Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Abụ Ọma 13:3 - Bible Nso

3 Legide anya, zam, Jehova, Chinekem: Nye anyam abua ìhè, ka m'we ghara iraru ura ọnwu;

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

3 Lekwasị m anya, ma zaa m, O Onyenwe anyị Chineke m. Nyeghachi m ìhè nke anya m ka m ghara ịnwụ;

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Abụ Ọma 13:3
15 Iomraidhean Croise  

Ma ub͕u a na mb͕e dika nwa ntabi-anya amara esitewo n'aka Jehova, bú Chineke-ayi, ime ka ndi b͕apuru ab͕apu fọduru ayi, na inye ayi otù ǹtú n'ebe nsọ Ya, ka Chineke-ayi we nye anya-ayi ìhè, na idebere ayi nwantī ndu n'ọbubu-orù-ayi.


Hu nweda-n'alam, dọputam; N'ihi na echezọghm iwu-Gi.


N'ihi na Gi onwe-gi gāmuye oriọnam: Jehova, bú Chinekem, nēme kwa ka ọchichirim nwue enwu.


Hu ndi-irom, n'ihi na ha di ọtutu; Ha ji ikpọ-asi nke na-eme ihe-ike kpọm asi.


Ka m'tegharia egwú ọṅu, ṅuri kwa ọṅu, n'ebere-Gi: N'ihi na I huwo nweda-n'alam; I mawo nkpuru-obim n'ahuhu di iche iche:


Ge nti n'okwu-ọnum, Jehova, Ghọta ntughari-uchem.


Merem amara, Jehova; Hu nweda-n'alam nke sitere n'aka ndi nākpọm asì, Gi Onye nēbulim elu site n'ọnu-uzọ-ama ọnwu;


N'okpom-ọku-ha ka M'gēme ọṅuṅu-manya nile ha, mee ka ha ṅubiga manya ókè, ka ha we ṅuria ọṅu-agha, raru ura ebighi-ebi, ghara iteta; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


M'gēme kwa ndi-isi-ya, na ndi-ya mara ihe, na ndi-ya nāchi ala, na ndi-ya nọchiri anya eze, na ndi-dike-ya, ka ha ṅubiga manya ókè; ha gāraru kwa ura ebighi-ebi, ghara iteta; ọ bu ihe si n'ọnu Eze ahu puta, Jehova nke usu nile nke ndi-agha bu aha-Ya.


Jehova, cheta ihe ruworo ayi aru: Legide anya, hu ita-uta-ayi.


Ìhè agēkpughere mba nile ọzọ, Na ebube ndi-Gi, bú Israel.


N'ihi nka Ọ si, Teta, gi onye nāraru ura, Si kwa na ndi nwuru anwu bilie, Kraist ahu gāmukwasi kwa gi.


Anyanwu ma-ọbu ọnwa adighi kwa obodo ahu nkpà, ka ha mukwasi ya: n'ihi na ebube Chineke nyere ya ìhè, oriọna-ya bu kwa Nwa-aturu ahu.


Ma Jonatan anughi mb͕e nna-ya b͕ara ndi Israel iyi: o we setipu ọnu-ọnu nkpa-n'aka nke di n'aka-ya, rutu ya nime ub͕ub͕ọ-manu-aṅu, weghachi aka-ya n'ọnu-ya; anya-ya we nwue enwu.


Jonatan we si, Nnam emekpawo ala-ayi aru: biko, lenu na anyam enwuwo enwu, n'ihi na edetuwom nwantī manu-aṅu nka ire.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan