Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Mu onwem gēwere kwa ufọdu n'ọnu-ọnu osisi cedar di elu, kua ya; n'ọnu alaka-ya nke wara ọhu ka M'gākubipu alaka di nrò, Mu onwem gāku kwa ya n'elu ugwu di elu nke atuliri elu:
Ma n'ubọchi-ha, bú eze ndia, ka Chineke nke elu-igwe gēme ka otù ala-eze bilie, nke agaghi-emebi emebi rue mb͕e abighi-ebi, ọ bu kwa ọbubu-eze-ya ka anāgaghi-arapuru ndi ọzọ; ọ gētipia ala-eze ndia nile me ka ha gwusia, ma ya onwe-ya gēguzosi ike rue mb͕e ebighi-ebi.
Otú a ka Jehova siri: Alaghachiwom na Zaion, M'gēbi kwa n'etiti Jerusalem: agākpọ kwa Jerusalem Obodo ezi-okwu; agākpọ kwa ugwu nke Jehova nke usu nile ndi-agha Ugwu nsọ.