Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Abụ Ọma 127:2 - Bible Nso

2 Ọ buru unu ihe-efu, unu ndi nēbili n'isi-ututu, ndi nāla azu n'inọdu ala, Ndi nēri nri nke ihe-nb͕u di iche iche: Otú a ka Ọ nēnye ndi Ọ huru n'anya ura.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

2 Ọ bụ nʼefu ka ị na-ebili nʼisi ụtụtụ na-adọgbu onwe gị nʼọrụ ịchọta ihe ị ga-eri ruo nʼabalị, nʼihi na ọ na-eme ka ndị niile ọ hụrụ nʼanya hie ụra nʼudo.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Abụ Ọma 127:2
17 Iomraidhean Croise  

I gātukwasi kwa obi, n'ihi na olile-anya di; I gēnyocha kwa, were ntukwasi-obi dina.


Mu onwem dinara ala, raru ura; Etetaram; n'ihi na Jehova nākwagidem.


N'udo ka m'gēji otù mb͕e ahu dina ala, raru ura: N'ihi na Gi onwe-gi, Jehova, nání Gi, nēme ka m'biri na ntukwasi-obi.


Ka ewe dọputa ndi I huru n'anya, Were aka-nri-Gi zọputa, za kwa ayi.


Ngọzi Jehova, nke ahu nēme madu ọgaranya, Ọ dighi-atukwasi kwa ya ihe-nwuta.


Ahuwom ọlu nile nke aluworo n'okpuru anyanwu; ma, le, ihe nile bu ihe-efu na ichọ ijide ifufe.


Ọ di otù onye nke nání ya di, ọ dighi kwa onye abua ọ nwere; ọ dighi kwa nwa ma-ọbu nwa-nne o nwere; ma ọ dighi nsọtu diri ndọb͕u-ya nile ọ nādọb͕u onwe-ya n'ọlu, afọ adighi-eju kwa anya-ya n'àkù. Ọ nāsi, Ọ̀ bu kwa n'ihi onye ka mu onwem nādọb͕u onwem n'ọlu, we me ka ezi ihe kọnari nkpuru-obim? Nka bu kwa ihe-efu, e, nweda-n'ala jọrọ njọ ka ọ bu.


Ihe utọ ka ura nke onye nāla ọlu ubi bu, ma ọ bu ihe ntà ma-ọbu ihe riri nne ka o nēri: ma afọ-ojuju nke ọgaranya adighi-ekwe ya araru ura.


Ndọb͕u nile madu nādọb͕u onwe-ya n'ọlu diri ọnu-ya, ma otú ọ di, ọchichọ nkpuru-obi adighi-eju eju.


Mb͕e nka gasiri m'we teta, we hu; uram we tọm utọ.


Mu na ha gāb͕a kwa ọb͕ub͕a-ndu udo, M'gēme kwa ka ajọ anu-ọhia kwusi n'ala-ha: ha gēbi n'ọzara na ntukwasi-obi, raru ura n'oké ọhia.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan