Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Abụ Ọma 69:3 - Bible Nso

3 Adọb͕uwom onwem n'ọlu n'ikpọ-òkùm; akpiri akpọsiwom nku: Anyam abua adalawo n'isi, mb͕e m'nēchere Chinekem.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

3 Akpịrị akpọọla m nkụ; ike agwụla m ebe m na-akpọ oku maka enyemaka. Anya m agbaala ọchịchịrị ebe m na-ele anya Chineke.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Abụ Ọma 69:3
18 Iomraidhean Croise  

Ma anya ndi nēmebi iwu gādala n'isi, Ebe-nb͕alaga alanariowo kwa ha n'iyì, Nkubì-ume bu kwa olile-anya-ha.


Irum nācha ọbara-ọbara site n'ikwa-ákwá, Na mbubere-anyam ka onyinyo ọnwu di kwa;


Anyam abua adalawo n'isi n'ichọsi nzọputa-Gi ike, Na n'ichọsi okwu ezi omume-Gi ike.


Anyam abua adalawo n'isi site n'ichọsi okwu-Gi ike, Mb͕e m'nāsi, Òle mb͕e I gākasim obi?


Ikem akpọwo nku di ka osisi; Irem nārapara kwa n'ab͕am; Ọ bu kwa n'ájá ọnwu ka I nātọb͕ọm.


Chinekem, anamakpọ òkù n'ehihie, ma I dighi-aza; N'abali kwa, ma ọ dighi inọ-jū m'nwere.


Ka izu-okè na izi-ezi chezim, N'ihi na elewom anya Gi.


Ma ub͕u a, Onye-nwe-ayi, m'leworo anya gini? Ncherem, n'ebe I nọ ka ọ di.


Ọ we tiye abù ọhu n'ọnum, bú otuto diri Chineke-ayi: Ọtutu madu gāhu ya, tua egwu, We tukwasi Jehova obi.


Adọb͕uwom onwem n'ọlu n'ize-umem; Kwa-abali ka m'nēme ka ihe-ndinam se n'elu anya-mirim; Ejim anya-mirim de ihe m'ji edina.


Ha we nyem ńsí di ilu ka ọ buru ihe-oririm; Ọzọ mb͕e akpiri kpọrọm nku ha nēme ka m'ṅua manya-vine b͕ara uka.


Ọnuma-Gi akwagidewom, I werewo kwa ebili-miri-Gi nile wedam n'ala. Selah


Dika eleke ma-ọbu ub͕ala, otú a ka m'nēbe ebe; Anamekwo ákwá dika nduru: anyam abua atalatawo n'ile anya n'elu; Jehova, anēmeb͕um emeb͕u, nọrọm mbe.


Anyam abua adalawo n'isi site n'anya-miri, ngiri-afọm anuwom ọku, Awusiwo umejum n'ala dika miri, n'ihi ntipia nke ada ndim; N'ihi na umu-ntakiri na umu nke nāṅu ara nāda #mbà n'amá nile nke obodo.


Mb͕e ihe a gasri, Jisus, ebe Ọ matara na ihe nile agwuwo ub͕u a, ka ihe edeworo n'akwukwọ nsọ we mezu, Ọ si, Akpiri nākpọm nku.


Agēnye ndi ọzọ umu-gi ndikom na umu-gi ndinyom, ma anya-gi ganēle, we dala n'isi n'ichọ ha ogologo ubọchi nile: ma ọ dighi ihe gādiri ike aka-gi.


Onye n'ubọchi nke anu-aru-Ya, mb͕e Ọ weresiri ikwa-ákwá siri ike na anya-miri che ekpere na aririọ n'iru Onye ahu puru izọputa Ya n'ọnwu, mb͕e anusi-kwa-ra olu-Ya n'ihi na Ọ turu egwu Chineke,


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan