Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Abụ Ọma 32:3 - Bible Nso

3 Mb͕e m'b͕ara nkiti, ọkpukpum nile kara nká Site n'ọb͕ub͕ọ-ujam ogologo ubọchi nile.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

3 Mgbe m gbachiri nkịtị, ọkpụkpụ m rere ure site nʼịsụ ude m ogologo ụbọchị niile.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Abụ Ọma 32:3
26 Iomraidhean Croise  

Iru-újú ahu we gabiga, Devid we ziga, webata ya n'ulo-ya, o we ghọrọ ya nwunye, muara ya nwa. Ma ihe Devid mere jọrọ njọ n'anya Jehova.


N'ihi na ọ bu tutu eriem nrim ka ize-umem nābia, Anāwusi kwa ọb͕ub͕ọ-ujam nile dika miri.


N'abali ọkpukpum nēsiwasi nādapu n'arum, Ihe-nb͕u nke nārọm árú anọghi n'otù ebe.


Akpukpọ-arum di oji, nādapu n'arum, Ọkpukpum erewo kwa ọku site n'ikpọ-nku.


Chinekem, Chinekem, n'ìhi gini ka I rapurum? N'ìhi gini ka I nọ m n'ebe di nzọputam na okwu nile nke ọb͕ub͕ọ-ujam anya?


Ọ dighi izu-okè ọ bula di n'anu-arum n'ihi iwe-Gi; Ọ dighi kwa udo ọ bula di n'ọkpukpum nile n'ihi nmehiem.


Arum esinwuwo, egwepiawokwam nke-uku: Ab͕ọwom uja n'ihi isu-ude nke obim.


I gēme ka m'nuru olu obi-utọ na ọṅù; Ka ọkpukpu nile I gwepiaworo we tegharia egwú-ọṅù.


Merem amara, Jehova; n'ihi na onye taworo aru ka m'bu: Mem ka m'diri ndu, Jehova; n'ihi na ọkpukpum nile nāma jijiji.


Obi nke nāṅuri ọṅu nēme ka aru di nma: Ma mọ madu nke etib͕uru etib͕u nāmikọ ọkpukpu.


Onye nēkpuchi njehie-ya nile, ọ gaghi-agara ya: Ma onye nēkwuputa ha, nke nārapu kwa ha, agēnwe obi-ebere n'aru ya.


Umu-gi ndikom atubọwo atubọ, dina ala n'isi èzí nile, dika anigọ mara n'ọnyà; ha bu ndi juputara n'ọnuma Jehova, na ibasi-nba-ike Chineke-gi.


N'ihi ajọ omume nke urù-ya ka M'were iwe, we tie ya ihe, nēzobe irum nēwe kwa iwe: o we nāga nēchighari azu n'uzọ nke obi-ya.


Ayi nāb͕ọ uja dika bear, ayi nile, ọ bu kwa dika nduru ka ayi nēkwosi ákwá ike: ayi nēle anya ikpé ziri ezi, ma ọ digh: ayi nēle anya nzọputa, ma ọ di anya n'ebe ayi nọ.


Juda ejewo ibiri n'ala ọzọ site na nweda-n'ala, na site n'iba-uba nke ọbubu-orù; Ya onwe-ya ebiriwo n'etiti mba nile, ọ chọtaghi izu-ike: Ndi nile ndi nāchu ya chukuru ya n'ebe di nkpà.


O mewo ka anu-arum na akpukpọ-arum ka nká; Ọ b͕ajiwo ọkpukpum nile.


Ọzọ, mb͕e m tikuru Chineke nkpu, O mechibido ekperem uzọ.


Ha ejighi kwa obi-ha tikuem, kama ha nākwasi ákwá ike n'elu ihe-ndina-ha: n'ihi ọka na manya-vine ọhu ka ha nāchikọta onwe-ha, ha nēwezuga onwe-ha imegidem.


Ha we chiri ọkpukpu-ha, lìe ha n'okpuru osisi tamarisk nime Jebesh, bue ọnu ubọchi asa.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan