Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Abụ Ọma 127:1 - Bible Nso

1 Ọ buru na Jehova ewughi ulo, N'efu ka ha dọb͕uworo onwe-ha n'ọlu nime ya, bú ndi nēwu ya: Ọ buru na Jehova echeghi obodo, N'efu ka onye-nche muruworo anya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

1 Ọ bụrụ na Onyenwe anyị ewughị ụlọ, ndị na-ewu ya na-adọgbu onwe ha nʼọrụ nʼefu. Ọ bụrụ na Onyenwe anyị echeghị obodo, nʼefu ka ndị nche na-amụ anya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Abụ Ọma 127:1
35 Iomraidhean Croise  

Jehova nye-kwa-ra Solomon amam-ihe, dika Ọ gwara ya; udo we di n'etiti Hairam na Solomon; ha abua we b͕a ndu.


Ub͕u a le anya; n'ihi na Jehova arọputawo gi iwu ulo ibu ebe nsọ: di ike, me ya.


Devid we si Solomon nwa-ya, Di ike, nwe kwa ume, me ya: atula egwu, atu-kwa-la ujọ: n'ihi na Jehova Chineke, bú Chinekem, nọyere gi; Ọ gaghi-ara gi aka, Ọ gaghi-arapu kwa gi, rue mb͕e i jezuru ozi nile nke òfùfè ulo Jehova.


nye kwa Solomon nwam obi zuru okè, idebe ihe nile I nyere n'iwu, na ihe-àmà-Gi nile, na ukpuru-Gi nile, na ime ihe ndia nile, na iwu ulo uku ahu, nkem'doziworo ihe bayere ya.


Jehova ka m'kpọkuru n'ahuhu dirim, O we zam.


M'gēweli anyam abua le ugwu nile: Òle ebe iye-akam gēsi bia?


Aṅuririm ọṅu mb͕e ha nāsim, Ka ayi je n'ulo Jehova.


Gi ka m'gēweli anyam abua le, Gi Onye nānọdu ala n'elu-igwe.


Asi na ọ bughi Jehova Nke diri ayi, Biko, ka Israel kwue otú a, si;


Ndi nātukwasi Jehova obi Dika ugwu Zaion, nke anādighi-ewezuga ya n'ọnọdu-ya, kama rue mb͕e ebighi-ebi ka ọ nādigide.


Mb͕e Jehova mere ka ndi nālata na Zaion lata, Ayi di ka ndi nārọ nrọ.


Chineke, nye eze ikpé-Gi nile, Nye kwa nwa eze ezi omume-Gi.


O we wue ebe nsọ Ya dika ebe di elu, Dika uwa nke Ọ tọrọ ntọ-ala-ya rue mb͕e ebighi-ebi.


Obi madu nēchè uzọ-ya: Ma Jehova nēme ka nzọ-ukwu-ya guzosie ike.


M'laghachiri, hu n'okpuru anyanwu, na ọ bughi ndi nwere ukwu ọsọ ka iwu-ọsọ diri, ọ bughi kwa ndi di ike ka agha diri, ọzọ kwa, ọ bughi ndi mara ihe ka nri diri, ọzọ kwa, ọ bughi ndi-nghọta ka àkù diri, ọzọ kwa, ọ bughi ndi-ǹkà ka amara diri; kama mb͕e na ihe-ndaputa nādabàra ha nile.


Ndi-nche ndi nējeghari n'obodo buruburu hurum: M'we si ha, Ùnu ahuwo onye ahu nke nkpuru-obim huru n'anya?


Ndi-nche ndi nējeghari n'obodo buruburu hurum, Ha tirim ihe, b͕uem mma; Ndi-nche mb͕idi nile nke obodo chipuru ákwà-nb͕ochim n'arum.


Mu onwem, Jehova, bu onye-nche-ya; na mb͕e nile ọ bula dikasiri ntà ka M'nēdè ya miri: ka onye ọ bula we ghara iji ihe ọjọ leta ya, abali na ehihie ka M'nēche ya.


Ndi-nche-ya bu ndi-ìsì, ha nile amaghi ama; ha nile bu nkita dara ob͕i, ha apughi ib͕ọ uja; ha bu ndi nārọ nrọ, nēdina ala, nāhu itu-òrù-ura n'anya.


N'elu mb͕idi-gi nile, Jerusalem, ka M'doworo ndi-nche; ogologo ubọchi nile ehihie na abali, mb͕e nile, ha agaghi-edebe ọnu-ha du: unu ndi nēchetara Jehova ihe, unu ederela du,


Bulienu ọkọlọtọ n'ebe mb͕idi nile nke Babilon di, menu ka nche sie ike, menu ka ndi-nche guzosie ike, dozienu uju nēru nbì; n'ihi na Jehova ezubewo me kwa ihe O kwuru megide ndi bi na Babilon.


Otù ọb͕a-ọsọ gāb͕a ọsọ izute ọb͕a-ọsọ-ibe-ya, otù onye-ngosi gāb͕a kwa ọsọ izute onye-ngosi-ibe-ya, igosi eze Babilon na ewerewo obodo-ya na nsọtu-ya:


ma ọ buru na emeghi ka Kraist si n'ọnwu bilie, ya mere ihe ayi nēkwusa bu ihe-efu, okwukwe-unu bu kwa ihe-efu.


Ya mere onye nāku abughi ihe ọ bula, onye nākwọsa miri abughi kwa ihe ọ bula; kama Chineke, Onye nēme ka ọ nāba uba, bu ihe nile.


Anamatu egwu unu, ma o nwere uzọ ọ bula m'dọb͕uworo onwem n'ọlu n'aru unu n'efu.


Ma i gēcheta Jehova, bú Chineke-gi, n'ihi na Ya onwe-ya bu onye nēnye gi ike imeta àkù; ka Ọ we me ka ọb͕ub͕a-ndu-Ya guzosie ike, nke Ọ ṅuru nna-gi-hà iyi imere ha, otú ọ di ta.


Ewe gwa eze Jeriko okwu, si, Le, ndikom batara n'ebe a n'abali a sitere n'umu Israel ileputa ala-ayi.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan