Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Abụ Ọma 4:2 - Bible Nso

2 Umu madu, rùe ole mb͕e ka nsọpurum gāghọ itiye n'ọnọdu-ihere? Unu nāhu ihe-efu n'anya, nāchọ okwu-ugha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

2 Unu ụmụ mmadụ, ruo ole mgbe ka unu ga-atụgharịa ebube m, mee ka ọ bụrụ ihe ihere? Ruo ole mgbe ka unu ga-ahụ ihe efu nʼanya na-achọ chi ndị ahụ na-abụghị chi nʼezie? Sela

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Abụ Ọma 4:2
29 Iomraidhean Croise  

Ha we b͕anwe nsọpuru-ha N'ihe-atù nke ehi nāta ihe akuru n'ala.


Unu nēme ndum-ọdu nke onye ewedara n'ala ka ọ buru ihe-ihere, N'ihi na Jehova bu ebe-nb͕abà-ya.


N'ìhi gini ka mba nile meworo oké nkpọtu? N'ìhi gini ka ndi nile di n'uwa nātughari ihe-efu n'uche?


Ma Gi onwe-gi, Jehova, bu ọta buruburum, Na nsọpurum, na onye nēbuli isim elu.


Akpọwom ha asì, bú ndi nāriba ihe-efu nile nke nābughi ihe ama: Ma mu onwem atukwasiwo obi na Jehova.


I gēme ka ndi nile nēkwu okwu-ugha la n'iyì: Madu nke bu onye-ọbara na onye- aghughọ, Jehova nākpọ ya onye-árú.


Kpọkukwam n'ubọchi nkpab͕u; M'gādọputa gi, i gāsọpu-kwa-ram.


Nkpuru-obim nọ n'etiti ọdum; M'gēdina n'etiti ndi nēre ọku, Bú umu madu, ndi ezé nile ha bu ube na àkú, Ire-ha bu kwa mma-agha di nkọ.


Ọ̀ bu ezie na ezi omume nke kwesiri ka unu kwue bu ob͕i? Ùnu ji izi-ezi kpe ikpe, unu umu madu?


Emewo ka ndi nēmebi iwu buru ndi ala ọzọ site n'àkpà-nwa: Ha akpafuwo site n'afọ nne-ha, nēkwu okwu-ugha.


Ma eze gāṅuri na Chineke: Onye ọ bula nke nēwere Ya ṅu iyi gānya isi; N'ihi na agēkpuchi ọnu nke ndi nēkwu okwu-ugha.


O gēji ezi omume kpe ndi-Gi ikpe, O gēji kwa ikpe ziri ezi kpe ndi-Gi ewedara n'ala.


Moses na Eron we bakuru Fero, si ya, Otú a ka Jehova, bú Chineke nke ndi-Hibru, siri, Rùe ole mb͕e i gāju iweda onwe-gi n'ala n'irum? zipu ndim, ka ha we fèm.


Unu ndi nēnweghi uche, rùe ole mb͕e ka unu gāhu enweghi-uche n'anya? Rùe ole mb͕e ka ndi nākwa emò gāchọsi-kwa-ra onwe-ha ikwa-emò ike? Rùe ole mb͕e ka ndi-nzuzu gākpọ kwa ihe-ọmuma asì?


N'ihi na emeghi ihe ekpere n'ikpe megide ọlu ọjọ ọsọsọ, n'ihi nka obi umu madu juru eju nime ha ime ihe ọjọ.


Nka bu ihe ọjọ n'ihe nile anēme n'okpuru elu-igwe, na otù ndabà nādabàra madu nile: ọzọ kwa, obi umu madu juputara n'ihe ọjọ, iwi-ara di kwa n'obi-ha mb͕e ha nọ na ndu, ma emesia ha nālakuru ndi nwuru anwu.


Ha ewe tua ujọ, ihere gēme kwa ha, n'ihi Etiopia, bú ihe-ntukwasi-obi-ha, na n'ihi Ijipt, bú ima-nma-ha.


Jehova ejiwo nzọputa ebighi-ebi zọputa Israel: ihere agaghi-eme unu, agaghi-etiye kwa unu n'ọnọdu-ihere rue mb͕e nile ebighi-ebi.


Ọ dighi onye nākpọ madu eje ikpé n'ezi omume, ọ dighi kwa onye nēji ikwesi-ntukwasi-obi eje ikpé: ha nātukwasi obi n'ihe tọb͕ọrọ n'efu, ha nēkwu kwa okwu-ugha; ha nāturu ime ọnọdu ọjọ, mua ajọ ihe.


Ọ̀ di mba ab͕anweworo chi di iche iche ha, ọ bu ezie na ihe ahu abughi chi? ma ndim ab͕anwewo nsọpuru-ha n'ihe nadighi-abà urù.


otú a ka Jehova siri, Àjọ omume gini ka nna-unu-hà huworo n'arum, na ha esiwo n'ebe M'nọ je n'ebe di anya, we jeso ihe-efu, we ghọ ihe-efu?


Ha we kwe ire-ha, dika uta-ha, ib͕a okwu-ugha dika àkú; ma ọ bughi n'ebe ikwesi-ntukwasi-obi di ka ha diworo ike n'ala: n'ihi na ha esiwo n'ihe ọjọ pukuru ihe ọjọ, ma Mu ka ha nāmaghi; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


Dika iba-uba-ha, otú a ka ha mehieworo megidem: nsọpuru-ha ka M'gāb͕anwe ka ọ ghọ ihere.


Ndi nāriba ihe-efu di iche iche nke nābughi ihe ama, Ebere-ha ka ha nārapu.


Jehova we si Moses, Rùe ole mb͕e ka ndi nka gēlelìm anya? ọ̀ bu kwa rue ole mb͕e ka ha nāgaghi-ekwe na Mu, n'ihi ihe-iriba-ama nile nke M'meworo n'etiti ha?


Ndi-Ju we so kwa ya n'ebubo ahu nāsi na ihe ndia di otú a.


ka, dika edeworo ya n'akwukwọ nsọ, Onye nānya isi, ya nya n'Onye-nwe-ayi.


N'ihi nka, ebe unu tupuru okwu-ugha, nēkwunu ezi-okwu onye ọ bula n'ebe onye-ab͕ata-obi-ya nọ: n'ihi na ayi nāburita ihe di n'aru ibe-ayi.


unu ewezuga-kwa-la onwe-unu: n'ihi na mb͕e ahu ka unu ganēso n'azu ihe tọb͕ọrọ n'efu, nke nādighi-abà urù, nke nādighi-anaputa kwa, n'ihi na ihe tọb͕ọrọ n'efu ka ha bu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan