Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Abụ Ọma 4:3 - Bible Nso

3 Ma maranu na Jehova ekewaputaworo Onwe-ya onye-ebere: Jehova nānu mb͕e m'kpọkuru Ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

3 Matanụ nke ọma na Onyenwe anyị ahọpụtala ndị ezi omume nye onwe ya; ọ ga-egekwa ntị nʼolu m mgbe ọbụla m kpọkuru ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Abụ Ọma 4:3
17 Iomraidhean Croise  

Hunu Jehova n'anya, ndi-ebere-Ya nile: Ọ bu ndi kwesiri ntukwasi-obi ka Jehova nēchezi, Ọ nākwughachibiga kwa onye nēme omume npako ókè.


Anya abua nke Jehova di n'aru ndi ezi omume, Nti-Ya abua ghe-kwa-ra oghe na nkpu ha nētiku Ya.


Ọnum gēkwu okwu amam-ihe nile; Ntughari-uche nke obim gābu kwa nghọta nile.


Chikọtaranum ndi-eberem; Bú ndi Mu na ha b͕ara ndu n'elu àjà.


Mb͕e ahu ndi-irom gālaghachi azu n'ubọchi m'gākpọku Gi: Nka ka m'mara, na Chineke dirim.


Si n'ebe m'nọ wezuga onwe-unu, unu nile ndi nālu ajọ ihe; N'ihi na Jehova anuwo olu ákwám.


Unu atukwasila obi na nmeb͕u, Ọzọ, n'ipunara madu ihe unu aghọla ihe-efu: Mb͕e àkù nābakari uba, unu atukwasila ya obi.


N'ihi na ọ̀ bu n'ihi gini ka agāmara ub͕u a na ahutawom amara n'iru Gi, mu onwem na ndi-Gi? ọ̀ bughi n'ojije I nēsoro ayi je, ewe kewapu ayi, bú mu onwem na ndi-Gi, n'ebe ndi nile nọ ndi bi n'elu uwa.


Ọ bughi unu onwe-unu rọputaram, kama ọ bu Mu onwem rọputara unu, weputa kwa unu iche, ka unu onwe-unu we je mia nkpuru, ka nkpuru-unu we nọgide kwa: ka ihe ọ bula unu gāriọ Nnam n'aham, ka O we nye unu ya.


N'ihi na ayi bu ihe O mere, ndi ekère èkè nime Kraist Jisus ilu ezi ọ1u, nke Chineke buru uzọ dozie ka ayi we jegharia nime ha.


Otú ọ di, ntọ-ala di ike nke Chineke nēguzo, ebe o nwere akàrà nka, Onye-nwe-ayi mara ndi bu nke Ya: na, Ka onye ọ bula nke nākpọ aha Onye-nwe-ayi si n'ajọ omume wezuga onwe-ya.


Onye nyere Onwe-ya n'ihi ayi, ka O we b͕aputa ayi n'imebi-iwu nile, sachakwara Onwe-ya otù ndi nke gābu ndi nke aka Ya, ndi obi-ha nānuru ọlu ọma ọku.


Ma unu onwe-unu bu ọb͕ọ ndi arọputaworo, òtù ndi-nchu-àjà ndi bu kwa eze, mba di nsọ, ndi nke Chineke nwetara, ka unu we kwusa idi-nma nile nke Onye ahu Onye kpọputara unu n'ọchichiri ahu ba n'ìhè-Ya di ebube:


Onye-nwe-ayi matara idọputa ha n'ọnwunwa, bú ndi nāsọpuru Chineke, na idebe ndi ajọ omume n'ahuhu-nmehie rue ubọchi ikpé;


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan