Absalom we zipu Ahitofel onye Gailo, bú onye nādu Devid ọdu, n'obodo-ya, bú Gailo mb͕e ọ nāchu àjà. Nkekọta ahu we di ike; ndi Israel nāba kwa uba nēje n'iru n'iru n'aka Absalom.
Sutunu onye arọputaworo ọnu, ka ọ ghara iwe iwe, unu we la n'iyì n'uzo, N'ihi na iwe-ya gēre ọku na mb͕e ntà. Ndi ihe nāgara nke-ọma ka ha bu, bú ndi nile nāb͕abà nime ya.
Onye n'etiti unu bu onye nātu egwu Jehova, nēge nti n'olu orù-Ya? onye nke jeworo ije n'ọchichiri, nke ọ dighi onwunwu-ọku o nwere, ya tukwasi obi n'aha Jehova, dabere Chineke-ya.
N'ihi na Mu onwem, Jehova, nāhu ikpé ziri ezi n'anya, anamakpọ nnapu-n'ihe-ike n'ajọ omume asì; M'gēnye kwa ha ugwọ-ọlu-ha n'ezi-okwu, ọ bu kwa ọb͕ub͕a-ndu ebighi-ebi ka Mu na ha gāb͕a.
Ọzọ, mḅe unu nēweta anu kpuru ìsì nso, ihe ọjọ adighi ya! mḅe unu nēweta nso nke gwọrọ ngwurọ na nke nāria ọria, ihe ọjọ adighi ya! Biko, weta ya nso onye nāchi ala-gi; ìhe-gi gātọ ya utọ? ma-ọbu ọ̀ gāhu gi iru-ọma? otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri.
Ha gākpọ ndi nile bia n'ugwu; N'ebe ahu ka ha gāchu àjà ezi omume: N'ihi na njuputa nke oké osimiri nile ka ha gāmí dika ara, Ya na ihe nile zoro ezo nke ezoro n'ájá.