Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Abụ Ọma 69:8 - Bible Nso

8 Aghọworom umu-nnem onye ala ọzọ, Ghọ-kwa-ra umu nnem muru onye mba ọzọ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

8 Abụ m ọbịa nʼebe ụmụnna m nọ, nʼebe ụmụnne nọ, abụ m onye mba ọzọ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Abụ Ọma 69:8
18 Iomraidhean Croise  

N'ihi ndi-nkpab͕um nile aghọwom ihe-ita-uta nke-uku, Ọbuná n'ebe ndi-ab͕ata-obim nọ aghọwo-kwa-ram ndi m'mara oké egwu: Ndi nāhum n'èzí ab͕anariwom.


Ndi nāhum n'anya na ndi-eyìm nēguzo iche na ncherita-iru ihe-otitim; Ndi-ab͕ata-obim nēguzo kwa n'ebe di anya.


Nke ndi-iro-Gi jiworo ta uta, Jehova, Nke ha jiworo ta nzọ-ukwu nile nke onye-Gi etere manu uta.


Onye agọziri agọzi ka Jehova bu rue mb͕e ebighi-ebi. Amen, na Amen.


Azum ka m'nyere ndi-oti-ihe, ǹtìm abua ka m'nyere ndi nēkwopu afu-ọnu: ezopughm irum n'ọnọdu-ihere anētiyem na ọbubú-ọnu.


Eledara ya anya, ọ bu kwa onye madu rara aka; onye nwere ọtutu ihe-nb͕u na onye mara ọria nke-ọma: e, dika onye madu nēzonari iru-ha, otú a ka eledara ya anya, ayi we ghara igu ya n'ihe.


N'ezie ọria nile nke ayi ka ya onwe-ya bupuworo, ihe-nb͕u nile nke ayi kwa, o buruwo ha; ma ayi onwe-ayi guru ya n'onye etiworo ihe-otiti, onye Chineke tiworo ihe, na onye ewedara n'ala.


Gi mara, Jehova: chetam, letakwam, we bọ̀rọm ndi nēsob͕um ọ́bọ̀; ewepulam n'eweghi-iwe-ọsọsọ nke Gi: mara na eburuwom ita-uta n'ihi Gi.


Ma emewo ihe a dum, ka ihe nile ndi-amuma dere n'akwukwọ we mezu. Mb͕e ahu ndi nile nēso uzọ-Ya rapuru Ya, b͕alaga.


Ọ biakutere ihe nke aka Ya, ma ndi nke aka Ya akpọbataghi Ya.


N'ihi na ọbuná umu-nne-Ya ekweghi na Ya.


Elaiab, bú nwa-nne-ya nke-okenye, we nu mb͕e ọ nāgwa ndikom ahu okwu; iwe Elaiab we di ọku megide Devid, ọ si, N'ìhi gini kwa ka i ridataworo? ọ̀ bu kwa n'aka onye ka i rapuru aturu ole-na-ole ahu n'ọzara? mu onwem mara nganga-gi, na ihe ọjọ nke obi-gi; n'ihi na ọ bu ihu agha ka i ridataworo.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan