndi nsọ nile gēsoro Gi.


Ma umu-nnem ndi mu na ha rigoro mereka obi lọ ndi Israel miri: ma mu onwem sozuru Jehova, bú Chinekem, n'azu.


ndi sitere n'aka-Ya buru ndi kwere na Chineke, Onye mere ka O si na ndi nwuru anwu bilie, we nye Ya ebube; ka okwukwe-unu na olile-anya-unu we di n'ebe Chineke nọ.


Ya mere ka ndi nāhu ahuhu dika ọchichọ Chineke si di were kwa nkpuru-obi-ha n'ime ezi ihe nye n'aka Onye-òkìkè kwesiri ntukwasi-obi idebe.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan