Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Abụ Ọma 13:4 - Bible Nso

4 Ka onye-irom we ghara isi, Akariwom ya n'ike; Ka ndi-nkpab͕um we ghara iteghari egwú ọṅù mb͕e anēwezugam n'ọnọdum.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

4 mgbe ahụ onye iro m ga-asị, “Emeriela m ya,” mgbe m ga-ada, ndị kpọrọ m asị ga-aṅụrịkwa ọṅụ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Abụ Ọma 13:4
17 Iomraidhean Croise  

Chinekem, na Gi ka m'tukwasiworo obi, Ekwela ka ihere mem; Ekwela ka obi ndi-irom tọ ha utọ n'arum.


Ha gēbuso kwa gi agha; ma ha agaghi-enwe ike imegide gi: n'ihi na gi ka M'nọyere, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), inaputa gi.


Madu agaghi-eguzosi ike site na nmebi-iwu: Ma nkpọrọgwu ndi ezi omume, agaghi-eropu ya.


Nání Ya onwe-ya bu oké nkumem na nzọputam: Ọ bu ulo-elum; agaghi-ewezugam n'ọnọdum.


N'ihi na asirim, Ka ha ghara iṅuri ọṅu n'arum: Mb͕e anēwezuga ukwum n'ọnọdu-ya, ha mere onwe-ha ka ha di uku imegidem.


Ndi Kenean na ndi nile bi n'ala nka gānu kwa ya, we b͕a ayi buruburu, bipu aha-ayi n'uwa: ọ̀ bu kwa gini ka I gēmere aha uku Gi?


N'ihi ihe ndia ka mu onwem nākwa ákwá; anyam, anyam nērùda miri; N'ihi na onye-nkasi-obi nke nēweghachi nkpuru-obim di anya n'ebe m'nọ; Umum tọb͕ọrọ n'efu, n'ihi na onye-iro di ike.


N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi agaghi-ewezuga ya n'onọdu-ya: Ihe-ncheta ebighi-ebi ka onye ezi omume gābu.


Nání Ya onwe-ya bu oké nkumem na nzọputam: Ọ bu ulo-elum; agaghi-ewezugam n'ọnọdum ri nne.


Tukwasi Jehova ihe O nyeworo gi dika ibu, Ya onwe-ya gānagide kwa gi: Ọ gaghi-ekwe ka ewezuga onye ezi omume n'ọnọdu-ya rue mb͕e ebighi-ebi


Ekwela ka ha si n'obi-ha, Ehe, nka bu ọchichọ nkpuru-obi-ayi: Ekwela ka ha si, Ayi elodawo ya.


Ekwela ka ndi-irom, bú ndi-okwu-ugha, ṅuam ọǹu: Ekwela ka ndi nākpọm asì mb͕e m'nēmeghi ihe b͕ue iku-anya.


Ọ siwo n'obi-ya, Chineke echezọwo: O zobewo iru-Ya; ọ dighi mb͕e Ọ huru ya.


Bilie, Jehova; ekwela ka madu di ike: Ka ekpe mba nile ikpe n'iru Gi.


Ma ub͕u a na mb͕e dika nwa ntabi-anya amara esitewo n'aka Jehova, bú Chineke-ayi, ime ka ndi b͕apuru ab͕apu fọduru ayi, na inye ayi otù ǹtú n'ebe nsọ Ya, ka Chineke-ayi we nye anya-ayi ìhè, na idebere ayi nwantī ndu n'ọbubu-orù-ayi.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan