Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Abụ Ọma 11:2 - Bible Nso

2 N'ihi na, le, ndi nēmebi iwu nāzọ uta-ha ukwu ikwe ya, Ha edoziwo àkù-ha n'elu eriri-uta, Ib͕a ndi obi-ha ziri ezi n'ochichiri.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

2 Nʼihi na ndị ajọ omume ekweela ụta ha; ha edoziela àkụ nʼelu eriri ụta ha, zoo onwe ha nʼakụkụ ụzọ, ịnọ nʼọchịchịrị, gbaa ndị obi ha ziri ezi ụta.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Abụ Ọma 11:2
18 Iomraidhean Croise  

Site na npako nke onye nēmebi iwu ka anāchu onye ewedara n'ala ọku ọku; Anējide ha na nzube nile nke ha chère.


Jehova, me ndi di nma nma, Me kwa ndi ziri ezi n'obi-ha nma.


Mb͕e mọm nēnweghi ike nimem, Gi onwe-gi mara okporo-uzọm. N'uzọ nke m'nēje ije nime ya ka ha zobeworom ib͕udu.


N'ihi na I gēme ka ha b͕akuta azu, I gēji udọ̀-uta-I dozi àkú imegide ha n'iru.


Ṅurianu ọṅu na Jehova, teghari-kwa-nu egwú ọṅù, unu ndi ezi omume: Ti-kwa-nu nkpu ọṅù, unu nile ndi ziri ezi n'obi.


Ndi nēmebi iwu amiputawo mma-agha, zọ kwa uta-ha ukwu ikwe ya; Ime ka onye ewedara n'ala na ob͕eye da, Ib͕u ndi ziri ezi n'uzọ-ha:


Onye ezi omume gāṅuri na Jehova, b͕abà kwa nime Ya; Ndi nile ndi ziri ezi n'obi gānya kwa isi.


Ọtam dikwasi na Chineke, Bú Onye nāzọputa ndi obi-ha ziri ezi.


Ọ buru na madu echigharighi, Ọ gāmu mma-agha-Ya ka ọ di nkọ; Ọ zọwo uta-Ya ukwu ikwe ya, dozie ya ib͕a.


N'ihi na ikpé gālaghachikute ezi omume: Ndi nile ndi ziri ezi n'obi gēso kwa ya.


Aghaworo onye ezi omume ìhè dika nkpuru, Aghawo-kwa-ra ndi ziri ezi n'obi ọṅù.


Ha we kwe ire-ha, dika uta-ha, ib͕a okwu-ugha dika àkú; ma ọ bughi n'ebe ikwesi-ntukwasi-obi di ka ha diworo ike n'ala: n'ihi na ha esiwo n'ihe ọjọ pukuru ihe ọjọ, ma Mu ka ha nāmaghi; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


ha we b͕akọ ìzù ka ha we were aghughọ jide Jisus, b͕ue Ya.


Sọl we si, M'gēnye ya ya, ka o we ghọrọ ya ọnyà, ka aka ndi Filistia we di n'aru ya. Sọl we si Devid, Nke ub͕ò abua ka i gāburum di nwam ta.


Devid we mara na ọ bu ya ka Sọl nēcheputa ihe ọjọ megide; o we si Abaiata, bú onye-nchu-àjà, Chita ephod nso.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan