3 Ka ndi nile n'uwa kele Gi, Chineke; Ka ndi nile n'uwa kele Gi, ha nile.
3 Ka mmadụ niile too gị, O Chineke; ka mmadụ niile too gị.
Ka nkpuru-obim di ndu, ọ gēto kwa Gi; Ka ikpé-Gi nile ye-kwa-ram aka.
Me ka nkpuru-obim si n'ebe emechibidoworo ya puta, ka m'we kele aha-Gi: Mu ka ndi ezi omume gāb͕a buruburu; N'ihi na I nēmesom nke-ọma.
M'gēme ka echeta aha-gi n'ọb͕ọ nile: N'ihi nka ndi nile di iche iche gēkele gi rue mb͕e nile ebighi-ebi.
Ka ndi nile n'uwa kele Gi, Chineke; Ka ndi nile n'uwa kele Gi, ha nile.
Ekwela ka onye anāzọpia azọpia lata n'ihere: Me ka onye ewedara n'ala na ob͕eye to aha-Gi.
O we si, Ọ bu ihe di kari nfe na i gāburum orù, ime ka ebo nile nke Jekob bilie, na ime ka ndi Israel echebere echebe lata: enyewokwam i ka i buru ìhè nke mba nile, ibu nzọputam rue nsọtu uwa.
N'ihi nka ka Ọ gārara ha nye, rue mb͕e nwanyi ime nēme gāmuwori nwa: umu-nne-ya ndi fọduru afọdu ewe laghachikute umu Israel.