Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Abụ Ọma 21:3 - Bible Nso

3 N'ihi na I ji ngọzi nke ọdi-nma zute ya: I nātukwasi okpu-eze nke ọla-edo anuchara anucha n'isi-ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

3 I ji ngọzị bara ụba nabata ya, ọ bụkwa okpueze e ji ọlaedo a ṅụchara nke ọma kpụọ ka i kpukwasịrị ya nʼisi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Abụ Ọma 21:3
16 Iomraidhean Croise  

O we kpupu okpu-eze nke eze-ha n'isi-ya; ọtùtù-ya bu otù talent ọla-edo, nkume di oké ọnu-ahia di kwa ya; o we di n'isi Devid. O weputa-kwa-ra ihe-nkwata obodo ahu, nke riri nne nke-uku.


Ndikom Juda we bia te Devid manu n'ebe ahu ibu eze ulo Juda. Ha we gosi Devid, si, Ndikom Jebesh-gilead bu ndi lìri Sọl.


Ndi-okenye nile nke Israel we biakute eze rue Hebron; ha na eze, bú Devid, we b͕a ndu nime Hebron n'iru Jehova: ha we te Devid manu ibu eze Israel.


Devid we kpupu okpu-eze nke eze-ha n'isi-ya, we hu na o ruru otù talent ọla-edo n'ọtùtù, nkume di okè ọnu-ahia di kwa nime ya; o we di n'isi Devid: o weputa-kwa-ra ihe-nkwata obodo ahu, nke riri nne nke-uku.


Ma ub͕u a, bilie, Jehova, bú Chineke, ba n'ebe-izu-ike-Gi, Gi onwe-gi na ib͕e nke ike-Gi: Jehova, bú Chineke, ka ndi-nchu-àjà-Gi yiri nzọputa dika uwe, ka ndi-ebere-Gi ṅuri kwa ọṅu n'idi-nma.


Ònye buru uzọ nyem, nke M'gākwughachi? Ihe ọ bula nke di n'okpuru elu-igwe nile, nkem ka ọ bu.


Ha nābia n'irum n'ubọchi nhuju-anyam: Ma Jehova burum ihe-ndabere.


Ayi gēti nkpu ọṅù na nzọputa-Gi, Ọ bu kwa n'aha Chineke-ayi ka ayi gākwuba ọkọlọtọ-ayi nelu: Jehova mezue aririọ-gi nile.


Le ka ezi ihe-Gi si ba uba, nke I tukọbaworo nye ndi nātu egwu Gi, Nke I luworo nye ndi nāb͕abà nime Gi n'iru umu madu!


Chineke nke eberem gābia izutem: Chineke gēme ka m'lekwasi ndi nēchem anwu anya.


ma-ọbu ònye buru uzọ nye Ya, agēnyeghachi kwa ya ọzọ?


Ma-ọbu ì nēlelì àkù nke obi-ọma-Ya na nke nnagide-Ya na nke ogologo-ntachi-obi-Ya, ebe i nāmaghi na ọlu obi-ọma Chineke nēdubà gi na nchèghari?


Onye agọziri agọzi ka Ọ bu, bú Chineke na Nna nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, Onye were ngọzi nile ọ bula nke Mọ Nsọ gọzie ayi n'ebe di n'elu-igwe nime Kraist:


Ma Onye ahu Nke emere Ya ka ọ di kari ndi-mọ-ozi ala nke-ntà, bú Jisus, Ya ka ayi nēle anya, na ejiwo ebube na nsọpuru kpube Ya n'isi dika okpu-eze n'ihi ahuhu nke ọnwu, ka O we site n'amara Chineke detu ọnwu ire n'ihi madu nile ọ bula.


Anya-Ya abua buru kwa ire ọku, Ọ nēkpu kwa ọtutu okpu-eze n'isi-Ya; O nwe-kwa-ra aha edeworo, nke ọ nādighi onye ọ bula matara, ma-ọbughi Ya onwe-ya.


Samuel we were mpi manu ahu, te ya n'etiti umu-nne-ya: Mọ nke Jehova we nādakwasi Devid n'ike site n'ubọchi ahu ga n'iru. Samuel we bilie, la Rema.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan