Gini mere i ji ruda n'ala, nkpuru-obim? Gini mere i ji su ude nke-uku nimem? Chere Chineke: n'ihi na m'gēkele kwa Ya ọzọ, Onye bu nzọputa nke irum, na Chinekem.
O we si, Ọ bu ihe di kari nfe na i gāburum orù, ime ka ebo nile nke Jekob bilie, na ime ka ndi Israel echebere echebe lata: enyewokwam i ka i buru ìhè nke mba nile, ibu nzọputam rue nsọtu uwa.
si, Gi onye juputara n'aghughọ nile na ihe nile jọb͕uru onwe-ya, gi nwa ekwensu, gi onye-iro ezi omume nile, ì gaghi-arapu ikwahie uzọ nile eguzoziri nke Onye-nwe-ayi?
Ejiri okwu-ọnu zí nwoke a uzọ Onye-nwe-ayi; ebe ọ di ọku na mọ-ya, o we nēkwu nēzí kwa nke-ọma ihe nile bayere Jisus, ọ bu ezie na ọ mara nání baptism nke Jọn:
Ya mere nzukọ Kraist nime Judia na Galili na Sameria dum nwere udo, ebe anēwuli ya elu dika ulo; ọ nāba kwa uba, ebe ọ nāga n'egwu Onye-nwe-ayi na nkasi-obi nke Mọ Nsọ.